ANCSDA Enyekwuola Obodo Abụọ Ego Iji Nkwàdo Ọrụ Mmepe Ime-Ime Obodo

Feb 19, 2020 - 20:53
Jan 22, 2021 - 22:04
 0
ANCSDA Enyekwuola Obodo Abụọ Ego Iji Nkwàdo Ọrụ Mmepe Ime-Ime Obodo

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na na ọ na-abụ a na-egbu ji awaị, ọ na-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji. N'ịgbaso nke ahụ, ụlọ ọrụ 'Anambra Community And Social Development Agency (ACSDA)' enyekwuola obodo abụọ n'ime steeti ahụ ego iji wee màlite ma kwàlite ọrụ mmepe ime obodo.

Obodo abụọ ahụ, bụ Ụmụeje na Ọmọr, dị n'okpuru ọchịchị Ayamelụm, ka e nyèrè pasentị iri ise n'ótù n'ótù, nke pụtara ọkàrà mgbakọta ego niile ndị obodo ahụ ga-eji wee rụọ ọrụ dị iche iche ha họọrọ n'ótù n'ótù.

Ndị Ụmụeje ka e kwùrù na ha họọrọ ịrụ ọkụ na ịrụ ụlọ ahịa ruru iri abụọ na asatọ n'ahịa obodo ahụ, ebe ndị Ọmọr họọrọ ịrụ okporoụzọ Nkwọ-Ezenọ, ya na ebe a na-aga mposi bụ ọkachamma.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ ANCSDA, bụ Maazị Chudi Mọjekwu mèrè ka o dòó anya na ndị òbodo ọbụla gá-érita urù n'atụmatụ ahụ gà-etinye pasentị iri n'ime mgbakọta ego niile ọrụ ha họọrọ gà-eri; ma gakwa n'ihu kọwaa na nke ahụ bụ iji mee ka ndị obodo ahụ were ihe ahụ kpọrọ ihe, lekọta ma chekwaba ya nke ọma, ọ kachasị oge ọbụla ha chètàrà na ego ha sòrò dị na ya.

O kwùrù na a ga-enye ndị obodo Ụmụeje akwụkwọ ndọrọ ego ruru nde naịra abụọ maka ya bụ ọrụ, ma nyekwazie ndị Ọmọr akwụkwọ ndọrọ ego ruru nde naịra atọ maka nke ha.

N'okwu nke ya oge ọ na-enye ha akwụkwọ ndọrọ ego ahụ, onye bụ onyeisi òtù nlekọta ụlọ ọrụ ANCSDA, ma bụrụkwa, eze ọdịnala obodo Nteje, bụ Igwe Rowland Odegbo, nke onye nọchitere anya ya bụ Maazị Chris Azọh kpọkùrù ndị obodo abụọ ahụ ka ha wère ya bụ ego rụọ ọrụ otu o siri kwesi ma hụkwa na ha rụrụ ihe ọbụla ha ji ya arụ ka ọ dị n'ogoogo mba ụwa.

Na nzaghachi, ndị nnọchite anya obodo abụọ ahụ, nke gụnyere onyeisi òtù nlekọta ọrụ ngo ahụ n'Ụmụeje, bụ Maazị Paul Amuluche, nà ògbò ya nke Ọmọr, bụ Maazị Romanus Chinwụba kèlèrè gọọmenti steeti ahụ, nke Gọvanọ Willie Obianọ nọ n'isi ya, maka igùzobe ụlọ ọrụ ahụ na, bụkwa nke ha kwurù na o nyela aka n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche n'ịkwàlite mmepe ime-ime obodo na steeti ahụ.

Ha kwezịrị nkwà na iji ego ahụ rụọ ihe e zùbèèrè ya, ma rụọkwa ya n'ogoogo dị elu, ya na ichekwaba ihe ndị ahụ ọbụnadị mgbe a na-arụ nakwa mgbe a rụchàrà ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.