Agwụ Na Ịrụ Agwụ n'Ala Igbo

Jun 11, 2021 - 22:18
Jun 11, 2021 - 22:29
 0
Agwụ Na Ịrụ Agwụ n'Ala Igbo

Izunna Okafor dere edemede a


Ụgwọ chi onye ụwa ji ya bụ ịgbara ọgụ n'ọha mmadụ na n'ọha mmụọ. Nke a bụ maka na chi onye na nkwenye onye na-edu onye. Ọ bụkwa ihe onye na-akpọku bụ chi ya.

Ka ọ dị taa n'ala Igbo, ọ na-abụ oge ụfọdụ, mmadụ na ibe ya kwukarịa okwu, ọ sị ya na ọ dị ka agwụ ọ na-akpa ya. Mana nke kacha nke ma bụrụkwa eziokwu bụ na ọtụtụ n'ime ndị na-ekwu ihe a na-ekwu ya maka na ha nụrụ ya n'ọnụ ndị ọzọ; ọtụtụ n'ime ha amaghị ihe bụ agwụ na ihe bụ agwụ ịkpa mmadụ. Tupu mmadụ ọbụla aghọta ihe bụ agwụ ịkpa mmadụ, onye ahụ ga-ebu ụzọ ghọta ihe bụ agwụ, maka na a naghị esi ofe ọgbọnọ n'ejighị ọgbọnọ. Nke a ka o jiri dị mkpa ịkọwa ihe bụ agwụ.

Gịnị bụ agwụ?

Agwụ bụ otu n'ime ihe dị iche iche ndị Igbo kwenyere na ya, ma bụrụkwa nkwenye dịbara gboo, wee ruo taa. Ọzọ bụkwa na agwụ bụ mmụọ, maka na ihe ọbụla mmadụ ahụghị anya maọbụ metụ ya aka bụ mmụọ. Ọ dịkwa mkpa ịkọwa na agwụ abụghị ịgwọ ọgwụ, n'agbanyeghị na agwụ bụ mmụọ.

Dịka nkwenye ndịigbo siri dị, Agwụ bụ mmụọ na-edu onye (bụ nke ụfọdụ na-akpọ 'Guardian Angel' na bekee, n'agbanyeghị na e wetụrụ ihe olenaole dị iche). Agwụ bụkwa mmụọ na-agbazi omume onye ọbụla. Ihe nke a pụtara bụ na onye ọbụla nwèrè agwụ nke ya, bụ mmụọ na-edu, ma na-agbazikwa omume ya na ihe na-eme na ndụ ya oge ụfọdụ, dịka nkwenye ndị Igbo siri dị.

Agwụ nwere ụzọ abụọ o si akpa ike maọbụ egosipụta onwe ya na ndụ mmadụ. Oge ụfọdụ, ọ na-abụkwa o gosipụtachaa onwe ya n'otu ụzọ, o gosipụtaba n'ụzọ nke ọzọ. Nke mbụ n'ime ụzọ abụọ a bụ na agwụ nwere ike igosipụta onwe ya n'ụzọ ọma. Ihe nke a pụtara bụ na agwụ nwere ike ime ka ihe mmadụ na-eme na-agara ya siriri-werere, mekwa ka mmadụ na-enwe chi ọma maọbụ ihu ọma na ọganihu. Agwụ nwekwara ike ime ka mmadụ nwee ezi nchekwa na 'ọdụụla', nke na-eme na ebe ndị ọzọ gachaara tọkịrị, na onye ahụ nwere ike ịpụta ebe ahụ gafèéré onwe ya n'enweghị ihe ọbụla mere ya; maọbụ mekwa na mmadụ nwere ike ịnọgide n'otu ebe, mana ngwangwa o si ebe ahụ pụọ, ihe ọdachi emee n'ebe ahụ.

Agwụ nwekwara ike ime ka mmadụ bụrụ 'ọgwọ nnụ ọrịa', n'agaghị ụlọakwụkwọ ọbụla maọbụ nwee ọzụzụ maka mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ; nkè bụ na onye ahụ bàá ọhịa kpata akwụkwọ maọabụ ahịhịa ọbụla nye onye ọrịa, onye ahụ enwere onwe ya. Agwụ nwèkwàrà ike ime ka mmadụ nwee ọnụ mmụọ, nke na onye ahụ kpeere mmadụ ekpere, kwubie okwu, maọbụa kwupụta ihe ọbụla n'ọnụ ya, ọ màlite ime ozigbo ma bịakwa na mmezu dịka onye ahụ siri kwuo ya. 

