Mpụ na Arụrụala: Ndị Ntorobịa Anambra Ekwela Nkwa Inye Ọchịchị Soludo Nkwàdó

Mar 27, 2022 - 22:38
 0

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị ntorobịa Anambra a maara dịka ‘Anambra Youths Volunteers’ ekwela nkwà na ha ga-adọnyere ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ, nke Ọkammụta Chukwuma Soludo nọ n'isi ya úkwù ma nye ya nkwàdo zuru òkè ná nzọpụ̀ ụkwụ ahụ ọ zọpụgoro ibu agha megide ịna ụtụ aghara aghara, mpụ na arụrụala na steeti ahụ.

Ndị òtù a kwupụtara nke a oge ha nwere ọgbakọ pụrụ iche n'Onitsha, bụ ebe ha nọrọ wee kwuo na ha wàtàrà ọgọdọ iweghàchite udo tọrọ àtọ na steeti ahụ, ya na inye ndị omekoome ọsọ ụkwụ erughịala.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Maazị Chukwuma Okpalaezeukwu mere ka a mara na ha ga-elebàkarị anya n'ihe gbasaara okporoụzọ, na ileru anya etu ihe si aga na steeti ahụ, dịka o siri metụta akparmagwa ndị omekoome.

O kwuru na ihe ha jiri me mkpebi ahụ bụ maka nkwuwa ahụ Gọvanọ Soludo na ọ màchiela ọrụ ndị ọnaụtụ iwu akwadòghị na ndị ọzọ na-etinye aka na mpụ na arụrụala ndị ọzọ; bụkwa nke onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Echeng Echeng nyegoro ndị ọrụ ya ntụziaka ka ha malite itinye ya n'ọrụ n'ozuzuoke ozigbo ozigbo.

Ọ sị na ha ga-amachi ma weta na njedobe, ihe ọbụla bụ ịma aka akpa, ịpụ̀nara mmadụ àkpà ya, ekwentị ya maọbụ ihe ndị ọzọ o nwere; ya na ịkwụ n'okporoụzọ anakọ ụtụ, tinyere ihe ndị ọzọ na-ebute ala adịghị mma na steeti ahụ.

Maazị Okpalaezeukwu jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ndị ntorobịa na-etinye aka n'ọrụ ịnakọ ụtụ a maara dịka ọrụ Agbero, nà ihe ndị ọzọ iwu akwadòghị ka ha sepu aka na nke ahụ, maka na ha bụ ndị otu agaghị ekwe ha nụọ mmiri tọgbọ iko maọbụkwanụ nwee ezumike. Ọ sịkwa na ha aghàghị iji ụlọikpe mbugharị ahụ gọọmenti steeti ahụ guzobere wee kpee ndị ọbụla ha jidere na-eme mpụ na arụrụala ikpe ozigbo ha jidere ya.

O kwupụtazịkwara ezi njikere ha dị inwoghàrị na ịgbanwe ndụ onye ntorobịa ọbụla chegharịrị wee sepụ aka n'iji mpụ na arụrụala eri nri ịa steeti ahụ

Na ntụnye nke ya, otu n'ime ndị òtù ahụ mere ka a mara na ndị òtù ahụ nọgasị n'ime okpuruọchịchị ime obodo iri abụọ na oru dị na steeti ahụ, ma kwuo na ha ga-enyere gọọmenti aka imezupụta atụmatụ ya n'ime okpuruọchịchị niile ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484