Nwoke Arụọrọla Nwunye Ya Ụlọ Na-Atụgharị Atụgharị Oge O Mechara Ọtụtụ Mkpesa

Oct 15, 2021 - 22:35
 0
Nwoke Arụọrọla Nwunye Ya Ụlọ Na-Atụgharị Atụgharị Oge O Mechara Ọtụtụ Mkpesa


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka o nwetechaara ọtụtụ mkpesa dị icheiche site n'aka nwunye ya, otu nwoke, Vokin Kusic arụọrọla nwunye ya ụlọ na-atụgharị atụgharị

Nwoke ahụ, onye bụkwa mmadụ ji aka ya na-echepụta ma na-arụpụta ihe ọhụrụ, mèrè ka a mara na o teela nwunye ya jiri nyebe ya nsogbu, ma na-ekpesa na etu ihu ụlọ ha dị amasịghị ya maọbụ tọọ ya ụtọ, n'ihi na ọ bụ naanị otu ụdị ihu ka o nwere; ma kwuo na ọ chọrọ ụlọ nwere maọbụ ná-egosi ọtụtụ ihu, bụkwa ebe ọ ga-anọ wee na-elegharị anya, na-ahụ anwụ na ndò na ihe ọbụla ọ chọrọ ịhụ n'otu oge, na-ahụkwa ndị mmadụ  na ụgbọala na-agafe agafè.

N'ajụjụọnụ ndị nta akụkọ gbara ya, Maazị Kusic, onye gbara ahọ iri asaa na abụọ kwukwazịrị na ọ bụ mkpesa ahụ na nsogbu ahụ nwunye ya nyegidere mèzịrị o jiri kpebie ma kwe nkwà ịrụrụ ya ụlọ na-atụgharị atụgharị, ka o wee kwụsị inye ya nsogbu, ma nwekwa ike ịdị na-efegharị, na-agbàgharị ma na-atụgharị ụlọ ahụ ka o siri masị ya.

Ụlọ ahụ pụ́rụ́ iche bụ nke a rụrụ n'obodo Srbac, dị na mbà 'Bosnia and Herzegovina'. Ọ na-efegharị ruo mita asaa, ma na-agbanwèkwa agbanwe, si n'igosi ugbõ bàá n'igosi ọhịa, si na ya bàá n'igosi mmiri, tinyere ihe ndị ọzọ ụdịdị ya na-egosi oge ọ na-atụgharị.

Kusic gara n'ihu kọwaa na ụlọ ahụ ga-atụgharị gburugburu n'ime áwà iri abụọ na anọ ma o jiri nwayọ wee tụgharịa, ma tụgharịa gburugburu zuru òkè n'ime tịnkọm tịnkọm iri abụọ na abụọ ma ọ tụgharịa ngwangwa.

O kwuru na ịrụ ụlọ ahụ wèrè ya ahọ isii tupu ọ rụchaa ya, ma e wezùga oge ọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ n'ihi nsogbu o nwere n'óbì. O kwuru na ụlọ ahụ kara ụlọ nkịtị wee sie ike, ọkachasị n'ihe metụtara iguzogide nsogbu ala ọmajijiji na-ebibi ọtụtụ ụlọ nkịtị.

Ọ sị na ọ rịọrọ dọkịta ya ka ọ gbatịwanyekwuo ndụ ya ruo (opekatampe) otu ahọ, ka o wee rụtọpụrụ nwunye ya ụlọ ahụ, na ọ bụrụ na ọ nwụrụ, ị mara na o nweghị onye ọbụla ọzọ ga-ama wee rụchapụ ụlọ ahụ.

O kwukwazịrị na obi dị ya ụtọ na ọ rụchaala ụlọ ahụ ugbua, ka nwunye ya wee kwụsị inye ya nsogbu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484