Ọ bụ ike a ka ọtụtụ na-ejizị ike a wee bàta n'ụlọụka ma na-emekwa ọtụtụ ihe ịrịbaama (miracles), ebe ọtụtụ na-eji nke ha bụrụ ndị amụma, oke dibịa, dibịa mmiri, maọbụ dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ ma na-emekwa ihe ukwu dị iche iche. Ọ bụ n'ihi ya ka ọtụtụ jiri kwete na dibịa na-ama mmadụ ama, na a naghị amụ ya amụ amụ.

Ihe ndị a niile bụcha ụzọ ọma agwụ si egosipụta onwe ya na ndụ mmadụ. I nwékwara ike kpọọ ya ụzọ ọma agwụ si arụrụ mmadụ ọrụ, maọbụ si eji mmadụ arụ ọrụ.

N'aka nke ọzọ, e nwekwara ụzọ nke abụọ agwụ si egosipụta onwe ya na ndụ mmadụ. Agaghị m akpọ nke a ụzọ ọjọọ, mana nkọwa ya ga-eme ka ị ghọta ya nke ọma. 

Agwụ nwèrè ike igosipụta onwe ya na ndụ mmadụ site n'ịkpasàsị onye ahụ anya, ime ka mmadụ na-akpa aghara, ime onye ahụ aka nkụchasị, ime onye ahụ 'ọba n'aka ọba n'ọnụ' (from mouth to hand), ime onye ahụ ka ego ghara ịdị na-adị ya n'aka, maọbụkwanụ iwètara onye ahụ ndaghachiazụ n'ụdị dị iche iche. Agwụ nwere ike ime mmadụ o ruo n'ebe ibè ya pụtara gaa, ọ tọkịrị.

Agwụ nwere ike ime ka mmadụ na-adabà na nsogbu na mgbe na mgbe, mee ka ihe ọdachi maọbụ ọnwụnwa dị iche iche na-adakwàsị mmadụ, na-emekwa ka ihe ihere na ihe mmebọ na-abịakwasị, nke na e nwere ike a nọgide na mmemme maọbụ n'ebe ndị mmadụ juru, onye ahụ emewakaị otu ihe 'obodo bịa lelee'. Agwụ nwekwara ike ime mmadụ 'omebere ma chi ekweghị ya, onye ụta atala ya'.

Nke kacha njọ n'ihe niile a bụ na agwụ nwèrè ike ime mmadụ ọ na-átà ghaghagha, mee na ya na onye ọzọ agaghị emekọnwu ihe n'enweghị nsogbu ọbụla; maọbụkwanụ o mee onye ahụ ọ na-eme ka onye ara oge ụfọdụ; mana anya dị ya mma. Ọ pụrụ ime mmadụ ọ na-ahụ ihe enweghị isi mmadụ nkịtị anaghị ahụ, maọbụ mee ka ndị mmadụ na-asọ onye ahụ ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ pụrụ iwètàrà onye ahụ, nke nwere ike ime ka mmadụ jụọ onye ahụ 'Nwoke m, i jìzịkwà anya gị?", "Dianyị, kedụzị?", maọbụ "Nna, agwụ ọ nà-àkpá gị?", maọbụ ụfọdụ ajụjụ ndị ọzọ dị añaa, dịka ihe onye ahụ na-eme siri dị.

Mgbe ihe ndị a maọbụ ihe ndị ọzọ yiri ha màlitere mebe na ndụ mmadụ, ezigbo onye Igbo ñụjuru mmiri ara afọ ga-asị 'Mba' ka ọ ga jụọ èsè. Ihe a na-akpọ nke a n'ala Igbo bụ Ịgba Afa, maọbụ Ịgba Afa Agwụ. Ị ga-akpọ ya Ịgba Afa Agwụ ma ọ bụrụ na onye ahụ ma na ọ bụ agwụ na-eme ya ma chọzie ịgba afa iji chọpụta ụdị agwụ ọ bụ maọbụ ihe a ga-eme banyere ya.

Ọ bụrụ na onwe ahụ amaghị ihe na-eme ya cháá-cháá, o wee ga gbaa afa, a gwa ya na ọ bụ agwụ na-akpa ya maọbụ na eme ya ihe ahụ; ihe ọzọ onye ahụ ga-ajụ bụ 'Gịnị ka a ga-eme banyere nke a?".

Kaosiladị, dịka nkwenye ndị Igbo siri dị, ụsà/asịsà ajụjụ a adịghị abụọ. Naanị ụsa e nwere nye nke ahụ bụ na onye ahụ ga-eme ihe a na-akpọ 'Ịrụ Agwụ'.

