A Tọhàpụ̀lá Nwaanyị Gburu Di Ya Ka Ọ Nọchara Ahọ Ise n'Ụlọnga
Izunna Okafor dere akụkọ a
Otu nwaanyị gbara afọ iri abụọ na iteghete aha ya bụ Olamide Akinbobola, onye gburu di ya site n'ịsụ̀ ya mma oge ha na-alụ ọgụ apụtala n'ụlọnga.
Ka ọ na-ekwu okwu mgbe o nwerechara onwe ya site n'ebe a tụkpuru ya, bụ ‘Kirikiri Female Correctional Facility, Lagos’, Akinbobola kọwàra na ọnụnọ ọ nọrọ ebe ahụ mepere ya anya.
Ọ dị ncheta na nwaanyị ahụ jí ụmụ abụọ, onye nke nọ na-agabiga agha ezinaụlọ n'alụmdinanwunye ya sụ̀rụ̀ di ya, bụ Dare Akinbobola (gbara afọ iri abụọ na asatọ) mma nri n'olu,
n'ebe ha bi n'Ikorodu, steeti Lagos.
Ọ dụrụ ndị na-amalite amalite ka ha gbaa ọsọ na mmekọrịta maọbụ alụmdi ọbụla na-ada aja aja.
Ọ sị: "Gbaa ọsọ ma ọ bụrụ na e nwee agha ezinaụlọ. Nsogbu malitere mgbe m kpebiri ịnọ n'alụmalụ nwere nsogbu. Anọgidere m n'ihi na echere m na ọ ga-adị mma. Ọ bụrụ na m gbara ọsọ oge m nwere ohère ime nke ahụ, akaraghị m ịga nga maọbụ gbuo ya ka m na-azọ onwe m."
Dịka ọ na-ekele Jennichi Foundation maka ịgba mbọ hụ na a tọhapụrụ ya, Olamide kwuru na ọ dịrịghị ya mfe.
Ọ sị: "Anọrọ m afọ ise ebe a. Ihe m gabigara adịghị mfe. Oge ya bụ ihe mere, ọ fọdụrụ obere ka m gbaa ara n'ihi na ọ bụghị ihe m kpachara anya wee mee. Ọ bụrụ na m kpachara anya wee mee ya, akaara m ịgbafu, mana eburu m ya gaa ụlọọgwụ; ma n'ikpeazụ azọtaghị m ya.
“Mgbe m nọ̀ n'ebe ahụ, site na ịgbaume ndị mmadụ, amụtala m inwe ndidi, nnagide na ezi mmekọrịta. Ọ bụghị ihe ọbụla ị hụrụ ka ị ga-ekwu maka ya. Amụkwara m ụfọdụ ọrụaka. Amụrụ m ka e si ákpà isi, amụrụ m ka e si aga biidi.
“Obi bụ m aṅụrị taa na enwerela m onwe m n'ikpeazụ, ma anọ m na mwute n'ihi na di m anwụọla. Ihe merenụ abụghị ihe a kpachara anya wee me, ọ na-ewute m na ọ nọghịzi ndụ. Abụ m nwaanyị ka dị obere, ji ụmụ abụọ. Nkasiobi m nwere bụ ụmụ m."
Otu ọ dị, nwaanyị ahụ kwùrù na ya tinyere ọdịnihu ya n'aka Chineke.
Gbasara ụlọnga ahụ, o tòrò ha dịka o kwuru na ha mere nke ọma, na ha na-enye ha nri ugboro atọ n'ụbọchị, na-enye ha ncha ha ji asa ahụ ma hụkwa na a haziri mmiri ha nke ọma.
Ọ gara n'ihu kwuo na ya anaghị eri eba n'ihe na ya na-arịa ọnya afọ, ma ihe zọrọ ya bụ ego Jennifer Owolabi na-enye ya. O kwuru na e nwere ụlọọgwụ bụ ịgba ebe ahụ, tinyere na a na-enye ha ọgwụ n'efu.
N'ikpeazụ, o kelere Jennifer na ndị niile nọyeere ya.
What's Your Reaction?