Ọñụ Adaa Dịka Gọọmenti Anambra Gbàpèrè Ụzọ Ọhụụ n'Onneh

Sep 9, 2020 - 22:10
Jan 28, 2021 - 22:10
 0
Ọñụ Adaa Dịka Gọọmenti Anambra Gbàpèrè Ụzọ Ọhụụ n'Onneh

Izunna Okafor

Oke ọñụ dàrà na nsonso a n'obodo Onneh dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Orumba South' nke steeti Anambra, dịka gọọmenti steeti ahụ gbàpèrè ọmarịcha okporo ụzọ ọhụụ n'obodo ahụ. Ya bụ okporo ụzọ ọhụụ bụ nke a rụrụ site n'aka otu nwa amadi ọrụ obi ebere na-echu ụra n'obodo ahụ, bụ Maazị Vincent Nwanko, ma bụrụkwa nke ọ rụchaara ma chọọ ya mma nke ukwuu.

Mmemme ịgbape ụzọ ahụ bụ nke  dọtara Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma na steeti ahụ, bụ Maazị C-Don Adịnụba.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Obianọ fọrọ ekele n'ụkpa wee bunye nwa amadi ahụ rụrụ ya bụ ụzọ, maka iji akụnụba ya wee cheta ndị obodo ya, wee gbatara ha ọsọ enyemaka ma belatara ha ihe nhịaahụ ha na-agabiga n'oge mbụ, site n'irụ ma tee okporo ụzọ ahụ.

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ọrụ dị iche iche ọchịchị ya rụgoro n'obodo dị iche iche na steeti ahụ iji kwalite ọnọdụ mmepe zuru òkè, ma chètakwara ha na obodo ahụ bụ Onneh enwebụghị okporo ụzọ e tere ete, wee ruo mgbe ya onwe ya bàtàrà n'ọkwa ọchịchị, o wee rụọ ma teere ha okporo ụzọ, nke mezịrị ka ha nwee okporo ụzọ e tere ete taa, wee tinyekwuoro nke a Maazị Nwanko tere ọhụụ.

O mere ka a mara na ọrụ mmepe obodo abụghị nke e kwesiri ịhapụrụ naanị gọọmentị, Gọvanọ Obianọ kpọkuo ndị Anambra ka ha na-ewelataru akụ ha ụlọ ma ñomie nwa ezi ọrụ ahụ Maazị Nwanko rụrụ. 

N'okwu nke ya oge ọ na-agbape ya bụ okporo ụzọ (bụkwa nke a kpọkwàsịrị aha Vincent Nwanko), Kọmishọna na-ahụ maka ihe e ji enyere ndụ aka, bụ Maazị Emeka Ezenwanne mere ka a mara na obodo ọbụla na steeti ahụ enwetala ma ka na-enwetakwa nkusa ume ọchịchị Gọvanọ Obianọ, ma kpọkuo obodo ọbụla ka ha na-echekwaba ihe dị iche iche gọọmenti rụnyesịrị n'obodo ha, maka ndị ajọ mmadụ ibibì ha. 

Ògbò ya nke na-ahụ maka ahụike, bụ Dọkịta Vincent Okpala kèlèrè nwa amadi ahụ maka ezi ọrụ ahụ, ma kpọpụtasịkwa ihe gọọmenti megoro na ngalaba ahụike steeti ahụ. Ọ kpọkùkwàrà ndị aka ji àkụ na steeti ahụ ka ha debànye aha ndị obodo ha ihe n'atụmatụ ahụike steeti ahụ, bụ atụmatụ 'Anambra State Health Insurance Scheme'.

Na nzaghachi, ya bụ nwoke obi ọma rụrụ okporo ụzọ ahụ, Maazị Nwankwo kwuru na ọ rụrụ okporo ụzọ ahụ, iji bèlata ahụhụ ndị obodo ya na-ata n'ịga n'okporo ụzọ ahụ, ma sịkwa na ebumnobi ọzọ o jiri mee nke ahụ bụ iji nyere gọọmenti aka n'ọrụ mmepe, n'ihi na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja.

Onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Uchechukwu Mmaduike maka ọrụ mmepe ya dị iche iche, nke obodo ahụ sigoro na ya rite ọtụtụ úrù, ma kelekwa nwa amadi ahụ rụrụ okporo ụzọ ahụ maka icheta ndị obodo ya.

Okporo ụzọ ọhụụ ahụ bụ nke dị ọkara kilomita, ma bụrụkwa nke a kpọkwasàrà aha Vincent Nwanko.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.