Adaz-Nnukwu Bụ Obodo Kacha Eme Nke Ọma n'Ịkwàdò Ọba Akwụkwọ —Udeze

Sep 9, 2020 - 21:20
Jan 28, 2021 - 21:21
 0
Adaz-Nnukwu Bụ Obodo Kacha Eme Nke Ọma n'Ịkwàdò Ọba Akwụkwọ —Udeze

Izunna Okafor

A kọwaala Adazi-Nnukwu dịka obodo kacha eme nke ọma n'ịkwàdò ọba akwụkwọ dị n'obodo ha, na steeti Anambra.

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze n'okwu ya na mmemme ncheta ụbọchị mmụta na mba ụwa, bụ nke e mere na ngalaba ọba akwụkwọ obodo Adazi-Nnukwu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha nke steeti Anambra. Ọ kọwara na ọba akwụkwọ obodo ahụ bụ ọpụrụiche n'etiti ọba akwụkwọ obodo ndị ọzọ dịgasị na steeti ahụ, ọkachasị n'etu ha si arụ ọrụ. Ọ sịkwa na obodo Adazi-Nnukwu bụkwa ọpụrụiche, n'ihe gbasaara ịkwàdo ọba akwụkwọ ha na isonye n'ihe a na-eme n'ọba akwụkwọ ha.

Ọ gakwara n'ihu mee ka a mara na obodo ahụ nwèrè òtù ọrụ pụrụ iche na-elekọta ọba akwụkwọ ha, ma nwekwa òtù ọzọ na-ahụ maka agụmakwụkwọ, bụ nke gosiri na ya bụ obodo nwèrè mmasị pụrụ iche n'ebe ọba akwụkwọ na mmụta dị. Ọ dụrụ ndị obodo ahụ ọdụ ka ha jisie ike; ma kọwakwa na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị òtù mba ụwa 'United Nations' wepụtara maka imerùbè na ịkwàdo mmụta na mba ụwa, bụ nke a na-eme n'abalị asatọ nke ọnwa septemba ahọ ọbụla.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi ọchịchị 'Adazi Nnukwu Town Development Union (ATDU)' bụ Maazị Francis Mmadubuike, nke ọ bụ osote ya nke mbụ, bụ Maazị Francis Mmadubuike nọchitere anya ya, kèlèrè ọba akwụkwọ Anambra maka ibute mmemme ahụ n'obodo ha, ma kwezie nkwà na ọchịchị obodo ahụ ga-aga n'ihu ịkwàdò ọba akwụkwọ na mmụta n'obodo ahụ.

Na nkuzi ha dị iche iche na mmemme ahụ, onyeisi ngalaba ọba akwụkwọ Ọzụbụlụ, bụ Maazị Peter Ibe kọwara mkpà mmụta dị na ndụ mmadụ nakwa úrùi dị iche iche ọba akwụkwọ bààrà ma okenye, ma nwata; ebe Nọọsụ Ikenwa Uchechukwu nke ụlọ ahụike nkụzi Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n'Awka kụziiri ndị bịara mmemme ahụ ihe dị iche iche ha kweisiri ịma banyere ọnọdụ ahụike ha na usoro ha pụrụ isi kwàlite ya, ọkachasị site n'ihe ha na-eri na site n'ileru onwe ha anya, maka ugbua na ọdịnihu.

N'akụkụ nke ya, otu nwaafọ obodo ahụ jibụrụ ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ na mpaghara Wisconsin nke mba 'United Kingdom', bụ Dọkịta Ego Enemuoh kọwàra ọba akwụkwọ dịka ògìgè mmụta, ma kwe nkwà na ọ ga-akwàdo nkewàpụta mpaghara ọhụụ n'ọba akwụkwọ ahụ, ebe naanị ụmụaka ga na-agụ akwụkwọ.

N'ozi ekele ha dị iche iche, onyeisi nlekọta ngalaba ọba akwụkwọ obodo Adazi-Nnukwu, Oriakụ Perpetual Okonkwo, onyeisi òtù ọrụ nlekọta ọba akwụkwọ obodo ahụ, bụ Maazị Peter Okafor Etika; ụfọdụ ndị òtù ọrụ nlekọta ọba akwụkwọ ahụ, Maazị Eddy Anarado na Maazị Livinus Nnebedum kèlèrè ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ, ma kelekwa ọba akwụkwọ Anambra maka ntụnye ya n'ịkwàdo mmụta n'obodo ahụ.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè Maazị Chike Ezimora; Maazị P.N. Obiakonwa; odeakwụkwọ òtù ọchịchị obodo ahụ (bụ ATDU), Maazị Goddy Ezeani; tinyéré Maazị Ozomma Ikechukwu Joseph, bụ onye jibụrụ ọkwa dịka osote onyeisi nhazi n'ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ji otu ahụ efe ala nna ha (bụ ụlọọrụ NYSC).

A nọrọ na mmemme ahụ gụọ ihe ọgụgụ dị iche iche site n'aka ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ dị iche iche sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere nwaada Peace Kenechukwu Anarado (nke ụlọakwụkwọ 'Ado Girl's Secondary School, Onitsha'), na nwaada Munachi Ejike (nke ụlọakwụkwọ 'Loretto Special Science School, Adazi Nnukwu') ndị onye nkuzi ha, nwaada Precious Ndubuisi Oluebube dùrù wee bịa. Ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ 'Community Secondary School, Adazi-Nnukwu' sòkwà na ndị sonyere na mmemme ahụ.

E merùbèkwàra mmemme ụbọchị ncheta ụbọchị mmụta ahụ nke ahọ 2020 a na ngalaba ọba akwụkwọ obodo dị iche iche dịgasị na steeti ahụ, nke gụnyere: ngalaba ọba akwụkwọ obodo Ọzụbụlụ, nke Ihembọsị, na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.