Ụlọikpe atụọla nwaanyị mkpọrọ màkà ịwụ nwunye di ya mmiri ọkụ

Feb 7, 2023 - 13:55
Feb 7, 2023 - 15:35
 0
Ụlọikpe atụọla nwaanyị mkpọrọ màkà ịwụ nwunye di ya mmiri ọkụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu ụlọikpe Majie dị n'Ilorin bụ isi obodo steeti Kwara akpụgharịala otu nwaanyị gbara afọ iri anọ na abụọ ma tụọ ya mkpọrọ maka ịwụ nwunye di ya mmiri ọkụ.

Ya bụ nwaanyị, bụ Oriakụ Lola Abdulsalam nọrọ na nsonso a wee wụọ Oriakụ Bilikisu Abdulsalam mmiri ọkụ, bụ nke wochasịrị ya ahụ ma bokwa ya àpà n'ụdị dị icheiche.

Ọ bụ ndị uweojii nwụchikọrọ nwaanyị ahụ, wee kpụpụ ya ụlọikpe maka na ime ihe megidere mpaghara 247 na 292 nke amụma iwu a kpọrọ penaa koodu (penal code). Ndị uweojii ahụ ahụ kwuru na nwaanyị ahụ kpàrị̀rị̀ Oriakụ Bilikisu, merụọ ya ahụ ma mee ya ihe akaje dị icheiche mgbe ọ chọrọ isi n'ụzọ azụ ụlọ kpapụ oke nwụrụ anwụ.

Ha kwùrù na o buru ụzọ malite ịkụ nwunye di ya ahụ isi azịza, ma na-akpọkwa ya amosu. Ha sị na oge ọ na-abara nwunye di ya ahụ mba, na o jikwara gbabaa n'ụsọekwu ya, bute mmiri ọkụ sụrụ asụ, wee bịa wụọ ya nwunye di ya n'ahụ, nke wochasịrị ya ihu, ara, azụ, aka, nà akụkụ ahụ ya ndị ọzọ.

Nke a mezịrị ka ndị agbataobi na ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ nọ na gburugburu ebe ahụ nye aka buru ya bụ nwaanyị gaba ụlọọgwụ ozigbo ‘Cottage Hospital, Olorunshogo’ dị n'Ilorin ahụ maka inye ya ọgwụgwọ na nlekọta kwesiri ekwesi.

Na nkabi ikpe ya oge ọ nụchara mkpesa site n'aka òtù abụọ ahụ, onye Majie nọ n'isi ikpe ahụ, bụ Majie Ibrahim Dasuki kwùrù ka a tụnyegodi nwaanyị ahụ n'ụlọ mkpọrọ dị n'Oke-Kura, ka ọ ka nọrọgodi ebe ahụ na-anara ikuku, wee ruo mgbe ọzọ a ga-eleba okwu ahụ anya.

O bụgharịzịkwara ikpe ahụ ka ọ dịzie n'abalị isii nke ọnwa Maachị afọ a.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484