Umeh Ejirila Ọṅụ Gbàá Afọ Iri Isii na Abụọ, Tinye Ọnụ n'Okwu A Kpụ n'Ọnụ

Umeh Ejirila Ọṅụ Gbàá Afọ Iri Isii na Abụọ, Tinye Ọnụ n'Okwu A Kpụ n'Ọnụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọha mmụọ na ọha mmadụ ma ụbọchị a mụrụ dike. Ọ na-abụkwa oke ọkụkọ kwaa akwa, ndị mbụ na ndị ègèdè anụ olu ya.

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka nwa amadi ahụ jibụrụ ọkwa dịka Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasaozi na Omenala  n'ime steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Chiifu Maja Umeh merùbèrè emume ncheta ọgbụgba afọ iri isii na abụọ o jiri bịa ụwa.

Ya bụ mmemme dara ụda bụ nke weere ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu n'ime steeti ahụ, nke gụnyèrè Osote Gọvanọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim; Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, Rt. Hon. Uchenna Okafor; Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu, bụ Injinia Felix Odimegwu.

Ndị ọzọ gụnyèrè Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi, Maazị Paul Nwosu; Kọmishọna na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala, Maazị Tonycollins Nwabunwanne; onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation’, Sir Chuka Nnabuife; onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Soludo n'ihe gbasara ime obi aṅụrị na njem nlegharịanya, Dọkịta Bob-Manuel Udokwu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Oke mmemme ahụ wéré abalị abụọ bụ nke e jiri ụka ịtụ mmamma pụrụ iche e mere n'ụlọụka ‘St. Joseph the Worker's Catholic Chaplaincy’ dị n'Awka wee malite n'ụbọchị Fraịdee; nke, mgbe e mèchàrà ya, mmemme oriri na ọṅụṅụ wee sarazie ọkụ n'ùjú na mgbede ụbọchị ahụ n'ebe obibi nwa amadi ahụ dị n'Awka, bụkwa mmemme ndị òtù a maara dịka Domus haziri. A nọkwàrà na ya bụ mmemme, wee merùbekwa ncheta ụbọchị ọmụmụ onye ọzọ bụkwa onye òtù Domus ma bụrụkwa onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdó Ogbaru n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Somto Udeze.

Ka nke ụbọchị ahụ gachara, mmemme oriri na ọṅụṅụ ahụ malitekwara n'ebe ọ kwụsịrị n'echi ya bụ Satọdee, bụ́zị́ nke e mere n'ụlọahịa na ụlọ oriri na ọṅụṅụ ‘Zara Stores’ dị n'Awka, bụkwa nke ọ bụ onyeisi ụlọahịa ahụ, bụ Chiifu Akai Egwuonwu haziri, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu.

Chiifu Umeh, onye a mụrụ n'abalị asaa nke ọnwa Ọktoba afọ 1960, bụ nwaafọ Amichi dị n'okpuruọchịchị ime obodo Nnewi South nke steeti Anambra, ma bụrụkwa onye jigoro ọkwa dị icheiche n'ogoogo dị icheiche na n'òtù dị icheiche, nke gụnyere onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị nye Gọvanọ chịbụrụ steeti Anambra n'oge mbụ, Maazị Peter Obi; Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasaozi na Omenala n'oge mbụ, tinyere ọtụtụ ọkwa ndị ọzọ o jiri.

N'okwu ya oge KA Ọ DỊ TAA na-agba ya ajụjụọnụ banyere mmemme ahụ, Chiifu Umeh kwupụtàrà obi ekele ya nye Chineke maka onyinye ndụ na ezi ahụike, kwupụta obiụtọ ya banyere otu ya bụ mmemme siri gaa siriri-werere, ma kelekwa ndị dị icheiche sonyere nà ya bụ mmemme na ndị nyere aka maọbụ tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ya bụ mmemme gara nke ọma; ọbụna dịka o kpere ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji.

N'akụkọ banyere otu ije ya sigoro gaa kemgbe afọ iri isii na abụọ gara aga, nàkwà otu o siri jegide wee ruo n'ogoogo ọ nọ na ya taa, Chiifu Umeh, kwùrù hoohaa na ụbọchị niile nke ndụ ya bụ ụbọchị obi aṅụrị na ụbọchị inye Chineke ekele. O jikwazị̀ òhère ahụ kpọpụta ma kelekwa ụfọdụ ndị mmadụ ndị nyere ya nkwàdó n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ o wee bụrụ ihe ọ bụ taa, ọkachasị nne na nna ya, bụ Maazị Dominic Umeh na Oriakụ Veronica Umeh; nwunye ya bụ Oriakụ Ngozi Umeh, tinyéré ọtụtụ ndị ọzọ.

N'ụzọ pụrụ iche, o kelèkwàra aka chịbụrụ steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Maazị Peter Obi maka ịhụta ya dịka onye tozuru okè n'etiti ọtụtụ ndị ọzọ, wee kpọlite ya n'ọkwa mbụ n'afọ 2008, bụkwazị ọkwa nke o siri na ya wee banye n'ọkwa ọzọ, wee gbagogide, ruo ogoogo ọ nọ na ya taa.

