Ndị ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka Akaala Ụka Wenezdee Ntụ

Mar 3, 2022 - 18:30
Mar 3, 2022 - 19:57
 0
Ndị ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka Akaala Ụka Wenezdee Ntụ


Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ndị ụka ka ha mee ka mmekọrịta ha na Chineke siwanye ike ma bụrụkwa nke ga-adịgide oge niile.

Ashbishọọpụ nke ụka Angịlịkan na mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka, bụ Ashbishọọpụ Alexandar Ibezim bụ ya nyere ndụmọdụ a n'okwuchukwu ya na mmemme ofufenro Wenezdee ntụ, bụ nke Dayọsiisi ahụ soro ndị otu Kraịst n'ụwa gbaa gburugburu wee merùbe.

N'okwuchukwu ya n'ụlọụka 'Cathedral Church of St. Faith’ dị n'Awka bụ ebe dayọsiisi ahụ nọrọ wee malite ofufènrò ahụ ụnyaahụ, Ahsbishọọpụ Ibezim nyere nkọwa banyere mpụtàrà igbu ntụ, dịka ndị ụka si emerùbe ya. O mekwara ka a mara na ya bụ mmemme e ji amalite oge Lentị bụ mgbe a na-ejikwa echetara ndị ụka na ha bụ ndị mmehie, Kraist wee bịa nwụọ ọnwụ n'ihi mmehie ha, iji mee ka ha na Chineke dị n'udo.

Ọ dụkwazịrị ndị ụka ọdụ ka ha were oge a chọọ ihu Chineke n'onwe ha, doo onwe ha nsọ, nyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, guzosie ike n'ekpere, cheta na onye ọbụla ga-anwụ anwụ, bụrụ ndị na-agbaso udo, ma mekwazie ka mmekọrịta ha na Chineke siwanye ike karịa ka ọ dị na mbụ.

Ya bụ ofùfènrò dọtàkwàrà ọtụtụ ndị ọrụ ụka sitere dayọsiisi ahụ nà ndị nwunyè ha, ma bụrụkwazie nke a nọrọ na ya wee kpee usoro ekpere dị icheiche ma kpekwazie ndị sonyere na ya ntụ n'ihu.

Ndị ụlọụka dị icheiche na dayọsiisi ahụ mèchàkwàziere wee nwee ofufènrò igbu ntụ ahụ n'ụlọụka ha dị icheiche n'oge mgbede.

Ya bụ ofufenro oriri nsọ na igbu ntụ gàkwàzịrị nke ọma n'ụlọụka ‘Anglican Church of Redemption Parish’ dị n'Awka, bụ ebe ndị nchụaja nọ n'ebe ahụ, nke gụnyere Ven. Obiora Alokwu na Ụkọchukwu Lucky Onebunne nọkwàzịrị wee gọzie ma kpee ndị mmadụ sonyere na ya ntụ n'ihu, kọwaara ha ihe oge a pụtara, ma gwakwazie ha ihe a na-atụ anya n'aka ha n'ime oge Lentị  a dịka ndị ụka.

A nọkwazịrị n'ebe ahụ wee kpee ekpere ma bụọ abụ dị icheiche, nke mere ka ha bụ ofufènrò jupụta n'ebubè.


Ụbọchị Wenezdee ntụ (Ash Wednesday) na-egosi mmalite oge Lentị, ma bụrụkwa nke na-echetara ndị ụka na onye ọbụla dị ndụ ga-emecha nwụọ anwụọ, maka na mmadụ bụ ntụ na aja.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484