Lee ụfọdụ egwuregwu ụmụaka gwuru mgbe ezi bụụrụ n’okpuru osisi-ụkwa

Jun 10, 2020 - 16:09
Jan 26, 2021 - 16:09
 0
Lee ụfọdụ egwuregwu ụmụaka gwuru mgbe ezi bụụrụ n’okpuru osisi-ụkwa

By Voice of Nigeria, Lagos

N’oge gboo, ndị nne na-eji olu ike akpọtụrụ ụmụaka ha kpapụrụ akpapụ gaa igwu egwuregwu n’agbataobi ha maọbụ n’ama egwuregwu.

Ọ na-abụ nwantakịrị nụ olu nna maọbụ nne ya, o jiri ọsọ jiri ije laruo ụlọ maka ụtarị.

Oge ahụ ka ụmụaka mara etu e si enwe aṅụrị na etu e si egwu egwuregwu.

Oge ahụ, ndị mmadụ anaghị achịrị obi ha n’aka maka onye agbataobi ha, kama nwa bụ nwa ọha, nwantakịrị ọbụla nwereike ịga n’ụlọ onye agbataobi ya ọbụla soro ụmụaka ibe ya gwurutu egwu.

Egwuregwu mere nkari, tupe e mee nke a, mee nke ọzọ, chi a na-achọ iji, ụfọdụ oge, ụmụaka anaghị echetazị na ha eribeghi nri.

Ọ dịzị ka ụfọdụ egwuregwu ahụ alachala maka na o nweghizi onye nwere ohere ha ugbua, nakwa egwu abịala ọtụtụ mmadụ, e nweghizi ntụkwasi obi ebe agbataobi nọ.

Mana, ọ dị mma ka anyị laghachiazụ cheta ihe ụmụaka ji egwuegwu n’oge  gboo.

Egwuregwu ụmụaka n’egwu mgbe gboo gụnyere:

1. Ịwụ ụdọ

Ụmụaka na-awụ ụdọ ihe dị egwu. A na-eji ya eme nwale ọ ga-emeri ibe ya ọkachasị ụmụnwaanyị. Otu onye jide n’otu isi, onye ọzọ ejide n’isi nke ọzọ, ndị mmadụ e si n’ihu mana azụ na-abanye.

Ọ naghị adị mfe isi n’azụ banye mana ebe ahụ ka ọ na-aka mma maka ụfọdụ oge, iwu na-abụ na ị ga-esiriri n’azụ febanye, ị melighi ya, ị pụọ.

Image copyright Getty Images Nkenke aha onyonyo Ịwụ ụdọ bụkwazi otu ụzọ ndị mmadụ si emegharị ahụ iji taa ahụ ma gbasie ike ugbua

2. Ịkpọ ọga

Ụmụnwaanyị kwenu! Ebe a ka ụmụaka ụmụnwaanyị na-egosi onwe ha nke ọma.

Ụfọdụ ụmụnwaanyị ga-akpọgide ọga kpọgide ọga, ha agaghịdị anụ oge nne ha kpọrọ ha ruo mgbe o jiri ụtarị bịa. Ịkpọ ọga ọkụ ọkụ bụ nụ egwu e ji, i juo oyii, a gafee gị ozugbo.

A na-akpọ ọga, a na-akpụ aka n’akwa ha, oge ụfọdụ na-egosi ụdị ịba ha yi ma ndị na-eyighi ịba cha cha. Ụfọọ̄ụ ụmụnwoke kpọkwara ọga n’onwe ha mana ọ bụ ọkacha ụmụnwaanyị bụ ndị kpọrọ ọga nke ọma.

3. Ife Kaịt(Kite)

“I fere kaị mgbe i pere mpe?” N’ọlụ onye egwu Zoro. Ife kaịt adịghị mfe cha cha maka ọtụtụ ndị amụtaghị ya rue taa. Ị ga-eji aka gị rụọ ya ma zuru eriri akwa nne gị jiri fee kaịa mana ekwela ka o jide gị.

Ife kaịt tara obere akpụ mana ndị mụtara ya na-efepụ ya, ụdị ọṅụ na mkpu a na-eti ma ị na-afụ ya n’igwe.

Mmadụ niile a na-agwa gị etu ị ga-esi mee ya ka ghara ịda mana ihe ọbụla gbagoro elu ga-agbadatarịrị ala.

Image copyright Getty Images Nkenke aha onyonyo Ụdị obi aṅụrị e ji efe kaịt dị egwu

4. Ịtụ swelụ

Ọ bụ nke otu ụkwụ, ka ọ bụ nke ụkwụ abụọ na-akacha gị mma ịtụ? Ọ bụ nke a na-aka anọ kaọbụ ise kaọbụ isii. Swelụ bụ o zuru Igbo ọnụ, onye elu na onye ala, nwoke na nwaanyị tụrụ swelu.

