Obianọ Etòóla Etu Ọrụ Si Aga n'Àkwàmmiri Naija

Mar 21, 2022 - 22:24
 0
Obianọ Etòóla Etu Ọrụ Si Aga n'Àkwàmmiri Naija

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka chịpụ̀rụ̀ steeti Anambra, bụ Maazị Willie Obianọ etòóla etu ọrụ nṅsi aga n'ike n'ike n'ebe ahụ gọọmenti etiti na-arụ Àkwà Mmiri Naịja Nke Abụọ n'Ọnịtsha.

Maazị Willie Obianọ kwupụtara nke a na nsonso a oge ọ gara njem nleta ịhụ ka ọrụ si aga n'ebe ahụ, bụkwa nke ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ sòrò ya wee gaa.

N'okwu ya n'ebe ahụ, o chètàrà na ọ bụ n'abalị mbụ nke ọnwa Septemba ahọ 2018 ka e bidoro ya bụ ọrụ, ma kọwaa na gọọmenti ya wụbàtàrà ma tinye ọnụ n'okwu oge ndị obodo ebe ahụ a na-arụ ọrụ ahụ na ndị kọntraktọ ji ọrụ ngo ahụ nwere nsogbu, ma gbakwa mbọ pụrụ iche iji hụ na e wetere ya bụ nsogbu n'isi njedoba.

O kèlèrè ọchịchị onyeisi ala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari nàkwà ụlọọrụ ji ọrụ ngo ahụ maka etu ọrụ ahụ si aga n'ike n'ike, ma gakwa n'ihu kpọpụtasịa ọtụtụ uru dị icheiche àkwà mmiri ahụ ga-eweta na mpaghara ahụ, na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, nà mpaghara ala Nigeria n'izugbe ma ọ bụrụ na a rụchaa ya.

O kwukwàrà na ọ bụ n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febụwarị ka e kwesiri ịgbape ya bụ àkwà mmiri, mana a rụchazịghị ya tupu oge ahụ n'ihi nsogbu so ọrịa nje COVID-19 wee bịa.

Dịka ọ na-akọwa na a rụchaala otu akụkụ nke ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnitsha, rụchaa ma gbapee ebe nchekwa ihe ọkpụ ‘Ziks Mausoleum’, o kelekwazịrị ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari, ma rịọ ya doo ka o jisie ike n'ọrụ ahụ ma rụchapụkwa ya n'oge a kàrà àkà.

N'okwu nke ya, onyeisi ọrụ n'ụlọọrụ ngo ji ọrụ ahụ, bụ ụlọọrụ Julius Berger, Maazị Wiesser Fredrich, nyèrè nkọwa banyere ihe icheakamgba na ihe mkpọbiụkwọ dị icheiche ha zùtèrè n'ọrụ ahụ, ma kọwazie na ha na-abịazị na njedobe nke ya bụ ọrụ, ọbụladị dịka o kèlèrè aka Maazị Willie Obianọ maka ezi nkwàdo dị icheiche o nyere ha iji hụ na ya bụ ọrụ  na-aga aga.

O mere ka a mara na ogologo ya bụ àkwà mmiri dị otu kilomita na ụma isii, tinyere okporoụzọ di e si aga ya, nke ruru kilomita asaa n'akụkụ Anambra na kilomita at na ụma atọ n'akụkụ Asaba.

Ọ kọwara na ọrụ okporoụzọ ahụ nọ n'ogoogo pasenti iri asatọ na atọ nke nrụcha ya, ebe àkwà mmiri ahụ nọ n'ogoogo pasenti iri iteghete na atọ nke nrụcha ya ugbua.

Na ntụnye nke ya n'ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiofor kọwàrà na a ga-agbape ya bụ àkwà mmiri n'ọnwa Ọktoba ahọ a.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484