Obianọ Ekpughee Akàrà Ngosi Na Njirimara Egwuregwu Ndị Uwe Ojii Nke Ahọ 2020

Feb 13, 2020 - 01:20
Jan 24, 2021 - 01:19
 0
Obianọ Ekpughee Akàrà Ngosi Na Njirimara Egwuregwu Ndị Uwe Ojii Nke Ahọ 2020

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra nọrọ na mbido izu ụka a wee mee mmemme ikpughe ákàrà ngosi ọhụụ (bụ logo) na njirimara (bụ mascot) maka asọmpi egwuregwu otu jikọtara ndị uwe ojii n'ala Nigeria, nke ahọ 2020.

Gọvanọ Obianọ, onye ọ bụ steeti ya ga-ele ọbịa n'asọmpi egwuregwu ahụ nke ahọ a, mèrè ya bụ mkpughe akara njirimara ahụ n'isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị n'Abụja bụ isi obodo ala Nigeria.

N'okwu ya, Gọvanọ Obianọ, onye ọ bụkwa ya na onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka egwuregwu na steeti Anambra, bụ Maazị Tony Oli soro wee gaa ya bụ mmemme, kwèrè onyeisi ndị uwe ojii, bụ Maazị Mohammed Adamu nkwà na asọmpi egwuregwu ahụ nke ahọ a ga-abụ òkpòchànjè na eji ama atụ, n'ihi na steeti ahụ dị njikere imeta ha mma.

O kwùrù na asompi egwuregwu ahụ ga-enye aka ịkwàlite ọnọdụ egwuregwu n'ime steeti ahụ ya na njem nlegharị anya, n'ihi ụdị akụrụngwa dị iche iche a ga-arụnyesi ebe ahụ maka ya ya bụ egwuregwu.

Ọ sịkwazị na a ga-esite na ya bụ egwuregwu wee wepụtasịa ụdịrị egwuregwu ọhụụ dị iche iche, bụ nke o nwebèghị ebe a hụrụ ya mbụ, ma bụrụkwa nke ga-akpọlite mmasị ndị mmadụ ma tutekwa mmụọ ha n'ebe egwuregwu na mmesàpụ àhụ dị.

Na ntụnye nke ya, DSP Nkeiruka Nwode, bụ nwa amadi ahụ jibụrụ ọkwa dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti Anambra n'oge gara aga, ma bụrụkwa onye nọ n'isi mgbasa ozi na mmekọrịta ọhaneze n'egwuregwu ndị uwe ojii nke ahọ a, kwèrè nkwa na a ga-agbasà ozi nke ọma ma nyekwa nkuzi nà nkọwa bụ ịgbà bànyere egwuregwu ahụ nke ahọ a, tupuu e bido, mgbe a na-eme, nakwa mgbe a chịkọtàrà ya bụ asọmpi egwuregwu.
O mekwara ka a mara na nke ahụ ga-enye aka kwàlite ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ndị uwe ojii na ọhaneze n'ala Nigeria gbaa gburugburu.

Na nzaghachi, onyeisi ndị uwe ojii, bụ Maazị Mọhammed Adamu kọwàrà egwuregwu na mmesapụ ahụ dịka ihe dị oke mkpa na ndụ mmadụ ọbụla n'ebe ọrụ nchekwa dị, ma kwuo na ọ bụ nke ahụ mere e jìrì hibe asọmpi egwuregwu ahụ, bụ nke nọ n'agba nke iri na abụọ ya ugbua.

Ka ọ na-ekele minịsta na-ahụ maka egwuregwu n'ala anyị, Maazị Adamu fọkwàrà ekele n'ụkpa wee bunye Gọvanọ Obianọ maka ezi nkwàdo ya nyégárá ndị uwe ojii kemgbe ọ barata n'ọkwa ọchịchị.

O kelekwazịrị ya maka ịnabàtà ka steeti ya lee ọbịa n'asọmpi egwuregwu ahụ na-abịa n'ihu, ma kwe ya nkwa na njikọ aka steeti Anambra na ndị uwe ojii ga-aga n'ihu, ma na-amịtakwa ezi mkpụrụ, ọ kachasị n'ime steeti gaa n'ihu ịbụ ejiamaatụ n'ihe gbasaara ezi ọnọdụ nchekwa.

Asọmpi egwuregwu ndị uwe oji nke ahọ 2020, nke a kpọrọ "Anambra 2020" gà-ewere ọnọdụ na steeti Anambra, malite n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Febụwarị wee ruo n'abalị asaa nke ọnwa Maachị, ma bụrụkwa nke a tụrụ anya na ọ ga-adọta mmadụ karịrị puku ise site na mpghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria nà mba ofèsi.

Mmemme asọmpi egwuregwu ndị uwe ojii na-ewere ọnọdụ kwà ahọ abụọ ọbụla.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.