Victor Ume Ekesaa Nde Nara Iteghete n'Amụma Ohere Agụmakwụkwọ n'Efu

Sep 22, 2017 - 16:55
Jan 22, 2021 - 07:32
 0
Victor Ume Ekesaa Nde Nara Iteghete n'Amụma Ohere Agụmakwụkwọ n'Efu

Izunna Okafor, Awka

Ezigbo nwaafọ Igbo ọnọdụ ndị mmadụ na-emetụ n'obi, bụ onyeisi otu na-ahụ maka ịhọpụtagharị gọvanọ Willie Obianọ nke ugboro abụọ ma bụrụkwa onyeisi otu pati APGA n'ala anyị n'oge gara aga, bụ maazị Victor Umeh, ekesaana ego dị nde Naịra iteghete nyegara ụmụ akwụkwọ dị iche iche ndị ritara uru n'okpuru amụma agụmakwụkwọ n'efu nke ya bụ nwa amadi na-enye.

Ezigbo nwaafọ Igbo ọnọdụ ndị mmadụ na-emetụ n'obi, bụ onyeisi otu na-ahụ maka ịhọpụtagharị gọvanọ Willie Obianọ nke ugboro abụọ ma bụrụkwa onyeisi otu pati APGA n'ala anyị n'oge gara aga, bụ maazị Victor Umeh, ekesaana ego dị nde Naịra iteghete nyegara ụmụ akwụkwọ dị iche iche ndị ritara uru n'okpuru amụma agụmakwụkwọ n'efu nke ya bụ nwa amadi na-enye.

Ya bụ nkesa ego bụ maka agba agụmakwụkwọ nke a babyere na ya ugbu a ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ na mmemme pụrụ iche a chịkọbara n'obodo ya bụ nwa amadi, bụ Agụlụzigbo dị n'okpuru ọchịchị Anaọcha na steeti Anambra.

Ka ọ na-ekesa ya bụ ego, maazị Victor Umeh kwuru na ya bụ atụmatụ inye ohere agụmakwụkwọ n'efu so n'ezi ihu n'otu n'ime ịgbasi mbọ ike ya, kemgbe ahọ iri gara aga n'ihi na ọ ghọtara ezi mkpa ọ dị, bụ ịkụnye ihe nkụnye n'ime mmadụ. Ọ sị na mmadụ iri na asaa gụchara akwụkwọ n'ahọ gara aga, site n'okpuru amụma ahụ, ma kpọkuziekwa igwe mmadụ ahụ ka ha gaa n'ihu n'inye ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụṅ nkwado, ọkachasị n'ịchị nke ugboro abụọ.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ụka pụrụ iche a kara iji merube ya bụ mmemme, onye ụkọchukwu Sixtus Agụịnam, onye so n'otu n'ime ndị ritagoro uru na ya bụ ohere agụmakwụkwọ n'efu toro maazị Victor Umeh maka ịghọta na ịkụnye ihe n'ime mmadụ bụ ihe kachasị dị mkpa n'ụwa ma sokwa n'otu n'ime ihe na-akwalite ọnọdụ mmepe na ọdịmma. Ọ kpekwazịrị ekpere ka Chineke gaa n'ihu na-agọzi ya bụ nwoke, ọbụnadị ka ọ na-agawanye n'ihu n'ime nke ahụ.

Amụma ohere agụmakwụkwọ n'efu ahụ gụnyere ma ndị nọ n'ogo praịma, ogo sekọndịrị, ogo mahadum, nakwa ogo na-esote ogo mahadum. Ihe dịka mmadụ iri abụọ n'ọnụ ọgụgụ bụkwa ndị nwetara ya bụ ohere n'agba agụmakwụkwọ nke a banyere ugbu a.

Mmemme ahụ dọtara ndị ukwu ndị ukwu dị iche iche, nke gụnyere: onye kọmishịọna steeti ahụ na-ahụ maka omenala, njem nlegharị anya na ihe ndị na-eme na mba ofesi, bụ oriakụ Stella Ọnụọrah, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwado Anaọcha nke mbụ n'ụlọ omebe iwu steeti Anambra, bụ maazị Azubuike Okoye, onyeisi nchere oge n'okpuru ọchịchị Anaọcha, bụ maazị Ikeobi Ejiofor, onyeisi Ọhaneze Ndị Igbo na steeti ahụ, bụ maazị Damian Okeke-Ogene, tinyere ndị ọzọ ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti nakwa ngalaba dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.