Ọchịchị nke Otu Egwu Bọọlụ Real Madrid na Mba Yuropu Abịa N'isi Njedebe

Mar 6, 2019 - 23:55
Jan 22, 2021 - 06:15
 0
Ọchịchị nke Otu Egwu Bọọlụ Real Madrid na Mba Yuropu Abịa N'isi Njedebe

Ibe Kelechukwu, Ogun State, Nigeria

Ọchịchị nke Otu Egwu Bọọlụ Real Madrid na mba Yuropu abịala n'isi njedebe dịka ndị otu egwu bọọlụ Ajax merichara ya site na ịgba ha ọkpụ anọ asatara nanị otu n'ụlọ ha ụbọchị Tuuzdee.

Na mkpụrụ ụbọchị asaa, otu egwu bọọlụ Madrid abụrụla ndị a gbapụrụ na iko Copa del Rey, iko La Liga na agbata nke iri na isii na Champions League, bụ asọmpi ha kwetara na ọ bụ naanị ha bụ eze na ya.

Ha ebuola ya bụ iko ugboro atọ na-esepụghị aka, na ugboro anọ n'ime afọ ise gara aga, ebe oge ikpe azụ ndị egwu bọọlụ Madrid erughị agbata nke asatọ bụ n'afọ puku abụọ na iri, bụ n'afọ mbụ nke Cristiano Ronaldo.

Ronaldo zọpụtara Madrid n'afọ gara aga n'ime agbata nke asatọ ebe Gareth Bale bunyere ha ya bụ iko, mana ebe Ronaldo anaghị agbaziri ndị egwu bọọlụ Madrid, Bale bụ onye ewebatara ewebata na ya bụ egwuregwu.

Solari ahụla ihe mgbanwe dị iche ka achụchara Julen Lopetegui n'ọnwa Novemba, mana otu egwu bọọlụ ya ka ndị egwu bọọlụ Barcelona ji akara iri na abụọ were na-agha na nkwụdo La Liga, hụrụ ka izu ụka a siri jọrọ ha njọ.

Onye Isi egwu bọọlụ Madrid, Florentino Perez nọzi n'ihe mgbagwoju anya ebe ọ maghị ma ọ bụ ya hapụ Solari rue ọgwụgwụ afọ bọọlụ a, ma ya fọdụzie ị bido afọ bọọlụ ọhụrụ.

Solari nwere ike inwe ọtụtụ mkpesa. Ajax bụ ndị na-akwụghị ofuma dịka emerichara ha ọkpụ abụọ asatara otu na ụkwụ nke mbụ mana ha bịara na Santiago Bernabeu were bụrụ akwa a kwụrụ, site na mmeri ịtụ na-anya ọkpụ ise asatara atọ na nchịkọta ụkwụ abụọ ahụ.

Hakim Ziyech na David Neres gbanyere goolu abụọ n'ọkara nke mbụ ebe Dusan Tadic mere ya atọ dịka Marco Asensio nyechara ndị Madrid olileanya. Ka nkeji abụọ gasịrị, Lasse Schone gbanyere bọọlụ n'ebe ọnụ goolu ndị Madrid tupu achụpụ Nacho.

Bale batara ka nkeji iri abụọ na iteghete gachara were nọchie Lucas Vazquez mana nwa amadị a bụ onye mba Wales gbara bọọlụ kụrụ n'ìgwè ọnụ goolu ma tufuo ohere ọma abụọ.

Sergio Ramos nọ n'akụkụ ebe o nwetachara akwụkwọ edo edo ọ kpachara anya nweta nke mere ka ọ ghara ịso gba bọọlụ ahụ ebe o jupụtara na olileanya na ha emeriela agbata ahụ.

Raphael Varane kara ime ka nkea bịa na mmezu n'ime nkeji ise mana bọọlụ ahụ nke ọ mara ise site na yard isii gara n'elu ọnụ goolu. Ndị egwu bọọlụ Ajax werezie ọnọdụ.

Toni Kroos, amaghị ihe ọ na-eme n'abalị ahụ niile, ka a natara bọọlụ site na ịtụ bọọlụ ebe Dusan Tadic gbara ọsọ n'aka nri. Tadic kwụsịrị maka Ziyech, onye tinyere bọọlụ ahụ ụkwụ aka ekpe ya o were baa n'ọnụ goolu.

Ajax jupụtara n'ike dịka Neres kpara Dani Carvajal n'akụkụ ebe Tadic mekwara otu ihe ahụ dịka ọ dọkpụgharịrị Casemiro na-etiti ama egwuregwu ahụ tupu onye bọọlụ ahụ maka goolu nke abụọ. Neres hapụrụ Thibaut Courtious n'ọnọdụ na-adịghị mma dịka ọ gbanyere bọọlụ ahụ maka goolu nke abụọ.

Vazquez na Vinicius Junior hapụrụ ama egwuregwu ahụ n'anya mmiri site na ihe mmerụ ahụ ha nwetara. Bale batara, ya na Asensio, were gbaa ọsọ na aka ekpe mana bọọlụ ọ gbara site n'akụkụ ahụ gara n'elu ọnụ goolu.

Ndị nkwado na-eme mkpọtụ iji kwado ndị nke ha dịka ọkara nke mbụ gara mana ọnọdụ Madrid kawanyere njọ, ha na-ewepụta ohere mana ha enweghị ike iji ohere ndị a were mepụta ezi ihe. Benzema kpara Ziyech mana ọ gbafuru bọọlụ ya, oge a ka Ajax ji mee ka ọnọdụ ha kwudosie ike site na ị gbanye nke atọ na-edochaghị anya.

Ha sitere n'aka nri were gaa n'aka ekpe, gaghachikwa n'etiti ọzọ, ebe Donny van de Beek nyere bọọlụ Tadic ahụ, onye ji iwe na ọnụma were gbanye ya n'elu ọnụ goolu

Mkpọtụ kwụsịrị dịka refirii Felix Brych chere ka VAR kwuo, ebe bọọlụ ahụ dịka ka ọ gafechago maka ịtụ ya tupu Noussair Mazraoui agbapụta ya. Site n'akụkụ igwe onyonyo, ahụchaghị nke ọma mere ya bụ goolu jiri bụrụ nke a gụnyere.

Madrid chọrọ goolu atọ na nkeji iri abụọ na-anọ na abụọ na nkeji iri abụọ, dịka Asensio gbanyere bọọlụ Sergio Reguilon gbabatara n'iru ọnụ goolu were nye ha olileanya anya. Mana ka akwụsịchara bọọlụ dịka Erik ten Hag chọrọ ị gbatu Schone, a gbanyere bọọlụ ahụ n'elu ọnụ goolu Courtious.

Frenkie de Jong tihiere ụkwụ na nkeji nke iri asatọ na anọ, nke nyere Luka Modric ezi ohere n'akụkụ ahụ mana Benzema lara ya bụ ohere n'iyi. Nacho nwetara akwụkwọ ọbara ọbara oge ya na Van de Beek zọchara bọọlụ, ebea ka ike jiri gwụ ndị Madrid.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.