Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Mmadụ Isii n'ala Ọnịtsha, Merụọ Ọtụtụ Ahụ

Jun 10, 2020 - 16:06
Jan 26, 2021 - 16:06
 0
Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Mmadụ Isii n'ala Ọnịtsha, Merụọ Ọtụtụ Ahụ

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Anyammiri zòrò ka mmiri n'Ọnịtsha, na steeti Anambra, dịka ihe mberede okporo ụzọ dapụtara ebe ahụ tàrà isi mmadụ isii, ma merụọkwa ọtụtụ mmadụ ahụ.

Ya bụ ihe mmemme, bụ nke mere ụbọchị Tuzdee dapụtara oge otu nnukwu ụgbọala gwongworo nwere akara UMA259XB gbanahịrị onye na-anya ya n'ọsọ, nke na o nweghịzị ike ịkwụsịnwu ya n'ihi na ihe e ji akwụsị ụgbọala bụ breeki ya gharịpụrụ ya; o wee werezie ọsọ sukara ụgbọala ndị ọzọ na Keke Napep na-agara onwe ha, wee kwọrikọọ ndị mmadụ.

Nkọwa bụ nke bịara site n'ozi a kụpụrụ site n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka ije awele okporo ụzọ, bụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', ngalaba ya nke steeti Anambra, bụkwa ozi nke onye na-ahụ maka mgbasa ozi n'ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Paschal Anigbo kụpụrụ n'aha onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Maazị Andrew Kumapayi.

Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, ụgbọala ihe mberede okporo ụzọ ahụ metụtara gụnyèrè Toyota Previa (nwere akàrà ENU849XE), Toyota Precis (nwere akara ENU575ZU), na Toyota Sienna (nwere akàrà JJT434ZF), tinyere Keke Napep abụọ nwere akàrà AAH705UW na AGU482QE, ya na otu ọzọ enweghị akara.

Ozi ahụ gara n'ihu kọwaa na ihe mberede ahụ mètụtara mmadụ iri (nwoke asatọ na nwaanyị abụọ), bụkwazị ndị e bùrù ozigbo gaba n'ụlọ ahụ ike Toronto dị n'Ọnịtsha ahụ. Otu ọ dị, mgbe e ruru ebe ahụ lelechaa ha ahụ, onye ọrụ ahụ ike nọ ebe ahụ kwùrù na mmadụ isii n'ime ha (nwoke ise na otu nwaanyị) anwụọla, ebe mmadụ anọ ndị ọzọ nwetara nnukwu ihe mmerụ ahụ ma na-anarakwa ọgwụgwọ.

Ka ọ na-akpọkù ndị na-anyà ụgbọala ka ha na-akpchapụ anya oge niile ma na-elerukwa ụgbọala ha anya tupu ha eburu ya pụta n'okporo ụzọ; Maazị Kumapayi kasiri ezinụlọ ndị ihe mberede ahụ metụtara obi, ma kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụobi ndị ahụ nwụrụ anwụ ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.