Mana ọ bụrụ na onye ahụ amaghị, wee jụọ, e wee gwa ya na ọ bụ ịrụ agwụ bụ mmechakọrọ ya, ihe ọzọ dị mkpa onye ahụ ga-emezị bụ na ọ ga-agbakwa afa ọzọ, iji chọpụta ụdị agwụ ọ bụ. Ihe nke a jiri dị mkpa bụ na ọ bụ mmadụ chọpụta ụdị agwụ na-enye ya nsogbu, o wee mara etu a ga-esi wee rụọ ya bụ agwụ. Agwụ na-awa n'afa, mana ọzọ (ichi ọzọ) anaghị awa n'áfá.

Ihe onye nwere uche ga-ajụzị bụ, Gịnị bụ ịrụ agwụ?

Tupuu akọwaa m ihe Ịrụ Agwụ pụtàrà, etu e si eme ya, ihe e ji eme ya, na onye ọ dịịrị ịrụ agwụ ahụ; ọ dị mkpa ịkọwa na agwụ dị naanị  ótù; ọ bụ ezie na e nwezịrị ụzọ dị iche iche e si arụ ya. Ọ dị ka mmadụ ịma mmọnwụ n'ala Igbo. Iji maa atụ: onye mara mmọnwụ n'obodo m bụ Ebenator dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' nke steeti Anambra amazuola mmọnwụ n'ala Igbo n'iile, nke bụ na onye ahụ etozuola òké ma nwekwazie ike iti mmọnwụ na mpaghara ebe ọbụla n'ala Igbo; maka na ala bụ otu. Ihe nke a pụtara bụ na onye rụrụ agwụ arụọla agwụ, maka na agwụ bụ agwụ; agwụ dịkwà ótù.

Kaosiladị, a bịa n'ala Igbo, e nwere agwụ ikwunne, nwee agwụ ụmụnna, ma nwekwazie agwụ ezinụlọ. Nke a apụtaghị na agwụ ndị a dị iche iche; agwụ bụ otu, dịka m siri kọwaa na mbụ. Mana ndịiche dị ebe ahụ dàbèèrè n'etu e si arụ ya bụ agwụ, onye ọ dịịrị ịrụ ya, na ihe e ji arụ ya.

Ịrụ agwụ bụ omenala a na-emere onye agwụ na-akpa, bụ onye agwụ mara, onye agwụ na-enye nsogbu, maọbụ onye agwụ na-egosipụta na ndụ ya, ọkachasị onye ọ na-egosipụta na ndụ ya n'ụdị dị añaa. Chetekwa na ekwuru m na mbụ na e nwere ụzọ abụọ agwụ si egosipụta na ndụ mmadụ. Ịrụ agwụ bụ omenala a na-emere onye agwụ na-egosipụta na ndụ ya n'ụdị nke abụọ n'ime ụzọ abụọ ahụ m gwara gị na mbụ, maka na mkpà dibịa a naghị akpà onye ahụ dị.

Ịrụ agwụ nọ ọdụ ka ịkpàchi mmụọ ọjọọ na-akpa ike ọjọọ na ndụ mmadụ maọbụ na-enye mmadụ nsogbu, ka ọ kwụsị ịkpa ike ọjọọ. Ọmụmaatụ kachara dị mma iji kọwaa ịrụ agwụ bụ mmadụ bịa ebe idè mmiri na-enye nsogbu n'ụlọ ya, ọ kpọọ ndị ma anya ya, ha akpàchie idè mmiri ahụ inye nsogbu n'ụlọ ya, rụọrọ ya ụzọ ọ ga-esi na-aga, ma gwa onye ahụ ihe ọ ga na-eme iji wee na-echukwa ya, ka o wee na-aga etu ahụ ọ chọrọ ka o si na-aga.

A bịa n'ịrụ agwụ n'ala Igbo, onye ọ dịịrị ịrụ agwụ dàbèèrè n'ụdị agwụ a na-arụrụ mmadụ, dịka dibịa gbara afa agwụ ahụ siri kwuo. Ihe e ji arụ agwụ dàbèrèkwàrà n'ụdị agwụ a na-arụ, maka na o nwere ike ndị a jiri otu okeọkpa na ji atọ na-arụ agwụ, ndị ọzọ ejiri okeọkpa abụọ maọbụ atọ wee na-arụ nke ha.

