Yahoo Yahoo: EFCC Ejidekwuola Mmadụ 25 Ọzọ

Aug 18, 2022 - 08:32
 0
Yahoo Yahoo: EFCC Ejidekwuola Mmadụ 25 Ọzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachara ihe dịka izuụka anọ e jiri nwụdechaa mmadụ iri asaa na anọ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti Rivers maka ‘Yahoo Yahoo’, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịmazụ ego ọhaneze na igwu ojoro, bụ ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ ejidela mmadụ iri abụọ na ise (25) ọzọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro na ndị na-ezu ohi site n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, bụ ndị a maara dịka ndị ‘Yahoo Yahoo’ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti Lagos.

Dịka ozi si n'aka ngalaba mgbasaozi nke ụlọọrụ EFCC siri kọwaa, mmadụ anọ n'ime ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ na mpaghara Palmcity Estate, Lekki dị na Lagos n'abalị iri nke ọnwa a, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ n'ọnụ ụtụtụ oge e nwetechara ozi bayere ha na arụrụala ha.

Ya bụ ozi gara n'ihu kọwaa na mmadụ iri na otu ndị ọzọ bụ ndị e jidere na mpaghara City-View Estate dị n'akụkụ okporoụzọ awara-awara ahụ siri Lagos gaa Ibadan n'abalị iri na abụọ nke ọnwa; ma bụrụkwa ndị e nwetere ụfọdụ ihe dị icheiche n'aka ha, bụ nke na-egosi na ha dị ka ebubo ahụ e boro ha.

Aha mmadụ iri na ise ahụ e jidere bụ Oyewole Damilola, Ovin Adekunle, Ovin Nicholas, Ridwan Iyiola, Aregbesola Tobiloba, Oladosu Saheed, Oseni Omotara, Abel Durotimi, Oyeneye Rilwan Adetola, Omoregbe Destiny Nosa, Evbonaye Olaleye, Adeyemo Abiola, Temitope Ajetonmobi, Dare-Ilori Oreoluwa David, Adekanye Ayodeji Ezekiel, Osagie Harry Odosa na Arowolo Oluwafemi Isaac.

Ndị ọzọ bụ: Agbaje Jackson Babatunde, Owolabi Temiloluwa Dominion, Fadipe Biodun Idris, Agbayo Moshood Oriyomi, Sylvester Evans, Oshokoya Olaoluwa Muritalah, Omotoye Collins Oluwaseun na Hassan Abdulwahab Oladimeji.

Mmadụ abụọ n'ime mmadụ iri abụọ na ise ahụ e jidere ka e kwukwàrà na ọ bụ otu nne na otu nna mụrụ ha abụọ.

Ihe dị icheiche e nwetegasịrị n'aka ndị ahụ gụnyèrè ọtụtụ ụgbọala dị oké ọnụ ahịa, igwe kọmputa, ekwentị, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484