Ụwa Etoola Kadịnal Okpalaeke Maka Ọkwa Ọhụrụ Ya

Ụwa Etoola Kadịnal Okpalaeke Maka Ọkwa Ọhụrụ Ya

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ekele na otuto zòrò ka mmiri na na nsonso a dịka mba ụwa gbara akaebe maka ịba ụba amara Chineke n'isi Bishọp Peter Okpalaeke maka mbuli ahụ e buliri ya ọhụrụ dịka Kadịnal site n'aka Poopù Francis.

Bishọp Okpalaeke bụ Bishọp ụka Katọlik na dayọsis Ekwulọbịa dị na steeti Anambra, ma bụrụ onye Poopu kpọlitere n'ọkwa ịbụ Kadịnal n'ọnwa Mee ahọ a.

Ọ bụkwazị na nsonso a ka a nọrọ n'ụlọuka St. Peters' Square, Vatican City nke dị na mba Rome wee mee emume ichi Bishọp Okpalaeke echichi ahụ kpọmkwem site n'aka Poopù, onye kpubekwara ya okpu mmee mmee bụ okpu Kadịnal n'isi, nke na-egosi na echichi ya ezuola òkè.

Ya bụ mmemme ikpube ya okpu bụ nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ steeti Anambra na ụmụafọ Nigeria, ndị siri Nigeria wee gaa ịnọ̀nyere Kadịnal Okpalaeke; ma bụrụkwa mmemme dọtakwara ọtụtụ ndị ọzọ sitere mpaghara ebe dị icheiche n'ụwa gbaa gburugburu, n'ihi na e nwekwara ndị Kadịnal ọhụrụ iri abụọ ọzọ sitere mba dị icheiche e kpubekwara okpu Kadịnal ụbọchị ahụ.

N'ozi ekele ya nye Kadịnal Okpalaeke, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo kọwàrà mbuli ahụ e buliri ya n'ọkwa dịka nnukwu ihe akụkọ ọgbụgbaama, ọkachasị n'ilekwasa anya n'ihe Bishọp ahụ gabigagoro n'ọrụ ụka ya, na otu o si arụ ọrụ ya n'ikwesi ntụkwasịobi.

O kpekwàrà ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi na inye ya ogologo ndụ na ahụike iji na-ejere ya ozi, ọbụladị n'ọkwa ọhụrụ a dịka Kadịnal.

Ụfọdụ ndị ọzọ dị icheiche siri Anambra ga nọnyere Kadịnal Okpalaeke ụbọchị ahụ gụnyere Oriakụ Gọvanọ Soludo, bụ Nonye Soludo; onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdó Anambra South n'ụlọ omeiwu sineeti, bụ Sinetọ Ifeanyi Ubah; ògbò ya nke na-anọchite anya mpaghara Anambra Central, bụ Iyom Uche Ekwunife, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Ọtụtụ ụmụafọ Nigeria ndị ọzọ zigara Kadịnal Okpalaeke ozi ekele banyere mbuli ahụ e buliri ya n'ọkwa gụnyèrè Onyeisiala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari; onye ji aha otu ndọrọndọrọ Labour Party azọ ọkwa Onyeisiala Nigeria n'ahọ na-abịa abịa, bụ Maazị Peter Obi; onyeisioche otu ndọrọndọrọ All Progressives Grand Alliance (APGA) n'ala Nigeria, bụ Maazị Victor Oye, tinyéré ọtụtụ ndị ọzọ ma ndị ọtụtụ dị icheiche.

Mbuli ahụ e buliri Bishọp Okpalaeke mezịrị ka ọ bụrụ otu n'ime ndị Kadịnal ise ala Nigeria nwegoro, nke gụnyere Dominic Kadịnal Ekandem (lagoro mmụọ), Francis Kadịnal Arinze, Anthony Kadịnal Okojie na John Kadịnal Onaiyekan n'otu n'otu.

N'okwu ọ gwara ụlọ mgbasaozi Vatican City News n'ajụjụọnụ ha gbara ya oge e kpubechara ya okpu Kadịnal ahụ, Bishọp Okpalaeke kwùrù na o wèrè ya anya oge ọ natara ozi banyere mbuli n'ọkwa ahụ, ma gbakwa akaebe na Chineke ma anya ihe niile mere, dịka O siri gosipụta na ndụ ya na n'ije ozi ya.

O kwuru na amara Chineke, ahụmahụ na ntachiobi o nwegoro n'ije ozi ya dịka onye nchụaja so n'ihe bulitere ya n'ogoogo ọhụrụ ahụ, dịka o siri bụrụ mmasị Chineke.

O mere ka a mara na n'agbànyeghị ihe dị icheiche ọ gabigara nà ekworo niile e kworo ya n'oge gara aga, na Chineke nyèrè ya ụdịrị udo nke ọ hụtabeghị, dịka Kraịst kwuru n'Akwụkwọnsọ Jọn 14:27.

Ọ dị ncheta na e kworo Okpalaeke nnukwu ekworo oge e chichara Bishọp wee ziga ya na dayọsis Ahịara nke steet Imo, bụ ebe ụmụafọ steeti ahụ busoro ya agha dị egwu, jụ inabata ya dịka Bishọp ha, maka na ọ bụghị nwaafọ steeti Imo, nke mezịrị ka ọ laghachi na steeti Anambra be nna ya, wee nọrọ, bụrụ Bishọp enweghị dayọsis, wee ruo mgbe e keputere dayọsis Ekwulọbịa, wee ziga ya ebe ahụ, bụkwazị ebe ọ nọrọ ihe erughị ahọ atọ tupu e bulie ya n'ọkwa dịka Kadịnal. 

Nke a mezịrị ka ọ bụrụ onye kachasịzịkwa Bishọp ụka Katọlik niile nọ na Nigeria taa n'ọkwa.

Nke a wee bụrụ ka ya bụ nkume ndị na-ewu ụlọ juru siri mechaa wee bụrụzie isi nkuku ụlọ.