Ndị Ọkaiwu Anambra Emeela Ngagharịiwe Maka Onye Òtù Ha E Gburu Egbu

Mar 25, 2021 - 08:53
 0
Ndị Ọkaiwu Anambra Emeela Ngagharịiwe Maka Onye Òtù Ha E Gburu Egbu
Ndị Ọkaiwu Anambra Emeela Ngagharịiwe Maka Onye Òtù Ha E Gburu Egbu
Ndị Ọkaiwu Anambra Emeela Ngagharịiwe Maka Onye Òtù Ha E Gburu Egbu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na e nwere ọtụtụ ụzọ nwaanyị si ejide di ya, ma nwekwa ọtụtụ ụzọ nwoke si agwa nwunye ya ihe ọ chọrọ.

N'ịgbaso nke a, ndị ọkaiwu steeti Anambra emeela ngagharịiwe na steeti ahụ banyere onye òtù ha ndị ntọ tọọrọ na nsonso a ma gbuo ya egbuo n'ime steeti ahụ.

Ya bụ onye òtù ha e gburu, bụ Maazị Frank Onwuachị ka e kwuru na ọ bụkwa ya bụ onyeisi ọchịchị obodo Ọmọr dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ayamelụm, n'ime steeti ahụ. Nke ahụ mezịrị ndị òtù ya ahụ bụ ndị ọkaiwu a maara dịka 'Nigerian Bar Association (NBA)', ngalaba steeti Anambra jiri wee nuputa n'ìgwè wee mee ngagharịiwe ahụ, bụ nke ha mere malite n'isi ụlọọrụ ikpe steeti ahụ wee ruo n'obi gọọmentị dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ.

N'okwu ha n'ebe ahụ, ndị ọkaiwu ahụ na-eme ngagharịiwe katọrọ ogbugbu ahụ e gburu onye òtù ha oge a tọrọchara ya, ma kọwaa na nke ahụ na-egosi na ọnọdụ nchekwa amachaghịzị kwụrụ na steeti ahụ ugbua dịka ọ dị na mbụ. 

Ha kpọkuru gọọmentị steeti ahụ ka o mee ngwangwa nwụchie ndị aka ha dị na ntọrọ na n'ogbugbu ahụ e gburu ya bụ nwa amadi, ma mekwa ihe ngwangwa banyere ọnọdụ nchekwa ndụ na akụnụba n'ime steeti ahụ ugbua, bụ nke ha kwuru na o nwezịrị ka o siri debe imi na ọnụ ugbua n'ihi ajọ akparamagwa ndị omekoome malitekwara ịkpa n'ime izuụka olenaole gara aga na steeti ahụ.

Na nzaghachi ya n'aha gọọmenti, odeakwụkwọ izugbe steeti, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu kọwara akparamagwa ndị omekoome ahụ na ogbugbu ha gburu nwoke ahụ dịka nke jọgburu onwe ya, n'ihi na ha na-achọ ụzọ ha ga-esi mebie ezi ọnọdụ nchekwa dị na steeti ahụ kemgbe ọtụtụ ahọ. 

N'ịgbaso okwu ahụ Gọvanọ Willie Obianọ kwuru na nsonso a banyere ọnọdụ nchekwa steeti ahụ na ogbugbu e gburu nwoke ahụ; Ọkammụta Chukwulobelu nyèzịrị ndị ahụ owuweanya na ọchịchị steeti ahụ agbaghị nkịtị banyere ọnọdụ ahụ, ma kwezie ha nkwa na gọọmentị ga-agbasi mbọ ike iji nwụchikọọ ndị ọ bụ ha kpara arụ ahụ, ma weghachitekwa ezi ọnọdụ nchekwa na udo tọrọ àtọ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ ọzọ.

Ọ dị ncheta na ndị ojiegbeezu, bụ ndị omekóòmè a maghị ndị ha bụ nọrọ ụbọchị Fraịdee, abalị iri na abụọ nke ọnwa Maachị ahọ a wee tọrọ Maazị Francis Onwuachi na mpaghara ụzọ mmiri Ezu na ụzọ Anakụ (Ezu River/Anaku road) we fee ka nnụnụ ozigbo; o nweghịkwa onye ma ebe ha tinyere isi.

Nke ahụ mezịrị gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ jiri malite ime nnyocha iji chọpụta ebe e zoro ya,  nwụchikọọ ndị tọọrọ ya ma zọpụta ya na ndụ. 

Ka o sila dị, mbọ niile ahụ gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa gbara iji zọpụta ya na ndụ mara afọ n'ala, n'ihi na ọ bụzị ozu ya ka ha hụrụ ebe a dọbara ya oge e gbuchara ya.

Ọ bụ nke a mezịrị aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obiano jiri wee foro ntutu taa, ma kpebie na a ga-achọpụtarịrị ma nwụchikọọ ndị ahụ aka ha dị n'arụrụala ahụ, ma weghachitekwa ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484