Ezinaụlọ Nwoke Ndị Ọkada Tigburu Na Lagos Ekwuputala Usoro Elimozu Ya

Ezinaụlọ Nwoke Ndị Ọkada Tigburu Na Lagos Ekwuputala Usoro Elimozu Ya

 Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

 
Ụgwọ ndị dị ndụ ji onye nwụrụ anwụ bụ ịdọnye ahụ ya n'ala. 

N'ịgbasò nke a, ndị ezinaụlọ onye ahụ na-ahụ maka ngwaegwu, bụ̀ Sunday David Imoh, onye ndị ọkada tigburu ma gbaa ya ọkụ na Lagos, ekwuputala usoro ha ga-eji lie ozu ya, iji sị ya laa n'udo.
 Dịka ha siri kwu, ọ bụ ụbọchị Fraịdee, abalị atọ nke ọnwa Juunu ka elimozu ya ga-ewere ọnọdụ kpọmkwem.
 Ozi ahụ kwuru na mmemme elimozu ya ahụ ga-amalite ụbọchị Tọzdee, abalị abụọ nke ọnwa Juunu, dịka a ga-emere ya emume ịbụ abụ n'ụlọụka ‘Church of God Mission Intl. V.l. Zonal Headquarters, Garden City of God’ dị n'Oniru, Lagos.
  Banyere elimozu ya kpọmkwem ụbọchị Fraịdee, ndị ezinụlọ ahụ kwùrù na ọ ga-amàlite n'elekere iri nke ụtụtụ, ma mekwa ka a mara hoohaa na ọ bụ naanị ndị e ziri ga-abịa ya bụ akwamozu 
 Nke ahụ gachaa, a ga-aka ụka ịtụ mmamma, n'elekere asatọ nke ụtụtụ ụbọchị ụka, abalị ise nke ọnwa Juunu, n'ụlọụka Church of God Misson Intl., Ikeja Lagos.
 Ọ dị ncheta na e tigburu Imoh ma gbaa ya ọkụ ụbọchị Tọọzdee, abalị iri na abụọ nke ọnwa Maachị na mpaghara Lekki dị na steeti Lagos. Ụwa niile katọ̀rọ̀ ọnwụ ya ma na-akpọ oku ka e nwee ikpe nkwụmọtọ n'isi ya. N'ịgbasò nke ahụ, a nwụchikọọla ụfọdụ ndị mmadụ a na-enyo enyo na aka ha dị n'ọnwụ nwoke ahụ, mà màchie ọkada ịgbazi na mpaghara ahụ ugbua.

0 Comments

Leave a Comment