Soludo Enyela Ndị Eze Ọdịnala Ọhụrụ Atọ Asambodo, Dụọ Ha Ọdụ Banyere Ọchịchị na Nchekwa Obodo
Izunna Okafor dere akụkọ a
Ọ na-adị mma a kpụọ Diji, a kpụnye ya óké ji na ngwaọrụ n'aka; maka na ọ na-abụ a nyụchaa nsị, a kapịàghị̀ ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò.
N'ịgbasò nke a, óké ọṅụ dàrà na nsonso a dịka aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo nyèrè eze ọdịnala ọhụrụ atọ asambodo, iji malite ọrụ n'ozuzuòkè dịka ndị ndu obodo ha dị icheiche.
Ndị eze ọdịnala ọhụrụ atọ ahụ e nyere asambodo bụ Igwe Obiora Anachuna nke Nkwelle-Ezunaka (dị n'okpuruọchịchị ime obodo Oyi); Igwe Timothy Ifurunwa nke Ihite (dị n'okpuruọchịchị ime obodo Orumba South); na Igwe Francis Chikezie nke Azia (dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ihiala).
Mmemme inye asambodo ahụ bụ nke weere ọnọdụ na nsonso a n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti, ndị nwunye na ụfọdụ ndị obodo ndị eze ọdịnala atọ ahụ.
N'okwu ya oge ọ na-enyefe ha àsàmbodo ahụ na mmemme ahụ weere ọnọdụ n'izuụka a, Gọvanọ Soludo kọwàrà omenala Igbo, ọdịnala Igbo, na ọdịbendị dịka ihe dị ezi mkpa na nke bakwara urù nke ukwuu, ma kwupụta mkpa ọ dị na ụmụafọ Igbo niile na-asọpụrụ ma na-echekwaba ihe ndị ahụ nke ọma, malite na ndị eze ọdịnala obodo ọbụla wee ruo na ndị ha na-achị achị.
Gọvanọ Soludo kọ̀wàkwàrà ndị eze ọdịnala dịka ndị bara oke úrù na ndị nwere nnukwu ọrụ nà ntụnye pụrụ iche n'ịkwàlite ezi nchekwa, udo, ọganihu, na mmepe tọrọ àtọ̀ n'obodo ha dị icheiche.
O kwuru na ọ bụ mmasị ọchịchị ya ịkwàlite ezi ọnọdụ mmepe n'ime-ime obodo niile dịgasị icheiche e nwere na steeti Anambra, ma kpọpụtasịa ụfọdụ ụzọ dị icheiche o sigòrò mee nke ahụ n'ime afọ ole ọ nọgòrò n'ọkwa.
Ya bụ Gọvanọ kpọkùkwazịrị ma dụ̀ọ́ ndị eze ọdịnala ahụ ọdụ ka sonyesie ike n'ịkwàdo na imezùputa atụmatụ ọrụ mmepe dị icheiche ọchịchị ya ji n'aka na steeti ahụ. Ọ dụkwara ha ọdụ ka ha gbaa mbọ kwàlite udo na ịdịnotu n'obodo ha dị icheiche, ma hụkwa na e nwere ezi mmekọrịta n'etiti ha na ndị ji ọkwa ọchịchị n'obodo ha, na ndị ha na-achị; ọbụna dịka o kwèrè ha nkwà ezi nkwàdó nke ọchịchị ya.
N'okwu nke ya na mmemme ahụ, Kọmishọna ahụ na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala, bụ Maazị Tonycollins Nwabunwanne kọwàra na nhọpụta ahụ a họpụ̀tàrà na asambodo ahụ e nyere ndị eze ọdịnala ahụ bụ nke dabàrà adabà ma gbasòkwa usoro iwu na-achị steeti Anambra.
O kelere Gọvanọ Soludo maka inye eze ọdịnala atọ ahụ asambodo, bụ nke ọ kọwara na o meela ka echichi ha na ọnọdụ ha dịka ndị eze ọdịnala obodo ha zuo òkè. O kwukwara na nke ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụtara ìhè n'ịkwàlite udo na ọnọdụ mmepe bụ ịgbà n'obodo atọ ahụ.
Ya bụ Kọmishọna kpọkùkwàzị̀rị̀ ndị eze ọdịnala ahụ ka ha jiri ikike ahụ na e nyere ha wee rụọ ọrụ nke ọma ma jeere obodo ha nà steeti Anambra ozi n'ikwesiri Chineke na mmadụ ntụkwàkwsịobi. Ọ gwakwàrà ha ka ha jiri eziokwu, égwù Chineke na ịkwụba aka ọtọ wee duo obodo ha, ma gharakwa ime ihe ọbụla ga-akpụtọ ùgwù ha maọbụ metọ̀ọ́ aha steeti ahụ n'ụdị ọbụla.
N'okwu ha n'otu n'otu, ndị eze ọdịnala atọ ahụ kèlèrè Gọvanọ Soludo na ọchịchị steeti Anambra maka inye ha asambodo ahụ, bụ nke gosiri na ha abụrụla ndị gọọmenti mà dịka ndị eze ọdịnala obodo ha dị icheiche. Ha kwekwazịrị nkwa na site n'enyemaka Chineke, na ha ga-eji ocheeze ha wee rụọ ọrụ nke ọma, kwàlite udo, nchekwa na ọnọdụ mmepe n'obodo ha dị icheiche, na steeti ahụ n'izugbe.
Inye ndị eze ọdịnala ahụ asambodo ha kpọmkwem site n'aka Gọvanọ Soludo sò n'otu n'ime ihe pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ.
0 Comments