N'Anambra: Ihe Mberede Okporoụzọ Ataala Isi Otu Onye, Merụọ Ndị Ọzọ Ahụ

Jan 22, 2020 - 20:56
Jan 24, 2021 - 01:51
 0
N'Anambra: Ihe Mberede Okporoụzọ Ataala Isi Otu Onye, Merụọ Ndị Ọzọ Ahụ

Izunna Okafor, Awka

Ọ bụ nnọọ ihe anya mmiri na akwa àrịrị dịkà nnukwu ihe mberede okporo ụzọ dị egwu dapụtàrà na mpaghara Enugwu-Agịdị nke okporoụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha na steeti Anambra, tàrà isi otu onye, ma tinyekwa mmadụ atọ ndị ọzọ n'ajọ ọnọdụ ihe mmerụ ahụ.

Ya bụ ihe mberede okporo ụzọ ka e kwuru na o metụtàrà ụgbọala atọ, nke gụnyere ụgbọala Honda SUV nwéré akàrà efere GGE 309 FK, ụgbọala na-ebu íbú, nwere akàrà efere AWK 922 XJ, ya na otu ụgbọ òlòkó na-ebu mmadụ ọkụ, nwere akara efere NKJ 789 XA.

Nke ahụ bụzị nke dọtara mgbata ọsọ ndị ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ije awele n'okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC),' ndị ọrụ uwe ojii, ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ, nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, bụ ndị a hụrụ n'ebe ahụ ya bụ ihe nọrọ mee, ka ha na-arụ ọrụ ma na-enyegasị aka n'ụzọ dị iche iche iji mee ka ọnọdụ kawanye mma.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, onye na-ahụ maka ịkụziri ọhanaeze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọ ọrụ FRSC, bụ Maazị Pascal Anịgbo ma kwuo na ọ bụ enweghị ndidi, ya ụgbọala iji ọsọ gbafee ibè ya wètàrà ihe mberede ahụ.

O mere ka a mara na ọ bụ oge onye na-ànyà nnukwu ụgbọ oloko ahụ chọrọ ka ọ gbanahị ụgbọala ogologo ahụ na-ebu ibu, ka o jizịrị ike wee kwòkaịrị ma kwọrikọọ obere ụgbọala ahụ na-agara onwe ya, ma gbuokwa onye na-ányà ya, bụ otu nwaokorobịa jupụtàrà n'ume na ndụ.

Ụgbọala ahụ na-ebu mmanụ ọkụ ka e kwùrù na ọ dàkwàrà ma sụtọba isi n'ala, ebe mmanụ ọkụ o bù màlìtèkwàra gbafùsibe n'ala ebe ahụ niile, bụzị nke mere ka ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ wère gwarụkọọ ya, maka ibinwùrù ọkụ maọbụ mee ka ọnọdụ kawanye njọ.

Maazị Anịgbo kwùrù na ha adọnyela ozu nwa amadi ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu, ma bujekwa ndị ahụ nwetara mmerụ ahụ n'ụlọ ọgwụ, ebe ha nọzị anara ọgwụgwọ ugbua.

Ọ kpọkùzịkwàrà ma dụọ ọhanaeze ka ha na-akpachàpụ anya, na-adị uchu, ma na-enwekwa ndìdì oge ọbụla ha na-anyà ihe ọnyịnyà, iji zèéré ihe mberede okporoụzọ ịdapụta n'ụdị ọbụla, maka na ọ bụ eje ala bụ ísí ijè.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.