Òtù Michael Ọkpara Enyela Dọkịta Maduka Onyinye Nkwanyeùgwù Maka Ezi Ọrụ Ya

Jul 8, 2021 - 15:02
 0
Òtù Michael Ọkpara Enyela Dọkịta Maduka Onyinye Nkwanyeùgwù Maka Ezi Ọrụ Ya

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ùgwù bụ nkwanye nkwanye, ma sịkwa na okpueze na-adị mma n'isi onye o ruru.

N'ihi nke a, ndị òtù Michael Ọkpara, a maara dịka 'Michael Okpara Foundation' nọrọ na nsonso a wee nye Dọkịta Godwin Madụka onyinye nkwanyeùgwù pụrụ iche maka ọrụ obi ebere na ezi ọrụ ndị ọzọ dị iche iche ọ na-arụ.

Mmemme inye nkwanyeùgwù a bụ nke weere ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ ma bụrụ mmemme ndị dị iche iche sitere n'òtù ahụ na ndị ọzọ ihe Dọkịta Godwin Maduka na-amasị sonyere na ya.

N'okwu ya oge ọ na-enye ya onyinye nkwanyeùgwù ahụ, onye duru ndị òtù ahụ wee bịa ya bụ ije ma bụrụkwa nwa nwoke Dọkịta Michael Okpara lagoro mmụọ, bụ Maazị Ụzọdịmma Ọkpara mèrè ka a mara na òtù ahụ bụ òtù e hibere n'aha Dọkịta Michael Okpara, onye bụ onye ọrụ ahụike wuru èwù na mba ụwa, onye mbụ jiri ọkwa dịka Premia nke mpaghara ọwụwa anyanwụ ala Nigeria malite n'agbàtà ahọ 1959 wee ruo n'ahọ 1966, ma bụrụkwa onye mere ka ọnọdụ akụnụba mpaghara ala Igbo bụrụ ọnọdụ akụnụba kachasị mma ma kakwa na-agawanye n'ihu n'ụwa gbaa gburugburu oge ọ nọ n'ọkwa ahụ.

Dịka ọ na-akọwa na ọ bụghị onye ọbụla ka òtù ahụ na-enye nkwanyeùgwù, o mere ka a mara na ha na-enye Dọkịta Madụka nkwanyeùgwù ahụ dịka 'Philantropist of the Millenium' n'ihi ọrụ obiebere dị iche iche ọ rụgoro na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Igbo, n'ala Nigeria nà ná mpụga ya. 

O kwuru na ezi ọrụ obi ebere niile ahụ Madụka na-arụ nà nkwàdo dị iche iche ọ na-enye na mpaghara ebe dị iche iche abụghị naani na o tutela olileanya ọtụtụ ndị mmadụ enweghịzị olileanya, ma mịtakwa ọtụtụ ezi mkpụrụ n'ụzọ dị iche iche; ọ sịkwa na nke ahụ na-egosinnọọ na ọ nọ ọdụ ka a ga-asị na ọ bụ Dọkịta Michael Ọkpara lagoro mmụọ lọrọ Dọkịta Madụka ụwa, maka na ha abụọ enweghịdị nnukwu ihe dị iche iche n'etu ha si eme na n'obibindụ.

O mere ka a mara na Dọkịta Ọkpara bụ dọkịta bekee na-ewu èwù na mba ụwa oge ọ dị ndụ, ma gbakwa akaebe na Dọkịta Madụka n'onwe ya bụkwazị dọkịta na-ewu èwù na mba ụwa ma bụrụkwa onye nwe otu n'ime ụlọọgwụ kachasị mma na mba ụwa taa, bụ nke a maara dịka 'Las Vegas Pain Institute and Medical Cente' dị na mba USA, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ rụgoro n'ebe dịgasị iche iche n'ala Nigeria na mba ofesi, ya na ihe ndị ọzọ mere ya bụ nwoke ka ọ bụrụ odogwu na oke mmadụ ndị Igbo na ala Nigeria ji eme ọnụ.

