Achbishọọpụ Okeke Arụọrọla Onye Enweghị Aka Ụlọ Ọhụụ Na Nteje

Sep 9, 2020 - 21:38
Jan 28, 2021 - 22:08
 0
Achbishọọpụ Okeke Arụọrọla Onye Enweghị Aka Ụlọ Ọhụụ Na Nteje

Izunna Okafor

Igbo sị na omere onye ogbenye na-emere chi ya, ma sịkwa na ọ hụrụ mma mee nwèrè ụgwọ ọrụ.

N'ịgbaso nke a, Achbishọọpụ ụka katọliiki na mpaghara Ọnịtsha, bụ Achbishọọpụ Valerian Okeke nọrọ na nsonso a wee rụọrọ ma nyefèé ọmarịcha ụlọ ọhụụ n'aka otu nwata nwaanyị bụ onye ikedịnobi (nke ụfọdụ maara dịka ndị ọlụsị maọbụ ndị nwere nkwarụ) n'Ụmụazụ Nteje dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Oyi nke steeti Anambra.

Mmemme ịgbape ụlọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ na nsonso, ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ, nke gụnyere onye na-anọchitebụ anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n'ụlọ omeiwu sineeti ala Nigeria, bụ Maazị Victor Umeh, tinyere ụfọdụ ndị ọrụ ụka, na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu.

Nwata nwaanyị ahụ a rụụrụ ụlọ ahụ bụ Ada Aniwetalu, ma bụrụkwa onye enweghị aka abụọ site n'afọ nne ya, kemgbe e jiri mụọ ya.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ụlọ ahụ, Achbishọọpụ Okeke kwuru na ọ bụ ótù onye ọrụ sista dọtara anya ya na uche ya n'ebe nwata nwaanyị ahụ nọ, tinyekwuoro na ya jiri anya ya hụ ma chọpụta na ya bụ nwata nwaanyị na-emesi ihe ike ma na-agbakwara onwe ya mbọ nke ukwuu, n'agbanyeghị ọnọdụ ahụ ọ hụtara onwe ya na ya kemgbe nne jiri mụọ ya.

O kwuru na ya hụrụ etu nwata nwaanyị ahụ siri jiri mkpụrụ ụkwụ ya wee na-ede ihe, na-eje ozi, na-arụ ọrụ ụlọ, ma jirikwa ya na-emegasịkwa ụfọdụ ihe ndị ọzọ e ji aka eme nke mezịrị o jiri kpebie inyere ya aka ka ọ bụrụ nnukwu mmadụ ma ruo ogoogo ọ chọrọ iru na ndụ a. 

Nke a, dịka o siri kọwaa, mezịrị o jiri rụọrọ nwata nwaanyị ahụ ụlọ ọhụụ ahụ, ma nyekwa ya na enyi ya nwaanyị (bụkwa onye na-enyere ya aka) ohere agụmakwụkwọ n'efù, ruo ogoogo mahadum.

O kelere ndị dị iche iche tinyere aka ma tụnyekwa ụtụ n'ịrụ ụlọ ahụ; mmadụ dịka Maazị Victor Umeh, 'Rev. Fr.' Emmanuel Obimma (Ebube Mụọnsọ), Maazị Ikem Osanakpo, na Maazị Evaristus Ubah, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

Na nzaghachi, ya bụ nwata nwaanyị, onye ọñụ jupụtàra obi, kèlèrè Achbishọọpụ Okeke maka ime ka ihu ọchị waa ya nà itute olileanya ya ọzọ site n'iwuru ya ebe obibi na inye ya na enyi ya nwaanyị olileanya ịga mahadum. O kpekwazịrị ka Chineke nna gọzie ma kwụghachi ya mmaji kwuru mmaji, ya na ndị ọzọ niile nyere aka n'ụzọ dị iche iche n'ime ka nrọ ahụ pụta ìhè.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.