Ọ nyere aka ịzụ ụmụaka mee ka ha sie ike ma n’ụkwụ ma n’ume maka na ọ dịghị mfe iji otu ụkwụ gazuo swelu laghachite azụ.

O nwekwara ndị a na-akpa akpa, ọ ga-abụ ị tụọ okwe gị, i jiri ụkwụ na-akpa ya ruo mgbe o ruru ebe ọ ga ejedebe.

5. ‘Oliọma Danger’

Ma rue ugbua, ebe ọbụla i kwuru olioma ‘danger’ ọtụtụ mmadụ ga-aza gị soro gị gụwa egwu ahụ etu e si agụ ya.

I chetakwara etu e si eme ya, a na-agụ egwu ahụ, a na-atụli mmadụ elu mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ n’azụ a na-awọta onye ahụ jide ya n’aka ka ọ ghara ịda n’ala. A na-eme nke a, a na-agụ:

“Oliọma danger,

oliọma le, Olioma chus baby

chus baby lee my mother le

ole nkenkere sike uuh!

Ewu na ọkụkọ sike, onye ọcha na-ese foto, onye Igbo na-eme ngala…” Ngwa gụchazie ya.

6. Tinkọm tịnkọm

“Tịnkọm tịnkọm, tịnkọm tịnkọm, tịkalika alịka, dalin nke m o, dalin nke m ooo” I nwereike imezuo nke a.

7. Ịnya bọres

Ebe a ka a na-ama ụmụnwoke nwere akọnauche gbasara ịrụ igwe. Bọres bụ ihe ụmụnwoke ji osisi arụ tinye ya ụkpụrụ ọ ji abụ a kwa ya, ọ gbapụ ọsọ.

8. Kpukpukpu ogene

“Kpukpukpu ogene, ooo gene o genene, onye na-achọ ogene…”

Egwu a bụ egwu e ji achọ mmadụ maọbụ ụmụaka kwụrụcha ọtọ cherita onwe ihu na-akụkọrịta aka, otu onye a na-aga n’okpuru ha. Ha na-agụ egwu ahụ na-apakọrịta aka.

9. Ịgba bọọlụ jiri osisi mee ọnụ goolu

Ụmụnwoke mere nke a nke ọma maka na ọ bụ ha na-agbakarị bọọlụ mana ụmụnwaanyị mekwara ya. Ịgba bọọlụ na-amasịkwa ụfọdụ ụmụnwaanyị n’ezie.

10. Ịwọ akwa na ịzụ okwe

Ụmụnwaanyị na-awọkarị akwa ebe ụmụnwoke na-azụ oke.

E nwere ihe a na-akpọ mkpụrụ a na-ahọkọta e ji awọ ya, a wụsaa mkpụrụ akwa ahụ asatọ n’ala e jiri otu na-atụli elu ma ghọta ya.

Ị tulie otu, oge ọ nọ n’elu, ị tụtụta otu ọzọ, ọ dị abụọ, ị wụsa ya n’akụkụ, i mechaa otu otu, ị malite chịrịwa ya abụọ abụọ na atọ atọ rue mgbe ị ga-achịrịcha ha niile n’otu oge.

N’aka nke ọzọ, ịzụ okwe bụ nke a ka na-eme ruo taa.

Ọtụtụ ezinaụlọ nwere okwe ahụ n’ụlọ ha iji cheta oge gboo nakwa iji zuo ike. Okwe bụkwa ihe ụmụaka nakwa ndị okenye maka na ụbụrụ ka e ji eme ya.

Ndị enweghi okwe na-ese ya n’ala were mkpụrụ okwe iri abụọ na anọ e ji azụ ya.

Egwuregwu ndị na ndị ọzọ anyị edepụtaghị bụ ihe ụmụaka Igbo ji enwe aṅụrị oge gboo.

Mana ugbua, teknụzụ abịala gbanwee etu ụmụaka si enweta onwe ha.

Ihe ụmụaka jizi egwu egwu taa gụnyere:

1. Ihe onyonyo: Ụmụaka na-atọzi n’ihu onyonyo ekiri onyonyo dị icheiche

2. Egwuregwu onyonyo(video games): Nke a bụkwa nke na-ewu. O nweghi ụdịrị egwuregwu na-adịghịzi n’ụdị a dịka egwuregu bọọlụ na ndị ọzọ

3. Ihe ndị e ji egwuegwu(Toys): E nwekwaziri ihe ndị n’ụdị dị icheiche na-eme ụmụaka obi aṅụrị.

Eziokwu bụ na etu e siri mee ya n’oge gboo dị mma, etu e si emekwa taa amaka.

Ọ dịkwa mma ma ọ bụrụ na nne na nna ga-akụziri ụmụ ha nke gboo tinyere nke ọgbara ọhụrụ taa n’ihi na nke ndị gboo na-eme ka ụmụaka nwee ezi mmekọrịta n’etiti onwe ha iji mara etu ha si eme omume

na ihe na-adị nwanne ha mma karịa ịkpa icheiche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.