Mmepe Obodo

Gọọmenti Ekwela Nkwa Mgbataọsọ Mbize Okporoụzọ Ukpor-Nnewi

Gọọmenti Ekwela Nkwa Mgbataọsọ Mbize Okporoụzọ Ukpor-Nnewi

Gọọmenti steeti Anambra ekwela nkwa mgbataọsọ n'ebe ahụ mbize na-enye nsogbu ma na-akpakwa ike na mpaghara okporoụzọ ahụ siri Ukpor gaa Nnewi.

Kọmishọna na-ahụ maka Gburugburu na steeti ahụ, bụ Maazị Felix Odimegwu bụ ya kwupụtara nke a oge onye ntaakụkọ anyị na-agba ya ajụjụọnụ banyere ihe gọomenti na-eme maka ya …

Narị Otu Ụbọchị n'Ọkwa: Ọchịchị Soludo na Ụfọdụ Ihe O Mepụtagoro

Narị Otu Ụbọchị n'Ọkwa: Ọchịchị Soludo na Ụfọdụ Ihe O Mepụtagoro

Ụnyaahụ ka o mere mkpụrụ ụbọchị otu narị aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo jiri banye n'ọkwa dịka gọvanọ nke ise steeti Anambra nwegoro n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya.

Gọvanọ Soludo bụ onye e duru n'iyi ọrụ n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ 2022, bụkwa …

N'Imo, Nwoke Akwaala Arịrị Maka Nwa Ya Nwụrụ n'Ihe Mbigbọ

N'Imo, Nwoke Akwaala Arịrị Maka Nwa Ya Nwụrụ n'Ihe Mbigbọ

 Ka ọ gachara izuụka olenaole mmadụ dị otu narị na iri ise n'ọnụọgụ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba dapụtara n'ebe a na-esucha mmanụ agbidi, nke iwu akwadoghị (illegal refinery) dị n'Abaezi, Egbema, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ohaji/Egbema na steeti Imo; nna otu n'ime ndị ahụ ọkụ gbagburu, Maazị Uche Okwuodo enwebeghị ike …

N'Anambra, Ndị Ọkịja Akpụọla Arụsị Maka Mpụ na Arụrụala

N'Anambra, Ndị Ọkịja Akpụọla Arụsị Maka Mpụ na Arụrụala

Ọ na-abụ anụ gbaa ajọ, ọsọ a gbanyere ya ajọ egbe, maka na ọ na-abụ anụ febe ebeghị ebe, dinta agbaba atụghịa atụ.

Ka ọ dị taa, ndị obodo Okija, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ihiala, nke steeti Anambra ejirila otu olu kwekọrịta ma kpụọ arụsị megide mpụ na arụrụala na ajọ …

Soludo Ezigala Ámụmà Ego Ọrụ A Hazigharịrị Ahazigharị n'Ụlọ Omeiwu Anambra

Soludo Ezigala Ámụmà Ego Ọrụ A Hazigharịrị Ahazigharị n'Ụlọ Omeiwu Anambra

Gọvanọ steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ezigala ámụmà ego ọrụ e mezigharịrị emezigharị ewepụtala ndenye ego ruru ijeri naira 170 nke afọ 2022 edegharịrị edegharị n'ihu ụlọ omeiwu steeti Anambra.

Ya bụ amụma ego ọrụ bụ nke mperi dị na ya siri na otu narị ijeri naịra iri anọ na …

Gọọmenti Anambra Anapụtala Ala Ya Ndị Mmadụ Kpààrà n'Ọnịshà

Gọọmenti Anambra Anapụtala Ala Ya Ndị Mmadụ Kpààrà n'Ọnịshà

Ọkọchị gwara ndị na-akpara ala nna ya ka ha jisie ike, mana ọ bụ mgbe nwanne ya nwoke bụ udummiri batara, o were aka ya kwuo ebe ókè ala siri dị.

N'ịgbasò nke ahụ, gọọmentị steeti Anambra awụchiela n'Ọnịsha, wèé màlite ịnapụtasị àlà ya dị iche iche ụfọdụ ndị mmadụ iwu …