Echi Ka Ụgbọelu Mbụ Ga-Awụcha n'Ọdụ Ụgbọelu Ọhụrụ Anambra

Apr 29, 2021 - 14:21
 0
Echi Ka Ụgbọelu Mbụ Ga-Awụcha n'Ọdụ Ụgbọelu Ọhụrụ Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Obidoro ọsọ gbachaa kwèsìrì ịkụrụ aka, maka na ọ bụghị mmadụ niile bidoro ọsọ na-agbaru n'isi.

Echi ga-abụ 'ụwa bịa lee' na steeti Anambra, dịka steeti ahụ na-atụ anya ịnabata ụgbọelu mbụ n'ọdụ ụgbụọelu ahụ a rụrụ ọhụrụ na steeti ahụ; n'ihi na ọ na-abụ a rụchaa ụlọ e mepeghị ya emepe, ọ dị ka ọ bụ ahụhụ na arịrị ka a rụụrụ. Ọ na-adịkwa mma onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ka ọ hụ ahụ.

Nnabata ahụ a ga-anabata ọdụ ụgbọelu mbụ n'ebe ahụ bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ Gọvanọ Willie Obianọ, bụ aka na-achị steeti ahụ, n'okwu ya na nsonso a banyere ọdụ ụgbọelu ahụ, bụ nke a rụrụ n'Ụmụeri, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East'. 

Oge ọ na-enye nkọwa banyere ya bụ ọdụ ụgbọelu, Gọvanọ Obianọ mere ka amara na o so n'ọdụ ụgbọelu kachara wee buo ibu n'ala Nigeria, ma nwegasịa kpọchakpọcha akụrụngwa dị iche iche a na-ahụta n'ọdụ ụgbọelu dịgasị na mba ofesi, nke mezịrị ka ọ bụrụ ejiamaatụ n'ogoogo mba ụwa.

Na nkọwa ya, o mere ka a mara na obosara ọdụ ụgbọelu ahụ obosara ya ruru ama egwuregwu bọọlụ ise a tụkọtara ọnụ (nke na ụgbọelu bukarịchara ibu na mba ụwa nwere ike ịda ebe ahụ), nwee nnukwu ụlọọgwụ, nwee ebe a na-arụzi ụgbọelu, nwee ọdụ ahịa iri na isii, ebe nlegharịanya, ebe a na-atụ ndụ mmadụ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-ahụta na mba ofesi, nke mere ya ka ọ pụọ iche.

O kwuru na ngwangwa mmiri zochara n'ebe ahụ, a gaghị ahụzịkwa ya anya ọzọ, ma kọwaa na ya bụ ọdụ ụgbọelu bụ ebe ma ndị njem ma ngwaahịa ga na-ada.

Banyere echi, Gọvanọ Obianọ, onye mere ka a mara na ọ bụ n'ime ọnwa olenaole ka ọchịchị ya malitere ịrụ ọdụ ụgbọelu ahụ, wee rụchaa ya ugbua, gàrà n'ihu kọwaa na nwaafọ Anambra ahụ ná-ewu èwù n'ihe gbasaara njem ụgbọelu, bụ Maazị Alen Onyema ga-ebu ụgbọelu Air Peace ya wee wụchaa n'ọdụ ụgbọelu ọhụrụ ahụ; ebe nwaafọ Ọkịja Anambra ọzọ na-ewu èwù n'ihe gbasara azụmahịa ma bụrụkwa onye obodo Ọkịja, bụ Dọkịta Earnest Obiejesi kwùrù na ọ ga-ebukwa ụgbọelu Helikọpta ya wee wụchaa n'ọdụ ụgbọelu ahụ ụbọchị ahụ.

Dịka ọ na-agba akaebe na ọdụ ụgbọelu ahụ ga-enye aka n'ịkwalite ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ mmepe mpaghara steeti Anambra n'izugbe, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ nke ahụ ga-ewèta; Gọvanọ Obianọ mèkwàzịrị ka a mara na ịrụcha ọdụ ụgbọelu ahụ bụ mmezupute otu n'ime nkwa dị iche iche o kwere Ndị Anambra, ma mekwazie ka a mara na ọchịchị ya ga-emezucha nkwà niile o kwere ụmụafọ steeti ahụ tupu ọ rịtuo n'ọkwa na steeti ahụ.

Ọ kpọkukwazịrị ndị Anambra ka ha gaa n'ihu inye ọchịchị ya nkwàdo, iji gaa n'ihu imezùputè nkwà dị iche icheo kwere ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484