A Ga-Arụcha Ma Gbapee Ọrụ Niile M Ji n'Aka Tupu Ọchịchị M Agwụ — Obianọ

Jun 7, 2021 - 20:09
 0
A Ga-Arụcha Ma Gbapee Ọrụ Niile M Ji n'Aka Tupu Ọchịchị M Agwụ — Obianọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwela nkwà na ọ ga-arụchapụ ma gbapee agadaga ọrụ ngo niile o ji n'aka na steeti ahụ tupu oge ọchịchị abịa n'isi njedobe.

Gọvanọ Obianọ kwupụtàrà nke a oge ọ gara njem nleta n'ebe dị iche iche o jigasị ọkpụrụkpọ ọrụ n'aka na steeti ahụ, nke gụnyere ogige ụlọ ezumeezu mba ụwa ọ na-arụ na steeti ahụ a maara dịka 'International Conference Center (ICC)', na ogige ama egwuregwu ahụ ọ na-arụ n'Akwa bụ isi obodo steeti ahụ, bụ nke a kpọrọ 'Awka City Stadium'.

N'okwu ya n'ebe ahụ, ya bụ Gọvanọ kwupụtara ma gosipụta afọ ojuju ya banyere etu ọrụ ahụ si aga, ọkachasị etu e si arụ ya ọsọọsọ, ma kwupọtanwòó ezi mkpebi ya na njikere ya ime Anambra ka ọ gaa n'ihu ịnọ n'ogoogo dị elu karịa ka o zutere ya oge ọ batara n'ọkwa ọchịchị n'ahọ asaa gara aga.

Dịka ọ na-ekele ndị na-ahazi ọrụ ahụ, Obianọ kọwara ogige abụọ ahụ dịka nke ga-abara steeti ahụ, ụmụafọ ya nakwa ala Nigeria n'izugbe úrù n'ụzọ dị iche iche ma a rụchaa ha, ma kwezie nkwa na a ga-arụcha ma gbapee ogige abụọ ahụ na ọrụ ndị ọzọ o ji n'aka na steeti ahụ n'oge a tụrụ anya.

Na mbụ n'okwu ya oge ọ na-edugharị Gọvanọ na ndị soro ya wee bịa n'ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ewumeewu ụlọ na steeti Anamba, bụ Maazị Mike Okonkwọ nyere nkọwa dịgasị mkpa banyere ọrụ ahụ, etu ha si aga, ogoogo e ji arụ ha nakwa etu ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, dịka o siri metụta ogoogo ọrụ nọ na ya ugbua n'ebe ahụ.

Kọmishọna Okonkwọ, onye kwuru na a kụchaala gbamgbam n'ụlọ ezumeezu ahụ, gàkwàrà n'ihu kọwapụtasịa ihe dị iche iche a rụnyere n'ogige ahụ, bụ ihe ndị mere ya ka ọ bụrụ ejiamaatụ, mekwa ka a mara na ebe ahụ ga na-ekwo èkwò oge niile ma na-adọtakwara gọọmenti steeti ahụ ego oge niile ma a rụchaa ya, n'ihi na e nwekwara ụfọdụ ihe ndị ọzọ a ga na-eme n'ebe ahụ, n'abụghị naanị ọgbakọ. 

Onye ji ọrụ ngo ahụ, bụ Kọntraktọ Mark Tu nyèkwàrà nkọwa nke ya banyere etu ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ebe ha rụdobere, akụrụngwa e butesigoro nà ihe ndị ọzọ dị ebe ahụ ha ga-amalite ịrụ n'oge adịghị anya, ma kwe nkwa na ha ga-agbasi mbọ ike ịrụchapụ ya bụ ọrụ n'oge a tụrụ anya.

Ụfọdụ ndị dị iche iche soro Gọvanọ Obianọ wee bàgide na njem nleta ọrụ ahụ gụnyèrè onyeisi ndị eze ọdịnala mpaghara ọgbọ nta nkwàdo 'Anambra South' ma bụrụkwa eze ọdịnala Ezinifite dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South', bụ Igwe Samuel Obika; ògbò ya nke mpaghara 'Anambra Central' ma bụrụkwa eze ọdịnala Obeledu, bụ Igwe Augustine Oragwam; tinyere ògbò ha nke mpaghara 'Anambra North', ma bụrụkwa eze ọdịnala Ụmụeri, bụ Igwe Ben Emeka, nà ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n'ọrụ gọọmenti. 

Ndị eze ọdịnala atọ ahụ kèlerè Gọvanọ Obianọ maka ezi ọrụ dị iche iche ọ rụgoro na steeti ahụ, kpee ka Chineke gọzie ya mmaji kwuru mmaji, ma kwezie na ha na ndị ha na-achị agaghị ada mba n'inye ya nkwàdo kwesiri ekwesi na ikpere ya ekpere oge niile.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484