Ụlọọrụ ‘International Breweries’ Ekesaarala Ndị Iju Mmiri Chụpụ̀rụ̀ Ihe Nkwàdó

Ụlọọrụ ‘International Breweries’ Ekesaarala Ndị Iju Mmiri Chụpụ̀rụ̀ Ihe Nkwàdó

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụlọọrụ a mà ama na-emepụ̀ta mmanya, bụ ụlọọrụ ‘International Breweries Plc ekesaarala ndị ahụ iju mmiri chụpụ̀rụ̀ n'ụlọ ha ihe nkwàdó nà ihe oriri dị icheiche na mpaghara okpuruọchịchị Ogbaru dị na steeti Anambra.

Ihe nkwàdó ahụ bụ nke gburu ego karịrị ego ruru nde naịra ise, ma bụrụkwa nke e kesaara ndị ahụ n'ogige ebe ha nọgodi ugbua eze mmiri.

Ya bụ ihe nkwàdó bụkwàzị̀ nke Onyeisioche Nchereoge n'okpuruọchịchị ahụ, bụ Maazị Pascal Aniegbuna, na onye na-ahụ maka ọnọdụ mberede n'ime okpuruọchịchị ime obodo ahụ bụ Maazị Ben Nwasike nabatara n'aha ndị ahụ iju mmiri ahụ metụtara n'otu ogige ebe e nwere mmadụ karịrị narị abuọ n'ọnụọgụgụ.

N'okwu ya oge ọ na-ebunye ndị ahụ ihe nkwàdó ahụ, onye ji ọkwa dịka ‘Plant Manager’ n'ụlọọrụ ahụ na ngalaba Onitsha, Maazị Fidelis Igwe kwùrù na nke ahụ bụ otu n'ime ụzọ ha si enye aka n'ibelatara ndị ahụ mmetụta nke ajọ ọdachi iju mmiri ahụ.

Ọ gàkwàrà n'ihu kọwaa na ihe ahụ sòkwà n'otu ụzọ ha si akwụghàchi ndị mpaghara ebe ahụ n'ihi na ọ bụ ebe ahụ ka ha nọ azụ ahịa ha kemgbe ọtụtụ afọ, ọbụna dịka o kwèrè nkwà na ha ga-ahụ na e kesàrà ihe ahụ ka o zuo ọnụ.

N'okwu ya oge ọ na-anabata ihe ndị ahụ, Onyeisioche okpuruọchịchị ahụ, Maazị Aniegbuna kèlèrè ndị ụlọọrụ ahụ maka ọrụ obiebere ha ahụ, ma kpee ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji.

Ọ chètààrà ndị ahụ iju mmiri metụtara na ihe gbasara ha na-emetụ gọọmenti n'obi, bụkwazị nke mere o ji agbasi mbọ ike ma na-emekwa ihe ọbụla kwere ya, iji belatara ha mmetụta nke ajọ ọdachi ahụ. Ọ kasiri ndị ahụ obi ka ha nwee ndidi, wee ruo mgbe ya bụ ajọ ọdachi iju mmiri belatara, ọbụna dịka o kwèrè ha nkwà na gọọmenti ga na-enye ha nkwàdó oge niile ma na-abịakwa nà mgbe na mgbe na-eleta ha, iji mara ka ọnọdụ siri dịrị ha.

Ya bụ Onyeisioche gaghàrị̀kwàrà na mpaghara ebe ahụ, iji hụ ka iju mmiri ahụ siri mebidobe ihe, ma kwe nkwà iweghàchìrì gọọmenti ozi banyere ọnọdụ ha.