N'Osun, A Chụọla Onyeisi Mahadum n'Ọrụ Maka Itinye Àkwà Ndina n'Ụlọọrụ Ya

Dec 22, 2020 - 17:07
Jan 30, 2021 - 17:07
 0
N'Osun, A Chụọla Onyeisi Mahadum n'Ọrụ Maka Itinye Àkwà Ndina n'Ụlọọrụ Ya

Izunna Okafor

Isi ọchịchị mahadum 'Federal Polytechnic, Ede' dị na steeti Osun, nọrọ na nsonso a wee gwa onyeisi mahadum ahụ ka ọ nọzukagodi n'akụkụ maka ibute ma tinye nnukwu àkwà edina n'ime ụlọọrụ ya, bụ nke o nweghị ihe o ji ya eme nakwa ebumnobi o jiri bute ya.

Ọchụchụ ahụ a chụrụ ya bụ onyeisi ụlọakwụkwọ, bụ Maazị John Adekolawole bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mgbasa ozi ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Sola Lawal, n'agbanyeghị na o kweghị ekwu ihe mere e jiri chụọ ya.

Ya bụ akụkọ banyere ọchụchụ a chụrụ nwa amadi ahụ bụkwa nke onyeisioche òtù ahụ jikọtara ndị nkụzi ụlọakwụkwọ politekiniiki, bụ 'Academic Staff Union of Polytechnics' (ASUP) bụ Adekunle Masopa mere ka ndị otu ya mara na nzukọ mberede ọ kpọrọ ha banyere nke ahụ, bụkwa ebe ọ nọrọ gwa ha na ihe e jiri chụọ ya bụ nwoke bụ maka na o butere ma dọba nnukwu àkwà edina n'otu ime ụlọ dị n'ụlọọrụ ya.


O mere ka a mara na ya bụ àkwà ndina bụ nke ụfọdụ na-ekwu na nwoke ahụ butere ka o were na-ehi ụra n'oge ọrụ, maọbụkwanụ nwezie ebumnobi ọzọ o jiri bute ya bụ àkwà, dịka iji ya wee na-amazụrị maọbụ na-eri ụmụnwaanyị ọkọmbọ, maọbụ ihe ndị ọzọ, bụ nke mmadụ ọbụla apụghị ịkọwata. 

O kwukwara na ha gbara mbọ ịrịọchitere ya bụ onyeisi arịrịọ ka a ghara ịchụ ya, mana isi ọchịchị ụlọakwụkwọ ahụ ekweghị, n'ihi na ha kwechiiri n'ọchụchụ ahụ ha chụrụ ya, ka o wee ga zuo ike nke ọma n'ụlọ be ya tupu a mara ma ọ ka ga-alaghachi.

Ya bụ onyeisi ụlọakwụkwọ a chụrụ n'ọrụ ka e kwukwara na ọ na-emere etu o siri masị ya n'ọkwa ahụ, nke na o nweela oge ọ pụrụ ma nọọ ihe ruru otu ọnwa tupu chighatakwa; tinyere ihe ndị ọzọ ọ na-eme, bụkwa ihe ndị e lekwasịrị anya wee mee ya bụ mkpebi e mere ịchụ ya, maka na ọ na-adị mma okeọkpa gosikarịa nnekwu nkarị, a tụọ ya iché.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.