N'Anambra, A Malitela Inye Ndị Nọọsụ Na-Ana Nwa Ọzụzụ Iji Belata Ọnwụ Nne Na Nwa

May 19, 2021 - 21:46
May 30, 2021 - 19:38
 0
N'Anambra, A Malitela Inye Ndị Nọọsụ Na-Ana Nwa Ọzụzụ Iji Belata Ọnwụ Nne Na Nwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-adị mma nwaanyị bàta ọhụrụ na ngwùrù, a kọwaara ya ka e siri biri, maka adịghị ama ama.

N'ịgbaso nke a, gọọmentị steeti Anambra amalitela inye ndị ọrụ nọọsụ ahụ e were n'ọrụ ọhụrụ na steeti ahụ ọzụzụ ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha nke ọma dịka a tụrụ anya n'aka ha ma ha mechaa malite ọrụ.

Ndị nọọsụ ahụ bụ ndị e were n'ọrụ ọhụrụ n'okpuru atụmatụ 'Basic Health Care Provision Fund' na steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị ọzụzụ inye nkụzi ha gá-éwè mkpụrụ ụbọchị ise nà-ewère ọnọdụ ugbua n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Ọgbakọ inye ọzụzụ ahụ bụ nke a na-eme site n'aka ụlọọrụ 'Anambra State Primary Health Care Development Agency' na njikọaka ụlọọrụ gọọmenti etiti, bụ 'National Primary Health Care Development Agency', ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị dị iche iche selitere isi na ngalaba ahụike steeti ahụ sonyèrè na mmemme mgbape ya.

N'okwu ya oge ọ na-anabàta ndị nọọsụ ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Primary Health Care Development Agency', bụ Dọkịta Chioma Ezeyimụlụ kọwara na mpaghara wọọdụ 326 niile dị na steeti ahụ ugbua nwegbàdòrò ogige ahụike nta na-arụ ọrụ nke ọma, n'ihi ihe dị iche iche aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ mepụtagoro na ngalaba ahụike steeti ahụ, ma kpọkuo ndị nọọsụ ahụ ka ha tinye uchu nke ọma n'ọzụzụ ahụ a na-enye ha, ma mụtakwa ihe ga-enyere ha aka iji tụnye ụtụ nke ha n'ịkwàlite ngalaba ahụike steeti ahụ.

Dịka ọ na-agwa ha ka ha gbaso usoro na ụkpụrụ e ji arụ ọrụ ahụ wee rụọ ya, ọ gakwara n'ihu chètara ha na enweghị ndị aka siri ike na ndị ma nke ekwe na-akụ n'ebe a na-amụ nwa so n'ihe kacha ewèta ọnwụ ụmụaka maọbụ ọnwụ nwaanyị na-amụ nwa n'ụlọọgwụ; bụzị nke mere e jiri hụta mkpà ọ dị inye ha ọzụzụ ahụ, ka e wee site na ya kụzikwuoro ha ihe ụfọdụ ha kwesiri ịma banyere ọrụ ahụ.

Dọkịta Ezenyimụrụ mèkwàzịrị ka a mara na a ga-ezìga ndị nọọsụ ahụ n'ogige ụlọ ahụike dịgasị iche iche na gburugburu steeti ahụ, ebe ha ga-anọ wee rụọ ọrụ, ma ọ bụrụ na inye ọzụzụ ahụ bịa n'isi njedobe; ọbụladị dịka ọ dụrụ ha ọdụ ka ha gbado anya nke ọma n'ihe niile a ga-akụziri ha.

N'okwu nke ya oge ọ na-agbape ọgbakọ nkụzi ahụ, onyeisi òtù bọọdụ nlekọta ụlọọrụ 'Anambra State Primary Health Care Development Agency', bụ Ọkammụta Jeoshephat Ogbuagu kọwàra ya bụ inye ọzụzụ dịka nke dị oke mkpa na nke magburu onwe ya, ma gwa ndị ọrụ nọọsụ ahụ ka ha gba mbọ mee nke ọma n'ebe ọbụla a ga-eziga ha oge e nyechara ha ọzụzụ ahụ. 

Na nzaghachi ha, ụfọdụ ndị ọrụ nọọsụ ahụ kwuru okwu n'aha ndị òtù ha kèlèrè gọọmentị na ụlọọrụ ahụike ya maka ịchịkọbara ọzụzụ ahụ iji gbàkwunyekwuo na nke ha nwetagoro na mbụ; ma kwezie nkwà na ha ga-etinye uchu nke ọma n'oge ọzụzụ ahụ, iji mụta ihe a ga-akụziri ha.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ụlọọrụ 'National Emergency Maternal and Child Health Intervention Centre', Dọkịta Valentine Obiejekwu, odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ n'isi ụlọọrụ ngalaba ahụike steeti Anambra, bụ Maazị Linus Nwankwo, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484