Ọ bụrụ na ọ bụ agwụ ikwunne ka dibịa gbara n'afa na ọ bụ ya na-enye onye ahụ nsogbu, ị mara na ọ bụ nnaochie onye ahụ (onye si n'ebe onye ahụ mụrụ nwadiala) ga-arụrụ ya agwụ;  ọ bụrụ na ọ bụ agwụ ụmụnna na-enye ya nsogbu, ị mara na ọ bụ onyeisi agwụ n'ụmụnna onye ahụ ga-arụrụ ya agwụ; mana ọ bụrụ na ọ bụ agwụ ezịnụlọ, ị mara na ọ bụ onyeisi agwụ n'ezinụlọ onye ahụ ga-arụrụ ya agwụ. Onyeisi agwụ bụ onye buru ụzọ rụọ agwụ n'ime ndị ka nọ ndụ n'ụmụnna maọbụ n'ezinụlọ ahụ. Ọ bụghị iwu na onye ahụ ga-abụ okenye; o nwere ike bụrụ nwata.

Ụbọchị ahụ a na-arụrụ onye ahụ agwụ kpọmkwem, opekatampe, ótù nnaochie ya rụrụ agwụ ga-anọrịrị ya, maka akaebe, na ịnọchite anya ndị ikwunne. Ụbọchị ahụ, onye ahụ a na-arụrụ agwụ ga-atụ aka ma wepụta ebe ọ ga-eji mere ihu agwụ. Ọ bụ n'ebe ahụ ka a ga-anọ wee dọtuo anyanwụ na ezeelu; dọtuo, ma rụọrọ ya agwụ. 

Chetekwa na agwụ nwere ike ịma nwoke maọbụ nwaanyị; okenye maọbụ nwata. Ọ bụrụ na onye ahụ bụ nwoke, ebe ahụ onye ahụ ga-eji mere ihu agwụ ga-adịrịrị n'ala obi ya. 

Kaosiladị, ọ bụrụ na e dubèghị onye ahụ obi maọbụ nye ya ala obi, onye ahụ nwèrè ike iji ebe dị nso n'akụkụ ihu agwụ nke nna ya wee mere ihu agwụ nke ya. Mana ọ bụrụ na e mechazie duo ya obi, o nwere ike ibugharịzị ihu agwụ ya buga ya n'ebe ala obi ya dị, bụkwa nke o nwere ike iji obere mmemme wee mechàkọlọta, site n'iji okeọkpa, ọjị, na ihe ndị ọzọ, dàbere n'ole ike aka ya hà.

Omenala ịrụ agwụ kpọmkwem na ihe e ji arụ agwụ:

Ọtụtụ mmadụ nwere ike ịrụ agwụ otu ugboro n'otu oge na n'otu ụbọchị, mana onye ọbụla ga-ewete ihe nke ya e ji arụrụ ya agwụ. Ọ dị ka ịma mmụọnwụ, maka na mmadụ abụọ maọbụ karịa nwere ike ịma mmọnwụ otu ugboro na otu ụbọchị, mana onye ọbụla ga-ewèta ihe nke ya. A ga-emekwara onye ọbụla omenala nke ya.

A bịa ụbọchị ahụ a na-arụ agwụ, e nwere ihe ndị bụ 'a hụghị ebule ma sị elina dike'. Ihe ndị a bụ ihe ndị dị oke mkpà ma bụrụkwa iwu na a ga-ewèterịrị ha, dịka omenala ịrụ agwụ siri dị. Ha gụnyèrè ọjị, ose ọjị/ose akpị, èdò, nzu, ọmụnkwụ, ogirisì, àkpà agwụ, nkwụ elu, ji, ụkwa (ụkwa e siri esi na nke a gwọrọ agwọ) ighū, okụkọ (okeọkpa) a ga-eji mee ya bụ omenala na ụfọdụ ihe ndị ọzọ. Ụfọdụ ndị ji ego nwekwara ike gbuo ewu maọbụ ehi. E jighị nkịta maọbụ anụ nkịta arụ agwụ.

Kaosiladị, ihe onye/ndị rụụrụ mmadụ agwụ na-anara onye ahụ wèrè ike ọ gaghị abụ otu ihe. Ụfọdụ ndị ụmụnna nwèrè ike na-eji otu okeọkpa na otu mba ji were arụrụ mmadụ agwụ ụmụnna; ebe ndị ikwunne nwere ike na-ana okeọkpa anọ na mba ji abụọ wee na-arụrụ ndị nwadiala ha agwụ. Ya bụ na ọ dàbèèrè n'ụdị agwụ onye ahụ na-arụ na ndị na-arụrụ ya agwụ ahụ. 

Ọ bụkwa ụkwa na ji bụ nri e ji arụ agwụ. E jighị osikapa, àgwà, indomí, spagetì maọbụ nri ọgbaraọhụrụ ndị ọzọ were arụ agwụ. 

