A Gbatuola Mmadụ Abụọ, Dịka Ndị Ojiegbe Wakporo Ụlọọrụ Ndị Uweojii

Nov 4, 2021 - 20:20
 0
A Gbatuola Mmadụ Abụọ, Dịka Ndị Ojiegbe Wakporo Ụlọọrụ Ndị Uweojii


Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu onye nọ n'ogoogo Inspektọ n'ọrụ uweojii nọrọ na nsonso a wee bụrụ onye a gbàgburu agbagbu, ebe otu onye uweojii ọzọ bụkwàzị onye nwetere mmerụahụ oge ndị ojiegbe wakpòrò isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara Unwana dị n'okpuruọchịchị ime obodo Afikpo, nke steeti Ebonyi. Ndị uweojii ahụ gbàgbùkwàzịrị otu onye n'ime ndị omekoome ahụ.

Dịka ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa, ndị ojiegbe á mághị ndị ha bụ, ndị ruru mmadụ iri atọ na ise n'ọnụọgụgụ wakpòrò ya bụ ngalaba isi ụlọọrụ ndị uweojii n'ihe dịka elekere atọ nke ọnụ ụtụtụ ụbọchị ụka; ha na ndị uweojii wee malite ịkwà mgbọ.
 
N'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ DSP Odah Loveth gbàrà akaebe na ihe ahụ mèrè eme n'ezie, ma kọwaa na ndị uweojii gbàgbùrù otu onye n'ime ndị omekoome ahụ oge ahụ ha na ha na-akwàrịta mgbọ n'ime abalị ahụ, ebe ndị nke ọzọ búkwàzịrị àpà mgbọ n'ụdị dị icheiche wee rie mbọmbọ ọsọ.

Kaosiladị, o mekwara ka a mara na ndị omekoome ahụ jìkwàrà egbè wee merụọ otu onye uweojii nọ n'ogoogo Inspektọ ahụ mgbe ịkwà mgbọ ahụ na-aga n'ihu, bụkwazị onye nọ ụlọọgwụ ugbua anara ọgwụgwọ ma na-agbakerekwa nwayọ-nwayọ.

DSP Loveth kọwàkwàrà na e nwétèrè égbè AK-47 abụọ n'aka ndị omekoome ahụ, ya na ụfọdụ ihe ndị ọzọ iwu akwádòghị, bụkwa nke na-agba akaebe na ha bụ ndị omekoome n'ezie; ma kọwakwa na ụlọọrụ, ngwaọrụ na ụgbọala ndị uweojii ka kwụkwà chịm, n'ihi na o nweghị ihe ọbụla ndị ojiegbe ahụ bibiri n'ebe ahụ.
 
O kwukwara na onye omekoome ahụ a gbagburu agbagbu eteelarị ndị uweojii jiri chọba ma chụgharịba ya, n'ihi na aha ya dị n'akwụkwọ ndị arụrụala a na-achọ mbiaka-mbiaka maka ihe gbaasaara mbibì na mwakpò ụlọọrụ ndị uweojii o soro mee na mpaghara ebe dị icheiche. Ọ kọwakwara na, ọbụladị égbè AK-47 ahụ e nwetere n'aka nwoke ahụ oge a gbagbuchara ya bụ egbe o zutere na ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii 'Ohaukwu Police Division' n'isi mbido ọnwa a, dịka akàrà e dere n'egbe ahụ siri kọwaa.

Kaosiladị, onyeisi ndị uweojii na steeti Ebonyi, bụ CP Aliyu Garba agaala njem nleta n'ebe ahụ ma jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ụlọọrụ ahụ. Dịka ọ na-ekele ndị ọrụ ya, o nyekwazịrị ha ndụmọdụ ka ha jiri anya òké ji achọ azụ n'àkpà wee chọgharịa ndị omekoome ndị nke ahụ gbara ọsọ, iji nwụchikọkwa ha.

Ọ rịọkwazịrị ụmụafọ steeti ahụ ka ha bụrụ ndị na-erube isi ma na-emekwa ihe iwu kwàdòrò, ma bụrụkwazie ndị na-enye ndị uweojii ozi dị mkpa ga-enyere ha aka n'ọrụ ha, iji wee chekwaa ha nke ọma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484