Ọ kpọkuzịkwara ya bụ nwa amadi bụ Dọkịta Madụka ka o jisie ike n'ezi ọrụ ahụ ọ na-arụ n'ihi na ụwa na Chineke na-ahụ ya, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ya, ma kpọkukwazie ndị mmadụ ka ha na-enye ya bụ nwoke nkwàdo kwesiri ekwesi oge niile, iji gaa n'ihu n'ezi ọrụ ya.

Maazị Ọkpara kọwakwara na Madụka ga-emekwa nke ọma n'ịgbanwe ọnọdụ akụnụba Anambra ma ọ chịa steeti ahụ, dịka nna ya bụ Michael Ọkpara siri mee nke ọma oge ọ chịrị mpaghara ala Igbo, ma kpọkuzie ndị Anambra ka ha nye ya nkwàdo kwesiri ekwesi, dịka ọ na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

Na nzaghàchi ya oge ọ natachara nkwanyeùgwù ahụ, Dọkịta Madụka kèlèrè ndị otu ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozùrù òkè ịnwete nkwanyeùgwù ahụ dị óké elu, ma kọwaa ya dịka nnukwu ihe agbamume na ihe mwulite mmụọ iji sị ya gaa n'ihu n'ezi ọrụ dị iche iche ọ na-arụ.

O jiri onyoonyoo wee gosipụtasịa ọtụtụ ihe dị iche iche ọ rụgoro ma na mba ụwa ma na mba ofesi, nke gụnyere ụlọ ahụike 'Las Vegas Pain Institute and Medical Cente' ahụ dị na mba Amerika, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ rụrụ nnanị ya ma nyefee gọọmenti, n'aka ndị ụka, maọbụ n'aka ndị obodo n'efù, nke gụnyere isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo ya bụ Ụmụchukwu, ụlọọgwụ 'Trinitas International Hospital, Ụmụchukwu; ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa 'Nigerian Security and Civil Defense Corps, Ụmụchukwu'; ngalaba ụlọikpe Majie dị n'Ụmụchukwu; ngalaba ụlọikpe ukwu dị n'Ụmụchukwu; tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, nke gụnyere ụlọụka, ebe obibi ndị ọrụ ụka, okporoụzọ, ụlọakwụkwọ, ụlọ ezumeezu, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ rụrụ.

O kwukwara na ya enyela ọzụzụ ọrụaka na nkwàdo nyegara ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị ruru puku kwuru puku n'ọnụọgụgụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ o megoro, ma kwuo na ọ ga-aga n'ihu n'ezi ọrụ ahụ, maka na ọ na-atọ ya ụtọ nke ukwuu oge ọbụla ọ na-arụ ezi ọrụ dị etu ahụ.

Ọ kpọkukwazịrị ma gwa ndị Anambra ka ha kwàdo ya n'ozuzuoke dịka ọ na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ. O kwere nkwà ime Anambra ka ọ dị ka Dubai ma o nweta mmeri, ma kwupụta olileanya o nwere na ọ ga-enweta mmeri na nhọpụta ahụ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a. 

Banyere ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na o mechaa turu ùgò dịka Gọvanọ steeti ahụ, Dọkịta Maduka kwuru na ebumnobi o ji azọ ọkwa gọvanọ bụ ka o jeere steeti ya na Ndị Anambra ozi, n'ihi na o meela ọtụtụ ihe na-ewu ewu na ihe dara ụda na mba ụwa, nweta nzere na agụmakwụkwọ dị iche iche, ma nwekwa ezi ọgụgụisi, amamihe na ahụmahụ dịka ezi onye ndu, bụzị nke mere ya ka ọ bụrụ onye kacha tozuo òkè n'ime ndị niile ahụ so ya azọ ọkwa gọvanọ ahụ.

O kwuru na o nweta nturuugo, na ọ ga-enwògharị ngalaba ahụike nglaba mmụta na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ; kwalite njem ala, njem ikuku na njem mmiri; kwàdo ma kwàlite ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị etu o kwesiri; ma kwàlitekwazie ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ na ọnụego a na-enweta n'ime steeti ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ o bu n'obi imere ndị Anambra.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484