Super Eagles mere ndi Tahiti ji na aja na Confed Cup

Jul 5, 2014 - 19:50
Jan 22, 2021 - 06:27
 0
Super Eagles mere ndi Tahiti ji na aja na Confed Cup

Ụnyaa bụ Tuzdee abalị 18 nke ọnwa juunu, otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles nke ala Nigeria na ndị ogbo ha si mba Tahiti zutere na Brazil na asọmụmpi bọọlụ ụkwụ nke Confederation Cup. Asọmụmpi iko eze egwu bọọlụ a na-aga n’ihu ugbu a na mba Brazil.

Na bọọlụ ahụ A kụrụ n'ama egwuregwu Mineirao, ndị Nigeria jiri ọkpụ goolu 6 A satara nanị 1 were merie mba Tahiti.

Ka O mechara nkeji atọ egwu ọkpa ahụ malitere, Uwa Echiejile pịara otu shọtụ. Bọọlụ ya kụrụ mmadụ abụọ n’ahụ tupu Ọ dakpuo n’ime postu. Nke a nyere Nigeria goolu izizi ya. Ebe ihe dịka nkeji 10, Nnamdi Oduamadi kpara mmadụ abụọ ndị difenda mba Tahiti were sụtara Nigeria goolu ọzọ, nke mere ya goolu abụọ.

Mgbe a gbachara bọọlụ ahụ, Nigeria nwetere ọkpụ  6 ebe mba Tahiti satara nanị otu.

Nigeria ga-ezute mba Uruguay n’abalị 20 nke ọnwa juunu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.