Ndị Omeiwu Anambra Agaala Leta Ụlọ Ezumeezu Mba Ụwa A Na-Arụ n'Awka

Mar 2, 2021 - 06:13
 0
Ndị Omeiwu Anambra Agaala Leta Ụlọ Ezumeezu Mba Ụwa A Na-Arụ n'Awka

Izunna Okafor

Ụfọdụ ndị omeiwu steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee bàgide na njem nleta n'ogige ebe ahụ a na-arụ ụlọ ezumezu mba ụwa n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra, iji mara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ.

Njem ahụ, nke ọ bụ ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor duru ha wee bàgide, bụkwà nke ụfọdụ ndị dị iche iche selitere isi n'ọrụ gọọmentị n'ime steeti ahụ sonyere na ya.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Maazị Okafor gosipụtara afọ ojuju ya banyere etu ọrụ si aga n'ebe ahụ, ogoogo e ji arụ ya bụ ọrụ, nakwa ogoogo ụlọ ahụ nọ na ya ugbua, ma kọwaa na eserese na atụmatụ e jiri rụọ ya bụ ụlọ bụ ụdị nke a na-ahụta na mba ofesi.

Dịka ọ na-akpọpụtasị uru dị iche iche ya bụ ogige ga-ewebàta na steeti ahụ ma a rụchaa ya, ọ gara n'ihu mee ka a mara na nke ahụ ga-enyekwa aka ịkwàlite ọnọdụ mmepe na steeti ahụ, kewàpụtara ụmụafọ steeti ahụ ọtụtụ ohere ọrụ, ma kwalitekwa ọnụego na-abata n'akpa gọọmenti steeti ahụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-eweta.
 
O kwupụtara olileanya o nwere na a ga-arụcha ya bụ ogige tupu oge udummiri, ma kọwaa na ya bụ ogige ga-eme ka Anambra soro n'ọnụọgụgụ steeti olenaole nwere ụdị ụlọ ezumezu mba ụwa dị etu ahụ n'ala Nigeria, ma mekwazie ka e nwee ike ịchịkọba ụdị nnukwu ọgbakọ dị iche iche n'ime steeti ahụ.

O kelekwazịrị aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obiano maka ezi ọrụ dị etu ahụ, ma mee ka a mara na nke ahụ so n'otu nnukwu ihe dị iche iche a ga-eji na-echeta ọchịchị ya na steeti ahụ.

Na mbụ n'okwu ya oge ọ na-edugharị ndị ahụ n'ogige ahọ, Kọmishona na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Maazị Mike Okonkwo mere ka a mara na ya bụ ụlọ ezumezu nwèrè ikike ịbà mmadụ puku iri otu ugboro, nwee ebe a na-atụ ndụ mmanụ, nwee ebe nlegharịanya, nwee ebe a na-edebe ihe ọkpụ, ma nwee ebe a na-akwụba ụgbọala nwere ike irite ụgbọala karịrị otu puku otu ugboro, tinyere ihe ndị ọzọ mere ka ya bụ ogige bụrụ ọkaibe n'ezie ma bụrụkwa ejiamaatụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi òtù ọrụ na-ahụ maka ewumewu n'ụlọomeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Lawrence Ezeudu gbàrà akaebe na ụlọọrụ ngo na-arụ ụlọ ahụ na-arụ ya nke ọma n'ịgbaso eserese na ogoogo e kwuru, ma jirikwa akụrụngwa bụ ọkachamma wee na-arụ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484