Ndị Naịja Delta Ga-Amalitekwa Nsogbu Ha n'Abalị Iri Nke Ọnwa Septemba

Ndị Naịja Delta Ga-Amalitekwa Nsogbu Ha n'Abalị Iri Nke Ọnwa Septemba

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Otu jikọtara ndị na-akpọ ganị ganị  na mpaghara Naịja Delta emeena ka ọhaneze mara na ha ga-amalitekwa inye nsogbu na ịgbagwosi okporo mmanụ ma ọ bụrụ na ọnwa Septemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri.

Otu jikọtara ndị na-akpọ ganị ganị  na mpaghara Naịja Delta emeena ka ọhaneze mara na ha ga-amalitekwa inye nsogbu na ịgbagwosi okporo mmanụ ma ọ bụrụ na ọnwa Septemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri.

Ndị otu a kwuru nke a n'izu ụka gara aga ma mee ka a mara na ndị orụ ha enyena ha ọnụ ọgụgụ ikwe mmanụ bụ nke ndị mgbago ugwu nwere na mpaghara ahụ, bụ ihe karịrị pacent iri itoolu nke ikwe mmanụ niile dị na mpaghara ahụ.

Ha sị na n'ụbọchị ahụ, nke ga-abụ ụbọchị ụka, na ndị otu ha karịrị puku ise n'ọnụ ọgụgụ ga-eme mkpamkpa dị egwu, gbagwosie ihe ma mechisiekwa ọtụtụ ebe na mpaghara ahụ.