Ihe Mberede Okporoụzọ: Mmadụ Atọ Agbanahịla Ọnwụ n'Ọka

Mar 1, 2021 - 22:09
 0
Ihe Mberede Okporoụzọ: Mmadụ Atọ Agbanahịla Ọnwụ n'Ọka

Izunna Okafor


Mmadụ atọ nọrọ na nsonso a wee gbanahị ọnwụ ha, dịka ajọ ihe mberede okporo ụzọ dapụtara n'àkwà ebe ahụ ụgbọala na-agba n'elu na-agba n'ala dị n'Amawbia, n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ na-ahụ maka ije awele okporoụzọ bụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' ngalaba steeti Anambra, bụ SRC Florence N. Edor bụ ya mere ka a mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na steeti ahụ, bụ nke o sitere na ya wee mee ka a mara na ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàra ụbọchị Tuuzdee n'etiti ụgbọala Peugeot Saloon nwere akàrà YAB 944 JY na ụgbọala ọzọ na ụgbọala Ford Escape SUV nwere akàrà 02E 660 AN.

Dịka o siri kọwaa, ndị ọnọmgbeomere kwuru na ọ bụ mmadụ ịpụ n'akụkụ nke ya ma banye n'akụkụ nke onye ọzọ mèrè ya bụ ihe mberede jiri dapụta. Ọ kọwara na ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara mmadụ atọ (bụcha ụmụnwoke), mana o nweghị onye ọbụla n'ime ha tụfùrù ndụ ya, kama ọ bụ naanị otu onye nwetàrà mmerụahụ, ma bụrụkwa onye e buuru ozigbo gaba n'ụlọọrụ 'Princeton Hospital, Awka' maka inye ya ọgwụgwọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti ahụ, bụ CC Andrew A. Kumapayi FHNR dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị megide mmadụ isi n'akụkụ okporoụzọ nke ọ na-agba wee banye n'okporoụzọ onyeọzọ n'ụdị ekwesighị ekwesị, ma kwuo na nke ahụ so n'otu ihe na-ewètakarị ihe mberede okporo ụzọ, nke ọtụtụ mmadụ sitegoro na ya wee tụfuo ndụ ha.

Ọ kpọkukwara ndị na-anyà ụgbọala ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ maọbụ ime ihe ndị ọzọ megidere iwu na-achị okporoụzọ, ọbụladị dịka o kpere ka onye nke ahụ nwetara mmerụahụ gbakere ma nweta ọgwụgwọ zuru oke n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484