Òtù Ọrụ PCFRR Ekesàárala Ndị Iju Mmiri 2019 Metụtara Ihe E Ji Enyere Ndụ Aka

Mar 11, 2020 - 23:28
Jan 22, 2021 - 22:01
 0
Òtù Ọrụ PCFRR Ekesàárala Ndị Iju Mmiri 2019 Metụtara Ihe E Ji Enyere Ndụ Aka

Izunna Okafor, Awka

Òtù a kpọrọ 'Presidential Committee on Flood, Relief and Rehabilitation (PCFRR)' nọrọ nso nso a wee kesàára ndị ahụ ahụ ọnọdụ ijummiri dabidoro n'ahọ 2019 n'Anambra ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka.

Mmemme ibunye ihe ndị ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọọrụ 'Anambra State Emergency Management Agency (SEMA)' dị n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ.

N'okwu ya n'isi ụlọọrụ ahụ oge a na-ekesàra ndị ahụ ya bụ ihe e ji enyere ndụ aka, onye nnọchi anya ndị òtù ọrụ ahụ, bụ Maazị John Owoicho kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka ezi ọrụ ya n'icheta na ichukwa ndị ahụ ya bụ iju mmiri metụtara.

O mere ka a mara na ebumnobi ha jiri kesàra ndị ahụ bụ iji kwàdo agbambọ gọọmenti steeti ahụ ma nyekwara ya aka n'ilekọta ndị ahụ. Ọ kọwara na ọ bụghị ọchịchọ obi ha ka iju mmiri na-awa, mana dịka ha siri hụta ya, kemgbe ahọ 2012, na ya bụ ajọ ọnọdụ ka na-adapụta site n'ahọ ruo n'ahọ n'ime steeti ruru iri abụọ na anọ na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria.

Nke ahụ, dịka o siri kwuo, bụzị ihe mere o ji echu òtù ọrụ ahụ ụra oge ọbụla ịdị na-echeta ma na-echukwa ndị ajọ ọnọdụ ahụ metụtara na mgbe na mgbe.

Na nzaghachi ya oge ọ na-anabata ihe ndị ahụ n'aha ndị nke ahụ metụtara, onyeisi ụlọọrụ SEMA, bụ Paul Odenigbo kelere ndị òtù ọrụ ahụ maka ịdị na-echeta ma na-ebutere ndị ahụ ihe onyinye na mgbe na mgbe, dịka ha si eme kwa ahọ ọbụla.

Dịka ọ na-ekwu na nke ahụ na-enyere gọọmenti steeti ahụ aka n'ụzọ pụrụ iche n'ichukwa ndị ahụ, Maazị Odenigbo kwezịrị nkwa na ha ga-agba mbọ kesaara ndị nke ahụ metụtara ihe ndị ahụ e bukọtaara ha n'ozuzu oke.

Ihe ndị ahụ e butere ka e kesàá gụnyerè: nchà, ute, iko e ji añụ mmiri, àkwà, ákwà tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.