Obianọ Agaala Njem Nleta n'Ebe Ahụ A Na-Arụ Ụlọ Ezumeezu Mba Ụwa n'Anambra

May 26, 2021 - 19:37
May 30, 2021 - 19:09
 0
Obianọ Agaala Njem Nleta n'Ebe Ahụ A Na-Arụ Ụlọ Ezumeezu Mba Ụwa n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwupụtala ma gosipụta obi ụtọ ya banyere etu ọrụ si aga n'ebe ahụ ọchịchị ya na-arụ nnukwu ụlọ ezumeezu mba ụwa na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a oge ọ gara njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ya bụ agadaga ụlọ ezumeezu dị n'Agụ Awka, n'isi obodo steeti ahụ, bụ nke ọ nọrọ na ya wee gagharịa n'ebe ahụ iji hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ na etu ya bụ ọrụ si aga.

Dịka ọ na-akpọpụtasị uru dị iche iche ya bụ ogige ga-ewebàta na steeti ahụ ma a rụchaa ya, ọ gara n'ihu mee ka a mara na nke ahụ ga-enyekwa aka ịkwàlite ọnọdụ mmepe na steeti ahụ, kewàpụtara ụmụafọ steeti ahụ ọtụtụ ohere ọrụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-eweta.


 
Ọ kọwara na ya bụ ogige ga-eme ka Anambra soro n'ọnụọgụgụ steeti olenaole nwere ụdị ụlọ ezumeezu mba ụwa dị etu ahụ n'ala Nigeria, ma mekwazie ka e nwee ike ịchịkọba ụdị nnukwu ọgbakọ dị iche iche n'ime steeti ahụ.

O kelekwazịrị ngalaba ụlọọrụ na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, ma kelekwazie ụlọọrụ ji ọrụ ngo ahụ maka ogoogo ha ji arụ ya bụ ọrụ na etu ha sikwa arụ ọrụ ebe ahụ ma n'ụbọchị ma na-abalị, iji wee hụ na a rụchàpụrụ ya bụ ọrụ n'oge a kara àkà.

Gọvanọ Obianọ nọkwàrà n'otu ụbọchị ahụ wee gaa njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ogige ama egwuregwu n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, iji marakwa ka ọrụ si aga n'ebe nke ahụ.

N'okwu nke ya banyere ụlọ ezumeezu ahụ, Komishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ, bụ Maazị Michael Okonkwo nyèrè nkọwa banyere ụlọ ahụ nà etu ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ma mee ka a mara na ya bụ ọrụ na-abịazị n'isi njedobe ugbua.

O mere ka a mara na ya bụ ogige ga na-abatanwu, opekata mpe, mmadụ puku iri n'otu oge, nwee ebe a na-atụ ndụ mmadụ, nwee ebe a na-emesàpụ ahụ, ụlọ akụ, ebe a na-ere ihe, nà ebe a na-eme ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị iche iche, ma n'ime ụlọ ezumeezu ahụ, ma na mpụta ya, bụ nke ga na-eme ka ebe ahụ na-agawanye n'ihu oge niile.

Dịka ọ na-akọwa na ụlọ ezumeezu ahụ ga-enyekwa aka n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe n'ụzọ dị iche iche ma mpaghara ahụ, na n'ịkwàlite ọnụego na-abata na steeti ahụ; Kọmishọna Okonkwọ mere ka a mara na Gọvanọ Obianọ nyere mgbe a ga-arụcha ọrụ ahụ, ma kwuo na ha na-agbasi mbọ ike ịrụchapụ ya tupu oge ahụ. Ọ gakwara n'ihu kọwaa na ihe soro wee gbutụ oge n'ịrụchapụ ụlọ ahụ bụ ịkụ elu ya, maka na ọ bụ naanị ígwè ka e jiri wee kpàá ma kụọ ya, ma bụrụkwazie nke were ọtụtụ ogè. 

Ọ kpọpụtasịkwara uru ndị ọzọ dị iche iche ogige ahụ ga-ewètara steeti ahụ na ụmụafọ ya, kọwaa ie ndị ọzọ dị mkpa banyere ogoogo e ji arụ ya bụ ụlọ, ma kwupụtazie olileanya o nwere na ha ga-arụchapụ ya bụ ọrụ tupuu oge a kara aka eruo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484