Soludo Etòóla Egwuonwu Maka Imepe Ụlọ Azụmahịa ‘Zara Stores’ n'Awka

May 26, 2022 - 20:56
 0
Soludo Etòóla Egwuonwu Maka Imepe Ụlọ Azụmahịa ‘Zara Stores’ n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya.

N'ihi nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma etoola ndị Anambra zara oku 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ ọchịchị ya na-akpọ, wee welataruo akụnụba ha ụlọ, site n'ịbịa rụọ ụlọọrụ, ụlọahịa, ụlọ mmepụta ngwahịa, na na ihe mwunye ndị ọzọ dị icheiche n'ime steeti ahụ.

Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a site n'ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasaozi ya, bụ Maazị Christian Aburime, oge ọ na-etò onyeisi ụlọọrụ na-emepụ̀ta Osikapa Anambra (Anambra Rice), bụ Chiifu Akai Egwuonwu, maka ịrụ na ịgbape ọmarịcha ụlọahịa ọhụrụ, bụ nke a kpọ̀rọ̀ ‘Zara Stores’ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

O kwèrè nkwà na gọọmenti ga-aga n'ihu inye ya na ụlọahịa ya ezi ọnọdụ dị larịị maka azụmahịa ha, ọkachasị dịka o siri metụta inye ya ezi ọnọdụ ga-enye aka ime ka azụmahịa na arụmọrụ ha na-agawanye n'ihu n'enweghị ihe mkpọbịụkwụ ọbụla.

Gọvanọ Obianọ kpọkukwazịrị Ndị Anambra bigasị ebe dị icheiche n'ala Nigeria nà ná mba ofesi ka ha sokwa za òkù ‘Akụ Ruo Ụlọ’ ahụ ọchịchị ya na-akpọ site n'iwèlata akụnụba ha ụlọ, maka na nke ahụ ga-enyekwa aka n'ịkwalitekwu ọnọdụ mmepe steeti ahụ n'ogoogo kacha elu, ya na ikèpụ̀tàrà ndị ntorobịa ohere ọrụ, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ nke ahụ ga-ewèta.

Ya bụ agadaga ọmarịcha ụlọahịa bụ nke a rụrụ na ncherịtaihu njikọụzọ Kwata, bụ ‘Kwata Junction’ dị n'Awka, ma bụrụkwa nke a nọrọ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezdee wee mee mmemme mgbape ya.

Ịgbape na ịgọzi ụlọahịa ahụ kpọmkwem bụkwa nke e mere site n'aka Bishọọpụ Jonas Benson Okoye nke ụka Katọlik na dayọsis Nnewi. Ya bụ mmemme dọ̀tàkwàrà ọtụtụ ndị ụkọchukwu, ndị ji ọkwa ọchịchị, nà ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ ụlọahịa, Bishọọpụ Okoye kèlèrè Chiifu Egwuonwu maka ịga n'ihu na-ewunye akụnụba ya na steeti ahụ.

Na nzaghachi, onye nwe ụlọ ahịa ahụ, bụ Chiifu Akai Egwuonwu nyèrè nkọwa banyere ụlọahịa ahụ, ihe dị icheiche a na-eme ebe ahụ, na ebumnobi o jiri hibe ya, ma kpọkùkwazie ọhaneze ka ha bịa n'ụlọahịa ahụ maka ịzụrụ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ ha, ya na ihe e ji ebi ụlọ, ákwà a na-eyi n'ahụ, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka, tinyekwuoro na e nwèkwàrà ebe a na-elegharị anya, ebe a na-emesapụ ahụ, na ebe a na-atụ ndụ mmanụ.

O kwèrè nkwà ịga n'ihu na-atụnye ụtụ nke ya n'ịkwàlite mmepe obodo, n'ikewàpụ̀tàra ụmụafọ steeti ahụ ohere ọrụ, na n'ịkwalite ọnọdụ akụnụba steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484