Ụlọ Omeiwu Agwala Gọọmenti Etiti ka O Bulite Ọnọdụ Ọdụ Ugboelu Ibadan

Nov 28, 2019 - 19:28
Jan 24, 2021 - 04:01
 0
Ụlọ Omeiwu Agwala Gọọmenti Etiti ka O Bulite Ọnọdụ Ọdụ Ugboelu Ibadan

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Ụlọ Omeiwu Sinati nọrọ ụbọchị Tuzdee rịọ Ngalaba Gọọmenti Etiti Njem Ụgbọelu dị n'aka na ụlọọrụ ndị ọzọ nkea metụrụ ka ha kwalite ọdụ ụgbọelu Ibadan, Alakia n'ogo mba ụwa ga-enwe akarọngwa ọgba ọhụrụ.

Nkea bụ nke soro dịka Sinatọ Kola Balogun (na-anọchite anya Mgbada Ugwu Oyo siri APC) na ndị Sinatọ iri atọ na asaa gbasara n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ na ngalaba ọchịchị ala anyị kwadoro oge ngụpụta nke ụlọ Omeiwu ahụ.

Onye nọ n'isi atụmatụ ahụ, Balogun kwuru na ọ dịgo mkpa ka ewulite ya bụ ọdụ ụgbọelu ka o were weta mmepe nke si n'ụlọ na mba ndị ọzọ. O kwuru, "Ibadan nwere ihe ga-eweta mmepe na mwulite akụnụba site n'ala anyị na mba ndị ọzọ n'ihi ọtụtụ ụlọọrụ gụnyere Mahadum Ibadan, Ụlọọgwụ Nkuzi Mahadum, Ahịa Mba Ụwa Okerete, Ụlọahịa Bola Ige, bụ ihe ndị aga-ewulite na ebulite ọnọdụ ọdụ ụgbọelu ahụ."

O rụtụkwara aka n'ọnọdụ ọdụ ụgbọelu ahụ na Ibadan ga-enyere ibubata ahịa n'ime Ibadan aka ma wetakwa akụnụba so ya. Balogun onye kwuru na site na ọdụ ụgbọelu Ibadan rue nke Murtala Muhammed, Ikeja ruru kilomita otu narị na iri anọ na asaa, ga-enyere ọnọdụ azụmahịa aka nke ndị gbara mgbọrọgwụ na Lagos ka ha gbasaa.

O kwuru na ala nke gọọmenti wetara maka ọdụ ụgbọelu Ibadan ruru ihe dịka hecta narị ise, iri ise na asaa na ụma, ga-ezu n'uju maka ọdụ ụgbọelu mba ụwa.

Dịka ọ na-etinye ọnụ na ya bụ okwu, Sinatọ Francis Fadahunsi (Ngalaba PDP ọwụwa anyanwụ Osun) kwuru na ọdụ ụgbọelu ahụ, nke a rụrụ na mmalite afọ 1980 enwetaghị mmetụ aka ọ bụla. "Ibadan, nke mmadụ ruru nde isii bi na ya ma bụrụkwa isi obodo mgbaba ugwu ọdịda anyanwụ nke ngalaba ọchịchị ala anyị, kwesịrị ị nwe ọdụ ụgbọelu mba ụwa. Ọ bụ ya bụ sọ nnukwu obodo n'etiti ngalaba ọchịchị ala anyị na-enweghị ọdụ ụgbọelu mba ụwa," ka o kwuru.

Onyeisi Ụlọ Omeiwu ahụ, Ahmad Lawan, gwaziri Kọmitii na-ahụ maka Njem Elu ka ha mee nnyocha nke ọma na ebe o metụtara iwu gbasara atụmatụ ahụ ma wetara ụlọ omeiwu ụsa ha na izuụka asatọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.