Chimamanda Ngozi Adiche eturugo ugo edemede na Amerika

Chimamanda Ngozi Adiche eturugo ugo edemede na Amerika
: :

Nwa-afọ ala Igbo a ma ama maka ide akwụkwọ eturula ugo National Critics Book na mba Amerịka. Adiche nwetere nturu-ugo a maka akwụkwọ ahụ o dere nke a kpọrọ Americanah. Adiche kọrọ akụkọ nwata nwanyị onye Nigeria, hapụrụ ala nna ya gawa mba Amerịka maka ịgụ akwụkwọ.

N'afọ 2008, akwụkwọ Adiche, Half of a Yellow Sun, nwetere ya nturu-ugo Orange Prize na mba Britain.