E jidela nnukwu ụgbọala si na steeti Plateau buru ndị mmadụ na-abata Anambra

May 20, 2020 - 20:37
Jan 22, 2021 - 20:46
 0
E jidela nnukwu ụgbọala si na steeti Plateau buru ndị mmadụ na-abata Anambra

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ na-abụ onye zoro ezoro gafee, e zoro ezoro chụba ya. N'ịgbaso nke a, o mere ndị mmadụ vam n'anya na nso nso a, dịka ndị ọrụ nchekwa na steeti Anambra gbachibìdòrò ma nwụchie ótù nnukwu ụgbọala si na steeti Plateau dị na mpaghara mgbago ugwu ala Nigeria wee buru ndị mmadụ na-abata n'ime steeti ahụ (Anambra), na-agbanyeghị na gọọmenti nyere iwu ka e mechigodi ókè ala steeti niile ugbua n'ihi ọrịa nje korona.

Ya bụ ụgbọala bụ nke bu ma ewu ma ọgbatumtum, na mmadụ dị iri atọ na atọ n'ọnụọgụgụ wee bata n'ime steeti ahụ, ma bụrụkwa nke a nwụchiri n'ihu obi gọọmenti dị n'Awka.

N'ajụjụ ọnụ a gbara ndị ahụ nọ n'ụgbọala ahụ, ha kọwara na ha si na Jos, bụ isi obodo Plateau, wee na-aga Ọnịtsha, ịga nọrọ ebe ahụ gbaara onwe ha mbọ ma chọkwa ihe ha ga-eme iji bara onwe ha úrù.

N'ihi na ya bụ akụkọ ha kọrọ nà njem ahụ ha bàgidere edochaghị anya, ndị ọrụ nchekwa Anambra dùùrù ma chụghachi ya bụ ụgbọala (nwéré akàrà MGR 148 XA Jigawa) azụ ozigbo, ya na ihe niile ahụ o bùkọsị, ka ọ laghachi Enugu bụ ebe o siri wee mịbàta n'ime steeti ahụ. Ndị ọrụ nchekwa ahụ dugidekwara ha wee defèé ha n'ókè ala Anambra na steeti Enugu, tufu feere ha

N'okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ, ode akwụkwọ mgbasa ozi nyegara Gọvanọ steeti Anambra, bụ Maazị James Ezeh kwùru na ọ bụ ezie na ndị ahụ nọ n'ime ụgbọala ahụ bụchà ụmụafọ Nigeria, kama na njem ahụ ha bàgidèrè adabàghị adaba chaa chaa n'ihi na o mègidèrè ntụziaka gọọmenti ala Nigeria na gọọmenti steeti ahụ nyèrè ka a kwụsịgodi ime njem isi n'otu steeti bàá na steeti ọzọ ugbua, n'ihi mgbasà ọrịa nje korona.

O gbara akaebe na steeti Anambra na-anabàta ma na-elekọta ma na-emetakwa ndị ọbịa mma n'ụzọ pụrm iche, ma sị na a gaghị ejizị maka nke ahụ wee megide ntuziaka gọọmenti nyèrè, maọbụ tinye steeti ahụ n'ihe ize ndụ. Ọ kpọkùkwazịrị steeti ndị ọzọ dị iche iche, ka ha mụrụ anya ka azụ ma kekwa ajị n'ume, ọ kachasị n'ime oge a, iji hụ na e mere ihe etu o siri kwesi, ma sikwa n'ụzọ dị etu ahụ gbanahị ịkwa 'ngara m mara' n'oge ikpeazụ.

E jidela nnukwu ugboala si na steeti Plateau buru ndi mmadu na-abata Anambra.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.