Ndị Ebenator Eriela Ji Ọhụrụ, Chie Onowụ Ọhụrụ

Sep 1, 2021 - 20:11
 0
Ndị Ebenator Eriela Ji Ọhụrụ, Chie Onowụ Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ụmụafọ Ebenator Ozulọgụ, bụ obodo dị n'okpuruọchịchị ime obodo 'Nnewi South' nke steeti Anambra merubèrè emume iri ji ọhụrụ ha nke ahọ 2021.

Oke mmemme ahụ wèèrè ọnọdụ n'òbí eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Chinewubeze Edwin Ezejiburu, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ, ma ọnọnụlọ ma ọnọnụzọije, ndị nwadiala, ndị ọgọ, ndị ikwu na ibè na ndị na-echere obodo ahọ ezi echiche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị iche iche na gburugburu ya wee bịa ya bụ mmemme.

Mmemme iri ji ọhụrụ Ebenator nke ahọ a bụ nke bịara ka ọ gachara mkpụrụ ụbọchị abụọ ndị obodo ahụ jiri chibe Ọkammụta Sam Ụzọchukwu echichi ma nyekwa ya asambodo dịka Onowu ọhụrụ nke obodo ahụ, bụkwa nnukwu mmemme ọzọ dara ụda n'obodo ahụ na nsonso a ma dọtakwa ndị Onowu ruru iri na ise n'ọnụọgụgụ sitere obodo dị iche iche na steeti ahụ wee bịa.

N'okwu ya oge ọ na-eme emume ịwa ọjị na ịwa ji kpọnkwem na mmemme ahụ, Igwe Ezejiburu kọwara mmemme iri ji ọhụrụ dịka oke mmemme pụrụ iche n'ala Igbo, ma kelee Chukwu maka ịnọnyere ụmụafọ obodo ahụ n'oge ịkọ ọrụ ugbo, idebe ha ndụ, na imekwa ka ihe a kọrọ n'ubi mepụta ihe nke ọma. 

Dịka ọ na-ekele Chineke maka ngọzị ya n'isi ụmụafọ obodo ahụ na ọganihu obodo ahụ, Igwe Ezejiburu, onye bụkwa eze ọdịnala kachagoro nọọ ọdụ n'okpuru ọchịchị Nnewi South, kèlèrè aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ego ahụ o nyere obodo ahụ ka ha wee họrọ ma rụọ ihe na-akpa ha. O jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma rịọ ya bụ Gọvanọ ka ọ gbatara obodo ahụ ọsọ enyemaka n'ihe gbasaara enweghị ezi okporoụzọ, mmiri ọñụñụ na ọkụ latiriiki. Ọ rịọkwara enyemaka na mgbataọsọ gọọmenti n'ajọ mbize ahụ na-akpa mkpamkpa n'obodo ahụ, bụ nke a maara dịka Ibo Ebenator, nke bụ otu n'ime mbize kachara mie imì na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, ma bụrụkwa nke na-ebi obodo ahụ aka ọjọọ kemgbe ahọ kwùrú ahọ gara aga, ma ka na-akpakwa ike ruo taa.

Ka Igwe wachaara ji ahụ mpewa anọ, nke nọchitere anya ahịa anọ dị n'izu, mmemme iri ji ọhụrụ ahụ kpòghàràzịrị ọkụ n'uju, dịka égwu ùhiè na egwu ọdịnala ndị ọzọ dị icheiche wèghààrà ọnọdụ, wee malite ime ndị mmadụ obi añụrị. Dịka emume ịkụ ngazị n'eze na-aga n'ihu, ndị mmadụ na ndị òtù dị icheiche gakwazịrị buoro Igwe ìhù site n'inye ya ego, mmanya maọbụ ihe onyinye ndị ọzọ dị iche iche, dịka e si eme ya n'omenala Igbo.

N'ajụjụọnụ a gbara ya, nwunye Igwe, bụ Lọọlọ Elizabeth Ezejiburu, kelere Chineke maka ọmarịcha ihu ígwë o nyere ụbọchị ahụ, nke na mmiri ozuzo maọbụ oke anwụ ọchịcha emebìghì ihe a na-eme. O kelekwara ụmụafọ obodo ahụ sitere ebe dị icheiche wee bịa sonye na mmemme ahụ, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ha mmaji kwuru mmaji n'ihe dị icheiche ha na-eme.

N'okwu nke ya, onyeisi ọchịchị 'Ebenator Development Union (E.D.U.)' bụ Dọkịta Anthony Okechukwu tòrò Chineke, Igwe Ezejiburu na ụmụafọ obodo ahụ maka etu ya bụ mmemme iri ji ọhụrụ siri gaa siriri-wèrèrè, ọbụladị dịka ọ kọwara mmemme iri ji ọhụrụ dịka mmemme ndị Igbo ji akwanyere ji ùgwù dịka eze nke ihe a kọrọ n'ubi.