Ihe mere o jiri bụrụ ụkwa na ji bụ nri e ji arụ agwụ bụ na ji bụ ézè ihe a kọrọ n'ugbo, nke mere e ji akwanyere ya ùgwù n'ụzọ pụrụ ichè. A bịa na nke ụkwa, ụkwa so na nri ndị Igbo ji eme omenala dị iche iche, maka na ọ bụ ụkwa ka e ji adọtu ụfọdụ mmụọ dị iche iche n'ala Igbo, dịka mmụọ agwụ, mmụọ okpensi, wee dịrịzie gaba. A na ejikwa ighū were arụ agwụ, mana ighū anaghị adịkarịzị nso n'ụfọdụ mpaghara ala Igbo ugbua, e wee na-esizị naanị ji na ụkwa. Mana onye hụrụ ighū nwèkwàzịrị ike isi ya. 

Ọ dịkwa mma ịkọwa na a naghị eji nnekwu, uriòm, ọkụkọ oyibo/ọkụkọ agiriiki maọbụ mmanya waịnụ ọgbara ọhụrụ were eme omenala ịrụ agwụ kpọmkwem. Ọ sọgodi ya bụrụ na nkwụ elu adịghị nnukwu maọbụ na ụkwà ehighị nne ebe ahụ a na-arụ agwụ, nwaobere metụhàá n'ihu agwụ ahụ, e wee kwubie okwu, o zuola ihe a na-eme.

Ka e si arụzị agwụ kpọmkwem bụ na a bịa ụbọchị ahụ, onye ahụ a na-arụrụ agwụ ga-ewètecha ihe ndị a m kpọpụtasịrị. A bịa n'ebe ahụ o jiri mere ihu agwụ, onye ahụ na-arụrụ ya agwụ ahụ ga-agọ ọjị, tụọ nzu, èdò na ose ọjị, ma bụọ mmanya  ọkụ n'ebe ahụ, iji dọtuoro ya ágwụ ma kpọkuo ndị mbụ na ndị ègèdè. Ọ ga-atụkwa ụkwà na ji ebe ahụ. O mechaa ya, nnaochie onye ahụ ga-atụkwara ya nzu na èdò ma gọọrọ ya ọfọ ebe ahụ. Nnà mụrụ onye ahụ a na-arụrụ agwụ ahụ ga-emekwa otu ihe ahụ, maka na ọ bụ ya kwụdòòrò ya ka ọ rụọ agwụ ahụ.

Nke ahụ gachaa, onye ahụ na-arụrụ mmadụ agwụ gà-egbunye ya mkpọrọ osisi ogirisi atọ a pịara ọnụ, o were ha kpọnyesie n'ala n'ihu agwụ ya ahụ, ma na-ekwubì okwu banyere ihe ọ chọrọ ka agwụ ya meere ya na ihe ọ chọrọ ka o gbòchiere ya, mgbe ahụ ọ na-akpọnye osisi ogirisi ahụ n'ala. Onye ahụ na-arụrụ ya agwụ ga-enye ya osisi ogirisi atọ ahụ ugboro atọ ụzọ atọ (ya bụ osisi ogirisi iteghete). Ọ ga-ekwubicha okwu dịka ọ na-akpọnye ha niile n'ala.

Ọ bụrụ na nke ahụ gachaa, nnaochie ya ga-akpọnyekwara ya ogirisi n'ihu agwụ ma kwubie okwu ọma n'isi ya. O mechaa nke ahụ, onye ahụ na-arụrụ ya agwụ ga-akpọnyekwa osisi ogirisi atọ n'ala ma kwubikwara ya okwu ọma. Nke gachaa a na-egburu onye ahụ ọkụkọ agwụ (okepkpa) ma gbusa ọbara ya/ha n'ihu agwụ ahụ na n'ihu ihe anọ na-adị n'akpà agwụ. A na-ekwubikwa okwu ma na-akpọkukwa ndị mbụ na ndị egede dịka a na-egbu ya bụ ọkụkọ. 

Nke ahụ gachaa, a na-asaghesi ọmụnkwụ ma rụnye ya n'ihu agwụ ahụ, ma werekwa ugbele ọkụkọ olenaole sitere n'ọkụkọ ahụ e gbugasịrị ebe ahụ manyesie/kechisie ha n'ọmụ ahụ. 

Ọ bụrụ na e mechaa nke ahụ, a na-ebupute akpa agwụ onye ahụ, bụ àkpà e jiri ute wee kpàá. Mana a naghị ebupute ya bụ àkpà na nkịtị. Onye ahụ a na-arụrụ agwụ na-etinye ego masịrị ya n'ime akpa ahụ. Mana ọ bụ ndị rụrụ agwụ ahụ nọ ebe ahụ nwe ya bụ ego. Ọ bụrụ na a gọzichaa ya bụ àkpà agwụ, onye na-arụrụ ya agwụ ahụ ga-etinyesi ihe anọ ahụ na-adị n'ime ya ma nyefèé ya n'aka onye a na-arụrụ agwụ.

