Soludo Ga-Eme Nke Ọma Karịa Ka A Tụrụ Anya — Obiano

Oct 2, 2021 - 20:00
 0
Soludo Ga-Eme Nke Ọma Karịa Ka A Tụrụ Anya — Obiano


Izunna Okafor dere akụkọ a


Ka ọ gachaara ụbọchị olenaole e jiri gbapee amụmà achụmta nkwàdo nke Ọkammụta Chukwuma Soludo dịka onye ga-eji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance (APGA)' wee zọọ ọkwaa Gọvanọ na nhọpụta ahụ a ga-eme na steeti Anambra n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a; aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ adụọla ndị eze ọdịnala ka ha nye nwa amadi ahụ ezi nkwàdo kwesiri ekwesi.

Gọvanọ Obianọ nyere ndụmọdụ a n'okwu ya na nzukọ pụrụ iche ya na ndị eze ọdịnala obodo dị icheiche na steeti ahụ nwere n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ na nsonso a, bụ nke ọ nọrọ na ya wee gosi ha Ọkammụta Soludo dịka onye ga-anọchi anya ya.

O mere ka a mara na ọchịchị APGA n'ime steeti ahụ kemgbe ahọ iri na isii gara aga dị Anambra ahụ mma, maka na nke ahụ bụ ihe a gbà n'aka e jighị ènyò elele. Ọ kọwara na aka chịbụrụ steeti ahụ n'oge mbụ, bụ Maazị Peter Obi mèrè nke ọma n'ọchịchị ya; kwuo na ya onwe bụ aka na-achị steeti ahụ ugbua emeela ọtụtụ ihe dara ụda n'agbanyeghị nsogbu ajọ ọnọdụ akụnụba alz Nigeria na-agabiga.

O kwupụtazịkwara olileanya o nwere na Ọkammụta Soludo ga-emekwa nke ọma karịa ka a tụrụ anya ma ọ banye n'ọkwa dịka Gọvanọ steeti ahụ, dọta ọtụtụ mmepe na ngalaba dị icheiche n'ihi na mà mmadụ nke ọma, bụrụ onye ma nke ekwe na-akụ n'ịhazi ọnọdụ akụnụba, ma bụrụkwa onye jigoro ọkwa dị icheiche, ma n'ala Nigeria na n'ogoogo mba ofesi, bụkwa ebe o mere nke ọma.

Dịka ọ na-echeteere ndị eze ọdịnala ahụ na ọ bụ ha bụ ndị nọ n'isi n'obodo ha dị icheiche, ọ gwara ha ka ha tinye olu n'ịkwụsị atụmatụ 'onye apụtala ezi' ahụ ndị òtù 'Indigenous People of Biafra' (IPoB) na-eme ụbọchị Mọnde ọbụla, n'ihi ajọ mmetụta na mpụtara dị icheiche nke ahụ na-enwe n'ọnọdụ akụnụba na n'ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, Ọkammụta Soludo kọwàrà mkpà ọ dị ka e nwee ezi njikọaka n'etiti ndị eze ọdịnala na gọọmenti, dịka ndị ndu obodo ha bụ. O kwekwara nkwà na ọchịchị ya ga-ebido ebe ọchịchị Gọvanọ Obianọ rụdobere ọrụ, gbakwasa ụkwụ n'ezi ụkpụrụ ahụ Gọvanọ tọgòrò, ma rụkwàsá ọrụ n'elu ya, iji kwàlitekwuo ezi ọnọdụ mmepe tọrọ àtọ na steeti ahụ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onye ahụ na-anọchitebụ anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n'ụlọ omeiwu sineeti n'oge gara aga, bụ Sinetọ Victor Umeh gwakwara ndị eze ọdịnala ahụ ka ha hụta Ọkammụta Soludo dịka onye tozuru òkè nke ọma iwèghàrà ọkwa ọchịchị steeti ahụ, ma nyekwa ha ndụmọdụ ka ha nye ya nkwàdo kwesiri ekwesi, iji hụ na o nwetara mmeri na nhọpụta ahụ a ga-eme n'ọnwa Nọvemba.
 
N'okwu ya n'aha ndị òtù ya, eze ọdịnala obodi Ụmụeri, bụ Igwe Ben Emeka gbara akaebe na e nwere ezi mmekọrịta n'etiti Gọvanọ Obianọ na ndị eze ọdịnala obodo ahụ, ma gbakwa akebe na ya bụ Gọvanọ rụrụ ezi ọrụ pụtara ìhè na steeti ahụ.


Onyeisioche otu ndọrọndọrọ APGA na steeti Anambra, bụ Maazị Nobert Obi, na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ndị selitere isi n'otu ndọrọndọrọ ahụ sònyèkwàrà na mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484