Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Ndị Na-Ama Aka Àkpà n'Awka

Mar 25, 2020 - 22:13
Jan 22, 2021 - 21:44
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Ndị Na-Ama Aka Àkpà n'Awka

Izunna Okafor, Awka

Ndị uwe ojii steeti Anambra ejidela ụmụokorobịa ise ọrụ ha bụ ịma aka àkpà na igwù ndị mmadụ ojoro n'Awka. Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Harụna Mọhammed, site n'ozi ọ kụpụrụ bànyere nke ahụ nso nso a.

Dịka o siri kọwaa, mmadụ ise ahụ, nke gụnyere: Junior Abamu (gbara ahọ iri abụọ na ise); Uche Louis (gbara ahọ iri abụọ na otu); Chinemelem Anugwam (gbara ahọ iri abụọ na otu); Agaro Afo (gbara ahọ iri abụọ na isii); na Abraham Patrick (gbara ahọ iri na ise) ka e kwuru na ha na-apụnara mmadụ ekwentị ya n'ime ụgbọala ma were ya ya pịghakọrọ ego niile onye ahụ nwere n'ụlọ ọba ego.

Dịka akụkọ siri kọọ, a nwụchikọrọ otu onye òtù ndị omekoome ahụ, bụ Maazị Nkem Emmanuel (gbara ahọ iri abụọ na isii) na mpaghara Aroma, maka izu ekwentị na puku naịra iri atọ na asaa nke onye ya na ya bàkọrọ otu Keke, bụ Ebere Okafor; e wee sitezie n'aka ya nwụchikọọ ndị ọzọ.

Nwa amadi ahụ, bụ Nkem Emmanuel ka e kwuru na ọ nọrọlarị na mbụ (n'abalị iri na isii nke ọnwa a) wee zuo ekwentị Infinix hot-8 onye ọzọ ya na ya bakọrọ, bụ Maazị Ọhaka Uchechi, ma were ya zuru ego narị dị puku naịra asatọ na ụma iri ise na otu (N851, 000).

Ihe e nwèkọtara n'aka ndị ahụ gụnyèrè ekwentị dị iri abụọ na atọ n'ọnụọgụgụ, memọrị kaadị iri na atọ, anwụrụ ike, ọgwụ ike Cordeine na ọgwụ ndị ọzọ dị iche iche, tinyere ego karịrị otu narị puku naịra.

Otu ọ dị, onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abanga, na-akpọkuzị ndị dabàgoro n'aka ndị arụrụala ahụ, ka ha bịa n'isi ụlọọrụ ndị uwe ojii ahụ, ma kọwaa onwe ha nke, iji wère ihe ha zuuru n'aka ya.

Ka ọ dị taa, ndị omekoome ahụ ekwetago na ha mere ihe niile ahụ, ma bụrụkwazie ndị a ga-akpụpụ ụlọ ikpe ma e mechaa nnyocha bànyere okwu ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.