Ọ na-abụ a tụchapụ nkịta akọrọ, e gosighị ya, ọ dị ka a tụrụ ya mbọ. Ọ bụ nke a mere e ji ebunye onye a rụụrụ agwụ àkpà agwụ. Ya bụ na akpa agwụ na-egosi ihe akaebe na ihe ịrịbaama na a rụọrọla onye ahụ agwụ, maka na dibịa enweghị àkpà agwụ nọ n'ọnọdụ ofeke n'anya ndị mmụọ.

Ihe na-adị n'akpa agwụ bụ ihe anọ a tụrụ àtụ. Ha bụ: ọfọ agwụ, ikenga agwụ, na 'ụkwụ na ijè'. 'Ụkwụ na ije' na-adị abụọ — oke na nwunye. Ihe anọ ahụ nwèchàra ihe ha na-arụ na ndụ onye ahụ. 

Ọfọ agwụ bụ ọfọ onye ahụ a rụụrụ na-enwe dịka ọfọ ya kpọmkwem. Ọ bụ ezie na ihe anọ a na-adị n'ime àkpà agwụ ahụ, a naghị edebe ọfọ agwụ n'ala maọbụ n'ebe mmiri ga na-ama ya. Ọ bụ n'elu ka a na-ekonye maọbụ debe ya. Ọ bụ nke a mere oge ụfọdụ, mmadụ na-ama mmadụ ibe ya njakịrị sị ya na nkịta buuru maọbụ kpụrụ ọfọ nna ya; maọbụ, ọ kwàá onye ahụ iyi sị ya nkịta burukwa/kpụrụkwụ ọfọ nna ya. Mana nke bụ eziokwu bụ na nkịta enweghị ike iburu maọbụ kpụrụ ọfọ onye ma ihe, maka na ọ bụ n'elu ka onye ma ihe na-edebe ọfọ ya. Ya bụ na onye a gwara na nkịta buuru ọfọ nna ya bụ nnukwu mkparị ka e nyere ya na nna ya, maka na ihe nke ahụ gosiri bụ na anya erughị nna ya ala, maọbụ na onye ahụ amaghị ihe, maka nà ọ maghị omenala, nke mere o jiri debe ọfọ ya n'ala maọbụ debe ya ebe nkịta ga-enwe ike iburu ya. Chetekwa na agwara m gị na a na-egbusa ọbara ọkụkọ agwụ n'elu ọfọ agwụ, nke mere na nkịta hụ ya ebe e debede ya, na ọ ga-eji maka isi ọbara ahụ wee buru ya. Ya bụ na ịgwa mmadụ 'Nkịta kpụrụkwụ/burukwụ ọfọ nna gị' bụ ajọ okwu ekwesighị ka e were ya na-egwu egwu n'ala Igbo. Igbo na-asịkwa na ọ bụrụ na ọfọ adịghị ìrè, e debere nkịta. Ọmara asụ, sụọ n'ikwe.

Ọzọkwa, nsọ ọzọ dịịrị ọfọ bụ na nwaanyị anaghị emetụkwa ya aka. Ọ bụrụ na a chọọ onye nwe ọfọ ahụ, a hụghị ya, maọbụ ọ bụrụ na ọ nọghị nso, nwaanyị (ọsọgodi ya bụrụ nne ya maọbụ nwunye ya maọbụ nwanne ya nwaanyị) enweghị ike imetụ ọfọ ahụ aka, ma ya fọdụzie iwetù ya ebe ọ dị. Ọ dịka nwaanyị ịtụtụ ọjị n'ala Igbo. Nwaanyị anaghị atụtụ ọjị n'ala Igbo. Ọ bụrụ na ọ hụ na ọ jị ya dara, ọ ga-aga chọọ nwoke, ọsọgodi ya bụrụ obere nwatakịrị nwoke ka ọ bịa tụụtara ya ọjị ahụ. Ọ bụkwa etu ahụ ka ọ dị n'ihe gbasaara ọfọ. 

Ọ bụrụ na onye nwe ọfọ ahụ anọghị nso, mana e nwere ihe dị añaa a chọrọ iji ọfọ ya wee mee, ihe nwaanyị ahụ ga-eme bụ na ọ ga-akpọ ụmụ ya ndị nwoke ma gosi ha ebe ọfọ ahụ dị, ka ha wee wetuo ya, ka e were mee ihe a chọrọ iji ya mee. Aka nwaanyị agaghị emetụkwa ya.

