Ụmụnwaanyị Achịna Akesaarala Ụmụakwụkwọ Ihe Nkwàdó

Izunna Okafor dere akụkọ a
Otu otu nnọrọonwe a maara dịka ‘League of Achina Women Professionals (LAW-P) ekesaarala ọtụtụ ụmụakwụkwọ nọ n'ogo praịma ihe nkwàdó dị icheiche e ji akwàdó agụmakwụkwọ n'okpuruọchịchị ọchịchị ime obodo Aguata nke steeti Anambra.
Ya bụ òtù bu otu jikọtara ụmụnwaanyị obodo ahụ, ndị a lụrụ alụ, na ndị kwụụrụ onwe ha n'obodo Aguata nke steeti ahụ; ma bụrụkwa ndị na-atụnye ụtụ ma na-enyekwa aka n'ụzọ pụrụ iche n'ịkwàlite mmepe obodo site n'ọtụtụ ụzọ dị icheiche, site na nkwàdó ndị òtù ha.
Ndị òtù ahụ nọ̀kwàrà na nsonso a wee gaa n'ụlọakwụkwọ ‘Central School, Obinikpa Primary School; ụlọakwụkwọ ‘Migrant Farmers School’, ụlọakwụkwọ ‘Progressive School’ na ụlọakwụkwọ ‘Primary School, Eke Achina’.
Mmemme ahụ nke afọ a bụ̀ nke a kpọrọ ‘Ụzọ Mgbapụ̀ n'Ụbịam’, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya kesaara ụmụakwụkwọ ahụ ụfọdụ ihe dị icheiche, nke gụnyèrè àkpà akwụkwọ, akwụkwọ e ji ede ihe, mkpịsị odee, ihe oriri, na ihe ndị ọzọ.
N'okwu ya oge ọ na-agbape nkesà ihe nkwàdó ahụ, onyeisi òtù ahụ, bụ Oriakụ Chinwe Mba kọwàrà na ebumnobi nke ahụ bụ iji hụ na nwata ọbụla n'Achịna nwètèrè ezigbo agụmakwụkwọ, site n'inye ha ihe dị icheiche ga-enye aka ịkwàlite agụmakwụkwọ ha. O kwukwàrà na agụmakwụkwọ so n'ihe na-akwàlite mmepe na ọganihu obodo ọbụla, bụkwazị nke mere ha ji atụnye ụtụ pụrụ iche na ya.
Ọ gàkwàrà n'ihu kwuo na ha ga-aga n'ihu itinyere ụmụakwụkwọ ahụ anya n'agụmakwụkwọ ha, wee rukwaa n'ogoogo mahadum, iji hụ na ha gbasoro ngalaba bụ mmasị ha, ma na-enyekwa ndị mere nke ọma n'ime ha ihe nrite na nkwàdó pụrụ iche.
O kèlèrè aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo maka mmasị pụrụ iche ọ na-egosi nà ntụnye pụrụ iche ọ na-eme na ngalaba agụmakwụkwọ, dụọ ya ka o jide ka o ji; ọbụladị dịka ọ rịọkwara ya ka o welitekwuo aka n'ọnụọgụgụ ndị nkụzi ọ na-eziga n'ụlọakwụkwọ ọhaneze (ụlọakwụkwọ gọọmenti), ka ụmụakwụkwọ ahụ wee nwee ike itozuo oke ịkwụdo ndị ògbò ha nọ n'ụlọakwụkwọ nnọrọonwe n'asọmpi.
N'okwu nke ha n'otu n'otu, ndịisi ụlọakwụkwọ ahụ dị icheiche ndị òtù ahụ gara ụbọchị ahụ, nke gụnyere Oriakụ Anastasia Okpalechere, Florence Ezeatuegwu, Edith Ikeluka na Viviana Kpara, kèlèrè ha maka ọmarịcha ọrụ ahụ, ma kpee ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji.
What's Your Reaction?






