A Dụọla Ndị Anambra Ka Ha Kwụsị Iji Ahịhịa Asụchisi Ọwà Mmiri

Jan 22, 2020 - 20:49
Jan 24, 2021 - 01:59
 0
A Dụọla Ndị Anambra Ka Ha Kwụsị Iji Ahịhịa Asụchisi Ọwà Mmiri

Izunna Okafor, Awka

Dịka a nà-atụ anya na eluigwe nwèrè ike ibe ákwá nke mbụ ya n'ime ahọ a oge adịghị anya, anya mmiri ya ewee gbaa n'ụwa; a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra ka ha kwụsị iji ahịhịa asụchisi ọwà mmiri, maka ajọ ọnọdụ dị iche iche nke ahụ aghaghị iwèta.

Oku a na ndụmọdụ a, bụ nke si n'aka gọọmenti steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ụlọ ọrụ 'Anambra State Clear Drainage and Forest Preservation Agency,' bụ Maazị Chido Obidiegwu n'okwu ya oge ọ gara ileta ka ụfọdụ ọwà mmiri siri debe imi na ọnụ n'àkwà Ụkwaka ahụ dị na mpaghara Ụmụezena Ụmụdim, Nnewi, n'okpuru ọchịchị ime obodo Nnewi North.

Ọ kwàrà arịrị na ụfọdụ ndị mmadụ na-aga n'ihu iji ọwà mmiri mere ebe ikpofù ahịhịa, na-agbànyèghị ọkwà niile gọọmenti steeti ahụ na-ama bànyere nke ahụ, ya na ajọ ọnọdụ dị iche iche nke ahụ pụrụ iwèta.

Ọ kpọpụtàsịrị ihe dị iche iche nke ahụ pụrụ ibute, ọ kachasị ma mmiri bido izò, ma kwuo na nke ahụ aghàghị ịkawanye njọ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa n'ihu ịwụnye ahịhịa n'ọwà mmiri.

Maazị Obidiegwu, onye katọkwàrà otu ụfọdụ ndị mmadụ si esu ihe ọkụ aghara aghara, dọzịrị ndị na-emegasị ihe dị otu ahụ aka na ntị ka ha sepu aka na ya, ma na-ekponye ahịhịa n'ebe dị iche iche gọọmenti wepụtara maka ime nke ahụ.

O kwùrù na onye ọbụla a ga-ahụ n'akparamagwa ahụ, ga-abụ onye gọọmenti ga-anwụchikọ, ma kpụpụkwa ya ụlọ ikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ya ji mmanụ.

Na ntụnye nke ya, ezi nwa amadi ahụ mere ka gọọmenti mara ma bịa ileru anya bányere otu ndị mmadụ si ekpofù ahịhịa na Nnewi ahụ n'ebe ezighị ezi, bụ Maazị Ifeanyị Nwosu tìnyékwara ọnụ, ma kpọkuo ọhanaeze ka ha nyere gọọmenti aka n'ịkwalite ezi amụma adịmọcha na steeti ahụ, site n'irube isi nye ntụziaka ya, ya na izèrè ihe ọbụla ga-ebuta imetọ gburugburu steeti ahụ n'ụdị ọbụla nakwa n'oge ọbụla.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.