A naghịkwa ebu ọfọ agwụ maọbụ àkpà agwụ were apụ ọrụ oyibo maọbụ ga biri na mba ọzọ. Nke a bụ maka na e kwesiri ịdị na-ahịakwa maọbụ na-echukwa agwụ ahụ echukwa; mana a gaghị enwe ike ichukwa ya ma ọ bụrụ na ọfọ ya na akpa agwụ ya adịghị nso n'ebe ihu agwụ dị. Ihe ọzọ o jiri dị mkpa idebe ya n'ụlọ bụ na ọ bụrụ na e nwee ka ihe siri dị maọbụ mee mgbe onye ahụ anọghị nso, onye nọ nso enwee ike iji akpa agwụ ya meere ya ihe n'ihu agwụ ya. Ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na mmadụ were ọfọ ya mee njem, o nwere ka ọsọ ga-esi chụba, onye ahụ nwere ike gbaba ọsọ chefuo maọbụ gbaghàá ya ebe ahụ, wee gbaba ọsọ ndụ. 

Kaosiladị, ọ bụrụ na o nwee ka o siri dị na a hụghịzị ọfọ ahụ, onye nwe ya maọbụ ndị dị ndụ nwèrè ike ime ihe a na-akpọ igbuchi ọfọ; nke pụtara ịkwagharị ọfọ ọzọ/ọfọ ọhụrụ. Nke ahụ apụtaghị na onye ahụ ga-arụgharị agwụ ọzọ; naanị ọfọ ka ọ na-egbuchi. Ọ bụrụkwa na a chọọ ọfọ ụmụnna, maọbụ ọfọ ezinụlọ, a hụghị ya, ụmụnna maọbụ ndị ezinụlọ ahụ nwekwara ike igbuchi ya ma ọ bụrụ na ha ghọtara mkpa ọ dị na uru ọ baara ha. Mana, chetekwa na mmadụ apụghị igbuchi ọfọ nna ya ma ọ bụrụ na onye ahụ ebughị ụzọ rụọ agwụ; maka na onye enweghị ọfọ anaghị egbuchiri onye nke ya furu efu.

Onye chọrọ igbuchi ọfọ nna ya ga-ebugodi ụzọ rụọ agwụ, nwee ọfọ nke ya, jide ya n'aka, tupu o nwee ike igbuchi nke nna ya. Ihe ndị a bụ maka urù ọfọ bàrà na ihe ọ na-arụ na ndụ onye nwe ya, ndụ ezinụlọ, maọbụ ndụ ụmụnna. Ọ bụrụ na ihe mee ọfọ (ọkachasị ọfọ ụmụnna na ọfọ ezinụlọ), ọ bụrụ na e gbuchighị ya egbuchi, ọ na-enyekwa nnukwu nsogbu, ma na-nwekwa ike iwètà ọnwụ ike na ọtụtụ ihe ọdachi ndị ọzọ oge ụfọdụ. Nke ahụ wee bụrụ maka ọfọ, dịka o siri metụta ihe na-adị n'àkpà agwụ.

Ikenga agwụ, na 'ụkwụ na ije' (bụ ihe ndị ọzọ na-adịkwa n'akpa agwụ) nwèchàkwàra ihe ha na-arụ na ndụ onye ahụ, ebe ọ na-aga, na n'ihe dị iche iche ọ na-eme, ọkachasị ịkwàrà onye ahụ ụzọ, ichekwa onye ahụ, na ime ka ihe na-agara ya siriri werere, mekwa ka ije ya na-aga nke ọma.

Ọ bụrụ na e tinyechaa ihe anọ a n'ime akpa agwụ ahụ, oge ahụ a rụchara ya bụ agwụ, onye ji ọdụ mọabụ mpì ehi nwere ike gbuchatụọ ya; e wee tụzie nzu ikpeazụ; ị mara na ihe a na-ekwu ebiela. A rụchaala agwụ. A ga-amalitezị ribe oriri ma ñụba mmanya. Chetekwa na agwara m gị na ọ bụ nri ụkwa na ji ka e ji arụ agwụ; ebe nkwụ elu bụ mmanya a na-añụ ma jirikwa ya na-eme omenala ahụ kpọmkwem. Kaosiladị, ọ bụrụ na nkwụ elu ezughị ọnụ, ngwangwa e jiri nke obere a gbatara wee mee omenala ịrụ agwụ ahụ kpọmkwem n'ihu ala, e nwekwàzịrị ibute ụdị mmanya ndị ọzọ kebezie ndị mmadụ ma e bido iri oriri.

