Igwe Ezinato Emeela Mmemme Awamji Ọhụrụ Nke Afọ N'Enugwu-Agidi

Sep 30, 2021 - 12:19
 0
Igwe Ezinato Emeela Mmemme Awamji Ọhụrụ Nke Afọ N'Enugwu-Agidi

Nkechi Ikenwoke dere akụkọ a

Dịka oriri ana eri kwa afọ na mpaghara ala Igbo niile iji n'akwalite omenaala Igbo, udo na ọṅụ nke obodo, mmemme iri Ji ọhụrụ bụ otu ụzọ nime oriri ejiri mara ndi Igbo.
Mmemme a bụ nnọọ nke emere n'ụdị pụrụ iche na obodo Enugwu-Agidi nke dị n'okpuru ọchịchị Njikoka, oge Eze ọdịnala na achị obodo ahụ bụ Igwe Izuchukwu Daniel Okekeonyeocha, Igwe Ezinato mere mmemme Awam Ji Ọhụrụ nke afọ a na obi ya.

Nke a mere ụzụ mmadụ ji were tụọ na be Igwe oge ahụ. Mmanwụ di iche iche dịka Ajọfịa, Ijere na ndi ọzọ gbarakwara. Otu di iche iche nke gunyere nwoke na nwaanyị nakwaazị nakwa ụmụaka bịara ya bụ mmemme. Ha nyerekwara Igwe Ezinatọ onyinye di iche iche.
N'okwu ya oge ọ na awa Ji, Igwe Okekeonyeocha kelele Chineke maka ọrụ ugbo na owuwe ihe ubi nke afọ a, ma bụrụ nke o kwuru na ọ bụ ọpụrụ iche.

Ọ kọwara na mmemme ahụ bụ nnọọ nke maritere n'oge gboo ma bụrụ nke ana eme na emesịa Ifejiọkụ tupu ezinụlọ ọbụla amarite iri Ji ọhụrụ ma gaanihu kwue na ọ bụ "Otite Nze" n'asụsụ obodo ha. Ọrịọkwara ka onye ọbụla tinye aka na ọlụ ugbo iji na kọpụta erimeri nke ugwuu.

N'okwu nke ya, onye rụbugoro ọrụ dịka onyeisi Ifite vileji nke Enugwu-Agidi bụ Sunday Okoye kọwara Igwe Ezinatọ dịka mmadụ ọra nakwa Igwe obodo kwadoro ma kwue na epkere ya bụ na mmemme Awam Ji afọ ọzọ ga amakarị nke afọ a.

Ọ kọwara mmemme Awam Ji ahụ dịka ụzọ ọzọ esi ekele Chineke maka ọgọ na afọma ya n'ebe ha nọ nakwa owuwe ihe ubi nke afọ ọbụla, ma gaa n'ihụ kwue na Ji bụ isi ihe ubi n'ime nkpụrụ ihe ndi ọzọ ana akọrọ akọ.

Okwukwaziri na mmemme ahụ na eweta agamnihu na obodo nakwa ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Onye bụ Onye ode akwụkwọ otu ọgbọ akpọrọ Ndụbisi Agegrade nke obodo ahụ bụ Hon Chibuzo Udegbunam kelele Igwe Ezinato maka ya bụ mmemme ọchịkọbara. Ọ gara n'ihụ kpee ekpere ka Chineke nye ha ogologo ndụ na arụisiike ma dụọ ụmụntorobịa ndumọdụ inwe mmasị ikọpụta ihe erimeri di iche iche.

Ụfọdụ ndi Nze na Ọzọ obodo Enugwu-Agidi nọ na mmemme a gụnyere Onyeisi Amalgamated Enugwu-Agidi Brother Union, Abuja branchi, Ichie Uchenna Okafor, Ozo Engr Samuel Oraegbunam, Ọzọ Nwokemeeleibeya, Ichie Ochinanwata na ndi ọzọgasi.

Ndi mmadụ ndi ọzọ gunyere Engr Martins Okoye, Sir Sunny Okoye, Obinna Nwankwọ, Chukwudi Ifenna wee diri gaba.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484