Banyere echichi ọdịnala dị icheiche ọ natagoro n'ime ụfọdụ obodo dị icheiche dị na steeti Anambra, nke gụnyere Anya Amichi, Ọ̀kwọ̀aka Amichi, Úbóm Aguleri, Enyimba Igboukwu, Omemma Akwaihedi, Ebube Eziama Ikwere, Ichoku Awka, tinyere ọtụtụ echichi nà nkwanyeùgwù ndị ọzọ ọ natagoro; Chiifu Umeh kwùrù na ọ bụ maka ihe dị icheiche o mepụtara, ma n'obodo ndị ahụ ma n'ebe ndị ọzọ na gburugburu steeti ahụ, ka e jiri chigasịa ya echichi ahụ. O nyekwàrà nkọwa ihe aha echichi ọdịnala ọbụla o nwere pụtàrà, ma rụ̀tụ́ aka n'ihe o mere e jiri nye ya echichi ahụ, ọbụna dịka o kwere nkwa ịga n'ihu na-arụ ezi ọrụ ma na-atụnyekwa ụtụ pụrụ iche na mmepe obodo nà nkwàlite ọdịmma ụmụ mmadụ, site n'inyeaka Chineke.

N'ihe gbasara nhọpụta ọchịchị a ga-eme n'ala Nigeria n'afọ na-abịa abịa, Chiifu Umeh kwùrù n'ezie nà ọnọdụ amaghịzị kwụrụ n'ala Nigeria taa n'ihi nsogbu na ihe iche aka mgba dị icheiche jupụtàrà na ngalaba niile taa, nke gụnyere ajọ ọnọdụ nchekwa, ajọ ọnọdụ akụnụba, enweghị ezi ọnọdụ mmepe na ezi ọnọdụ obibindụ, tinyéré ngharipụ nke ndị nọ n'isi ọchịchị gharị̀pụ̀goro ụmụafọ Nigeria kemgbe ọtụtụ afọ n'ihe gbasara imezupute nkwà dị icheiche ha kwere mgbe ha na-achụ nta nkwàdó ọchịchị.

O kwuru na ọ bụ ihe ndị a niile mere ọtụtụ ụmụafọ Nigeria ji esonyesizi ike ugbua ma na-etinyekwa uchu nke ukwuu n'ihe gbasara nhọpụta ahụ a ga-eme; ọbụna dịka ọ dụrụ ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ịhazi nhọpụta ọchịchị n'ala Nigeria bụ ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission (INEC)’ ọdụ ka ha kpachapụ anya, kwádó nke ọma, ma hie asaa n'anya banyere nchịkọba nhọpụta ọchịchị izugbe afọ 2023, ma hazie ya n'ụzọ ghe anya oghe, maka ihe mmadụ atụbaghị anya ya ime.

Ọ gbarụ̀rụ̀ ihu banyere otu e si akpachapụ̀ ndị Igbo na ndị otu Kraịst n'ihe dị icheiche a na-eme n'ala Nigeria kemgbe ọtụtụ afọ, bụkwa nke o kwuru na ụfọdụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị gosipụtakwàrà ọzọ n'ịhọpụta ndị ga-eji aha otu ndọrọndọrọ ha wee zọọ ọkwa Onyeisiala maọbụ Osote Onyeisiala n'afọ 2023. Ọ gara n'ihu kwuo hoohaa na ọ bụ onye Igbo na onye otu Kraịst kwesiri ịbanye n'ọkwa ọchịchị ala Nigeria n'afọ na-abịa abịa, n'usoro nwa mmụọ emegbula nwa mmadụ, ma nwa mmadụ emegbula nwa mmụọ; maka na ọ na-abụ e mee nwata ka e mere ibe ya, obi adị ya mma.

Banyere nsogbu iju mmiri na-enye na Steeti Anambra nà mkpamkpa ọ na-akpa n'ebe dị icheiche ugbua, Chiifu Umeh kwùrù na ya bụ ajọ ọdachi bụ ọnọdụ dị ka chi siri kee ya (natural disaster), ma kwupụta obiebere ya nyégárá ndị ajọ ọdachi ahụ metụtagoro n'ụzọ dị icheiche, ọbụna dịka o tòrò gọọmenti maka mbọ dị icheiche ha gbagọrọ iji gbatara ndị ahụ ọsọ enyemaka; ma rịọ ka e welitekwuo aka na mbọ a na-agba. Ọ kpọkukwàzị̀rị̀ òtù mbà ụwa dị icheiche ka ha so nye aka, maka na ya bụ ajọ ọdachi bụ ihe ka nte bakwutere nte n'ọnụ.

Chiifu Umeh jikwazị̀ òhère ahụ wee too aka na-achị steeti ahụ bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo maka usoro ọchịchị ya, ọrụ okporoụzọ ọ malitegoro ná mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, nà ihe ndị ọzọ dị icheiche o mepụtagoro n'ime ọnwa olenole o jiri banye n'ọkwa. Ọ dụ̀kwara ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha ghọta na ọchịchị bụ ihe e ji akọnuche eme ma bụrụkwa ihe chọrọ nkwàdó nà ntụnye ọhaneze iji gaa nke ọma, maka na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja. N'ihi nke ahụ, ọ dụrụ ha ọdụ ka ha gaa n'ihu inye ọchịchị Soludo nkwàdó zuru okè na steeti ahụ, iji mee nke ọma.

O kwupụtàkwàzị̀rị̀ olileanya o nwere nà ọnọdụ ga-akawanye mma n'ọdịnihu karịa ka ọ dị ugbua, ma na steeti Anambra, ma n'ala Nigeria n'izugbe.