A na-ejikwa ọkụkọ ahụ e jiri wee rụọ agwụ wee sie ji mmiri ọkụ, ma buputekwara ndị mmadụ, kerisie ya ka onye ọbụla taba anụ ma ribe ji. Mana tupu a malite ikerisi ya maọbụ ịta anụ ahụ, a na-ewere obi ọkụkọ ahụ na ji wee gaa n'ihu agwụ onye ahụ ma tụpere ya, tụpụsịa n'ihu agwụ ahụ, iji nye ya bụ mmụọ òkè nke ya. Onye ahụ a rụụrụ agwụ ahụ na-esòkwa aga. A na-ekwubìkwa okwu dịka a na-eme nke ahụ. Ọ bụrụ na e mechaa nke ahụ, a na-amalitezị kesàbara onye ọbụla nọ ebe ahụ ji na anụ ọkụkọ ahụ. 

Onye ọbụla nọ ebe a rụrụ agwụ nwee mmasị, ọ ga-eso wee rie ma ñụọ ihe ọñụñụ ma rie ihe oriri dị iche iche e kesàrà ebe ahụ. N'ọtụtụ obodo n'ala Igbo, anụ ọkụkọ e jiri wee rụọ agwụ anaghị efo chi; a na-ericha ha niile ụbọchị ahụ a rụrụ agwụ. A na-enyekwazị nnaochie onye ahụ rụrụ agwụ ji ndụ ọ ga-eji wee laa.

Chetekwa na agwara m gị na o nwere ụzọ abụọ agwụ si agosipụta onwe ya na ndụ mmadụ na mmalite edemede a. Ọ bụrụ na a rụchaara mmadụ agwụ, ihe ọjọọ ndị ahụ na-emebụ na ndụ onye ahụ ga-ahapụzị ya, ebe ihe anaghị agabụ nke ọma ga-amalitezị gaba nke ọma na ndụ ya. Nchịkọta ya bụ na agwụ ga-amalitezị igosipụta onwe ya na ndụ onye ahụ n'ụzọ ọma, bụ ụzọ nke mbụ m kọwaara gị agwụ si egosipụta na ndụ mmadụ oge m malitere edemede a. 

N'eziokwu, agwụ bụ nnukwu ihe na nkwenye ndị Igbo, n'agbanyeghị na ụfọdụ ndị mmadụ na-emezị na ha na-eje ụka ugbua, wee jirizie maka ya na-eleghara ọtụtụ ihe ndị a anya; ihe wee na-emebisizị; maka na onye amaghị ebe mmiri siri bido maba ya agaghị ama ebe ọ ga-akwụsị ya.

Dịka nkọwa niile a na edemede a siri dị, ọ dị nchọpụta na ọtụtụ uru dị na mmadụ ịrụ agwụ. Agwụ na-emepere mmadụ ụzọ, agwụ na-ewètere mmadụ ihu ọma, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ.

Mana mmadụ ịkpọchi ntị ma hapụkwa ime ihe ọbụla banyere agwụ na-akpa ya nwékwàrà ike iwètara onye ahụ ọtụtụ ihe ọjọọ na ndụ ma kpuchiere onye ahụ ihe ọma, nke na o nwere ike iwetèkwara onye ahụ ọnwụ ike, ma ọ bụrụ na o meghị ihe ọbụla banyere ya.

Nke a mere o jiri dị mkpa na onye ọbụla ihe dị añaa na-eme na ndụ ya kwèsiri ka ọ ga gbaa afa, mara na ọ bụ agwụ na-eme ihe ahụ. Agwụ nwere ike bido igosipụta na ndụ mmadụ n'agbanyèghị ahọ ole onye ahụ bụ; maọbụ n'agbanyeghị na onye ahụ ọbụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị. Mkpụrụọgwụ maọbụ ntụtụ anaghị akwụsị agwụ. Ịrụ Agwụ bụ mmechakọrọ agwụ.

Agwụ bụ nkwenye Ndị Igbo. Agwụ abụghi ihe ọjọọ. Agwụ dị ìrè. Agwụ na-awa na-afa. Agwụ na ịrụ agwụ bàkwàrà ọtụtụ uru n'ala Igbo. Onye ihe na-eme gaa jụọ èsè, ka o wee mara ihe na-eme ya; maka na ọ bụ ụkwụ ka e ji achọ ihe dakpuru mmiri. Dibịa anaghị agwụ ara bụ ya okenye.

Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya. Mana, onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ; o mee emee ọ hụ ahụ.

Omenala Igbo ga-adịrị.

Ndeewo.

© Izunna Okafor, 2021.

**************************************************

Maka Onye Dere Edemede a


Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenator dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.

Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016;  Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka onye nta akụkọ, ọ rụọla n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ dị iche iche, ma bụrụkwa onye edemede na onye ntaakụkọ n'Igbo Radio.

Izunna Okafor na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484