U-AYA Na U-AWA Achịkọbala Ọgbakọ Ekpere n'Awka

Sep 2, 2020 - 21:11
Jan 28, 2021 - 21:13
 0
U-AYA Na U-AWA Achịkọbala Ọgbakọ Ekpere n'Awka

Izunna Okafor

Òtù jikọtara ndị ntorobịa n'Anambra a maara dịka 'United Anambra Youth Assembly (U-AYA)' na nkè ụmụnwaanyị a maara dịka 'United Anambra Women Assembly (U-AWA)' nọrọ na nsonso a wee chịkọba nnukwu ọgbakọ ekpere dara ụda maka steeti Anambra.

Ya bụ nnukwu ọgbakọ ekpere bụ nke weere ọnọdụ n'ogige Ọkammụta 'Dora Akunyili Women Development Centre' dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ndị isi ụka dị iche iche nakwa ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba ndị iche iche na steeti ahụ.

Mmemme ahụ nke isiokwu ya bụ 'Anambra 2021: Our Collective Project', nke bụ 'Anambra 2021: Ọrụ Dịịrị Anyị' bụkwa nke a nọrọ na ya wee kpee usoro ekpere dị iche iche, ma kpekwa ekpere pụrụ iche maka nhọpụta ọkwa ọchịchị a ga-eme na steeti ahụ n'ime ọnwa Nọvemba ahọ na-abịa abịa.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi òtù abụọ ahụ, bụ Maazị Chinedu Obidigwe mere ka a mara na isi sekpụ ntị e jiri chịkọba ọgbakọ ekpere ahụ bụ iji chọọ ihu Chineke banyere nhọpụta ọkwa Gọvanọ a ga-eme na steeti ahụ n'ahọ 2021, ka Chineke wee jiri aka ya họpụta onye ga-achị steeti ahụ nke ọma ma durukwa ha ruo ala e kwere na nkwà.

Maazị Obidigwe, onye ọ bụ ya na-anọchitekwa anya ọgbọ nta nkwàdo 'Anambra East' na 'Anambra West' n'ụlọ nnọchianya etiti ala Nigeria, kwùrù na Anambra chọrọ onye ñụjuru mmiri ara afọ dịka Gọvanọ Willie Obianọ, ma kwuo na n'uche ya, na ọ ga-akakwa mma ma ọ bụrụ na ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ịchịkọba nhọpụta ọchịchị n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission (INEC)' malite iji usoro ọgbara ọhụụ dijitaalụ wee na-eme ntụliaka, n'ihi na nke ahụ ga-enye aka ibelata wuru-wuru, igwù ojoro, na nsogbu maọbụ ihe iche aka mgba ndị ọzọ a na-adapụtakarị ma e mebe ntụliaka.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Signage and Advertisement Agency', Maazị Jude Emecheta kọwara ya bụ ọgbakọ ekpere dịka nke magburu onwe ya, ma kpọkukwa Ndị Anambra ka ha hie asaa n'anya ma tụnyere onye ma nke ekwe na-akụ ka ọ chịa Anambra n'ahọ na-abịa abịa.

E wezùga ekpere e kpegasịrị ụbọchị ahụ, a nọrọ na ya bụ mmemme wee bụọ abụ otuto na abụ ofufe dị iche iche, bụzị nke mere ka ọ zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.