Daniel Amokachi enwetego ọrụ dịka onye ọzụzụ JS Hercules nke Finland

Jan 22, 2016 - 07:15
Jan 22, 2021 - 06:33
 0
Daniel Amokachi enwetego ọrụ dịka onye ọzụzụ JS Hercules nke Finland

Onye ala Naịjirịa ụwa jiri egwu bọọlụ ụkwụ mara, bụ Daniel Amokachi, enwetego ọrụ dịka onye ọzụzụ otu egwuregwu bọọlụ a kpọrọ JS Hercules nke mba Finland. Amokachi kwesịrị ịmalite ọrụ dịka onye isi otu bọọlụ ahụ na-atụfughị oge.

Amokachi, onye gbabuuru Super Eagles bọọlụ, mecha bụrụkwa onye ọzụzụ ndị Super Eagles, ga-ewere okwa site n'aka Pekka Haaranen, onye ọzụzụ JS Hercules ruo ugbu a.

Amokachi bụ osote onye ọzụzụ otu Super Eagles, Stehpen Keshi, mgbe ha butere iko mba Afrịka n'afọ 2013. Amokachi hapụrụ ọkwa ya dịka onye ọzụzụ Super Eagles n'afọ gara aga.

Nwa afọ ala Naịjirịa ahụ gbara afọ 43 kụtara bọọlụ ọnụ ya na mba dị iche iche, yana otu egwuregwu bọọlụ dịkwa iche iche. Amokachi agbago bọọlụ na mba Tọki, Briten, na Beljọm. Amokachi agbagooro otu bọọlụ ndị ụwa ma ama dịka Everton, yana Besiktas.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.