Onyeisi Ọrụ Agha Ala Nigeria Agaala Njem Nleta N'Enugu

Jun 26, 2021 - 22:47
 0
Onyeisi Ọrụ Agha Ala Nigeria Agaala Njem Nleta N'Enugu

Izunna Okafor dere akụkọ a

N'ịgbaso mkpebi ya iweta ezi ọnọdụ nchekwa n'ala Nigreria na ịkwalite ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ ya, onyeisi ndị ọrụ agha ala Nigeria 'Chief of Army Staff' ahụ a kpọlitere n'ọkwa ọhụrụ, 'Major General' Farouk Yahaya agaala njem ileta ndị ọrụ agha nọ na mpaghara '82 Division' iji mara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ.

Ya bụ njem nleta bụ nke onyeisi ahụ gara n'isi ụlọọrụ mpaghara 82 ahụ bụ 'Abakpa Cantonment' dị na steeti Enugu, bụkwa ebe onyeisi mpaghara ahụ, bụ Major General Taoreed Lagbaja na ndị ọrụ ya nọrọ wee nabata ya n'obi añụrị, maka na nke ahụ bụ njem nleta mbụ ọ na-abịa na mpaghara ahụ dịka onyeisi ọrụ agha ala Nigeria.

N'okwu ya n'ebe ahụ, 'Major General' Yahaya kpọkuru ndị ọrụ ya ka ha dị uchu n'ọrụ ma na-arụkwa ya n'ụzọ iwu kwàdòrò. 

O kwere nkwà na ọ ga-eme ihe ọbụla o were ike iji kwàlite ọnọdụ obibindụ ha ma nyekwa ha ezi nkwàdo kwesiri ekwesi, iji wee rụọ ọrụ ha nke ọma dịka a tụrụ anya.

Ọ nọrọ n'ebe ahụ wee gbapee ògìgè a rụgharịrị ọhụrụ, bụ 'Quarter Guard', ebe ụlọọrụ na ụlọ obibi ndị ọrụ agha nọ n'ọrụ ga-adị. O kelere onyeisi nlekọta mpaghara ahụ maka ya bụ ọmarịcha ọrụ, ma nyekwazie ndị ọrụ ya ga-anọ n'ụlọ ahụ ndụmọdụ ka ha lekọta ma leruo ebe ahụ anya nke ọma, ma jirikwa ya kwàlite arụmọrụ ha.

Ọ nọkwazịrị otu ụbọchị ahụ wee gaa njem nleta n'ebe ahụ a na-enye ndị ọrụ agha ikuku Nigeria, bụ 'Nigerian Air Force' ọzụzụ. N'okwu ya n'ebe ahụ, Yahaya kèlèkwàrà ndị ọrụ ahụ ma tòó ma gosipụta obi añụrị ya banyere ezi njikọaka dị n'etiti ụlọọrụ abụọ ahụ, kpọkuo ha ka ha gaa n'ihu ịrụkọ ọrụ ọnụ n'ibu agha megide ajọ ọnọdụ nchekwa.

Na mbụ n'okwu ya oge ọ na-anabata ya, onyeisi nlekọta mpaghara '82 Division' ahụ, bụ 'Maj. Gen.' Taoreed Lagbaja kwupụtàrà mkpebi na ezi njikere ya na ndị ọrụ iji memilaa mpụ na arụrụala na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ, kelee ya bụ onyeisi ọrụ agha ala Nigeria maka ezi mmasị o nwere n'ịkwàlìtè ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ agha ahụ na etu ha si arụ ọrụ. Ọ gwakwàzịrị ya na ọbịbịa ahụ ọ bịara bụ nnukwu ihe agbamume nye ndị ọrụ ya. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484