N'okwu ya gbasaara Onowu ahụ e chiri ọhụrụ n'obodo ahụ, Dọkịta Okechukwu kọwara nke ahụ dịka ihe magburu onwe ya, n'ihi ọtụtụ uru dị icheiche nke ahụ ga-ewèta. O kwuru na Onowu ahụ e chiri ọhụrụ bụ mmadụ gụrụ akwụkwọ nke ọma ma ruo n'ogoogo Ọkammụta n'ihe gbasaara asụsụ na omenala Igbo, nke na-egosi na ihe gbasaara omenala Igbo na ọrụ ya dịka Onowu doro ya anya nke ọma, maka na ọ ga-etinye mmụta ya na ọgụgụisi ya n'ọrụ, bụkwa nke ga-abara obodo ahụ na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu uru n'ụzọ pụrụ iche ma kwàlitekwa ọnọdụ mmepe obodo ahụ. O kwukwara na Onowu ahụ ga-enyere Igwe aka n'ụzọ pụrụ iche n'ọchịchị obodo ahụ, iji wètawanye ọganihu.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, Onyeisioche òtù ọrụ haziri mmemme abụọ ahụ, bụ Maazị Pualinus Ubah, na odeakwụkwọ òtù ahụ, bụ Maazị Anthony Ezepuo kwupụtara obi añụrị ha banyere etu mmemme abụọ ahụ siri gaa nke ọma, ma kelee onye ọbụla nyere aka, gbaa mbọ maọbụ tụnye ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ya bụ mmemme gara nke ọma. 

Dịka ha na-ekwupụta ezi olileanya ha nwere na mmemme iri ji ọhụrụ Ebenatọ nke ahọ na-abịa abịa ga-aka dàá ụda karịa nke ahọ a, ha gosipụtakwara olileanya ha nwere na Onowu ahụ e chiri ọhụrụ n'obodo ahụ ga-enye aka kwalite mmepe obodo ahụ n'ọtụtụ ụzọ dị icheiche, ma bulikwa obodo ahụ n'ogoogo dị elu.

N'ozi ya, Onowu ahụ e chiri ọhụrụ n'Ebenator, bụ Ọkammụta Sam Ụzọchukwu (onye a maara dịka Onowu Ọkammụta) kèlèrè eze ọdịnala na ụmụafọ obodo ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozuru òkè ịbanye na ya bụ ọkwa dị elu ma dịkwa nsọpụrụ, ma kwe nkwa na ọ gaghị agharịpụ ntụkwasịobi ahụ ha nwere na ya wee chibe ya echichi ahụ. O kwekwara nkwà iji mwedanala wee rụọ ọrụ, ma jeere eze ọdịnala na ụmụafọ obodo ahụ ozi, nyekwa aka n'ịkwalite ọganihu obodo ahụ na ọnọdụ obibindụ ụmụafọ ya, site n'inye aka Chineke.

Dịka ọ na-echeta etu obodo ahụ siri bụrụ ndị e ji ama àtụ nà ndị nọbụ n'ezi ihu n'ihe gbasaara agụmakwụkwọ n'oge mbụ, Ọkammụta Uzochukwu, onye bụkwa onye mbụ ruru n'ogoogo ọkammụta na mpaghara Mbanese niile, nọkwàzịrị n'ebe ahụ wee kwuwaa na ọ na-eguzobe òtù nkwàdo agụmakwụkwọ ọ kpọrọ "Sam Uzochukwu Education Fund", ma kwe nkwà inye ego dị nde naịra abụọ maka ịkwàdo nke ahụ na iji kwàlite agụmakwụkwọ n'obodo ahụ. Site n'okpuru atụmatụ nkwàdo agụmakwụkwọ ahụ, o nyekwazịrị ụmụafọ obodo ahụ nọ n'ogoogo klaasị SS3 na Kọleeji Ebenator ohere agụmakwụkwọ n'efu (ma ịkwụrụ ha ụgwọ ule WAEC).

O kwere nkwà na ọ ga-aga n'ihu ịtụnyekwu ụtụ n'ụzọ dị icheiche na ngalaba agụmakwụkwọ na ngalaba mmepe obodo ahụ n'ọdịnihu, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ụmụafọ Ebenatọ ka ha tụnyekwa ụtụ nke ha ma jikọọ aka ọnụ n'ịkwàlite mmepe obodo ahụ, n'ịgbaso ụkpụrụ "Ibu Anyị Danda", bụ okwu e jiri mara obodo ahụ malite n'oge mbụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484